< Ilu 23 >

1 Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
When you sit down to dine with a ruler, consider carefully what is set before you,
2 tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
and put a knife to your throat if you possess a great appetite.
3 Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
Do not crave his delicacies, for that food is deceptive.
4 Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
Do not wear yourself out to get rich; be wise enough to restrain yourself.
5 Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
When you glance at wealth, it disappears, for it makes wings for itself and flies like an eagle to the sky.
6 Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
Do not eat the bread of a stingy man, and do not crave his delicacies;
7 Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
for he is keeping track, inwardly counting the cost. “Eat and drink,” he says to you, but his heart is not with you.
8 Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
You will vomit up what little you have eaten and waste your pleasant words.
9 Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
Do not speak to a fool, for he will despise the wisdom of your words.
10 Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
Do not move an ancient boundary stone or encroach on the fields of the fatherless,
11 nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
for their Redeemer is strong; He will take up their case against you.
12 Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
Apply your heart to instruction and your ears to words of knowledge.
13 Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
Do not withhold discipline from a child; although you strike him with a rod, he will not die.
14 Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
Strike him with a rod, and you will deliver his soul from Sheol. (Sheol h7585)
15 Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
My son, if your heart is wise, my own heart will indeed rejoice.
16 Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
My inmost being will rejoice when your lips speak what is right.
17 Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
Do not let your heart envy sinners, but always continue in the fear of the LORD.
18 nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
For surely there is a future, and your hope will not be cut off.
19 Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
Listen, my son, and be wise, and guide your heart on the right course.
20 Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
Do not join those who drink too much wine or gorge themselves on meat.
21 nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
For the drunkard and the glutton will come to poverty, and drowsiness will clothe them in rags.
22 Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
Listen to your father who gave you life, and do not despise your mother when she is old.
23 Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
Invest in truth and never sell it— in wisdom and instruction and understanding.
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
The father of a righteous man will greatly rejoice, and he who fathers a wise son will delight in him.
25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
May your father and mother be glad, and may she who gave you birth rejoice!
26 Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
My son, give me your heart, and let your eyes delight in my ways.
27 Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
For a prostitute is a deep pit, and an adulteress is a narrow well.
28 Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
Like a robber she lies in wait and multiplies the faithless among men.
29 Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
Who has woe? Who has sorrow? Who has contentions? Who has complaints? Who has needless wounds? Who has bloodshot eyes?
30 Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
Those who linger over wine, who go to taste mixed drinks.
31 Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
Do not gaze at wine while it is red, when it sparkles in the cup and goes down smoothly.
32 Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
In the end it bites like a snake and stings like a viper.
33 Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
Your eyes will see strange things, and your mind will utter perversities.
34 Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
You will be like one sleeping on the high seas or lying on the top of a mast:
35 Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
“They struck me, but I feel no pain! They beat me, but I did not know it! When can I wake up to search for another drink?”

< Ilu 23 >