< Ilu 23 >

1 Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
Ngati ukhala pansi kuti udye pamodzi ndi wolamulira, uyangʼane bwino zimene zili pamaso pako,
2 tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
ngati ndiwe munthu wadyera udziletse kuti usaonetse dyera lakolo.
3 Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
Usasirire zakudya zake, pakuti zimenezo ndi zakudya zachinyengo.
4 Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
Usadzitopetse wekha ndi kufuna chuma, ukhale ndi nzeru ya kudziretsa.
5 Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
Ukangoti wachipeza chumacho uwona posachedwa kuti palibepo. Chumacho chimachita ngati chamera mapiko mwadzidzidzi ndi kuwuluka kunka kumwamba ngati chiwombankhanga.
6 Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
Usadye chakudya cha munthu waumbombo, usalakalake zakudya zake zokoma;
7 Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
paja iye ndi munthu amene nthawi zonse amaganizira za mtengo wake ngakhale amati kwa iwe, “Idya ndi kumwa,” koma sakondweretsedwa nawe.
8 Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
Udzasanza zimene wadyazo ndipo mawu ako woyamikira adzapita pachabe.
9 Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
Usayankhule munthu wopusa akumva, pakuti adzanyoza mawu ako anzeru.
10 Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
Usasunthe mwala wa mʼmalire akalekale kapena kulowerera mʼminda ya ana amasiye,
11 nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
paja Mpulumutsi wawo ndi wamphamvu; iye adzawateteza pa milandu yawo kutsutsana nawe.
12 Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
Mtima wako uzikhala pa malangizo ndipo makutu ako azimvetsera mawu a chidziwitso.
13 Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
Usaleke kumulangiza mwana; ngati umulanga ndi chikwapu sadzafa.
14 Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
Ukamukwapula ndi tsatsa udzapulumutsa moyo wake. (Sheol h7585)
15 Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
Mwana wanga, ngati mtima wako ukhala wanzeru, inenso mtima wanga udzakondwera.
16 Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
Mtima wanga udzakondwera pamene ndidzakumva ukuyankhula zolungama.
17 Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
Mtima wako usachite nsanje ndi anthu ochimwa, koma uziopa Yehova tsiku ndi tsiku.
18 nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
Ndithu za mʼtsogolo zilipo ndipo chiyembekezo chakocho sichidzalephereka.
19 Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
Tamvera mwana wanga, ndipo ukhale wanzeru, mtima wako uwuyendetse mʼnjira yabwino.
20 Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
Usakhale pakati pa anthu amene amaledzera kapena pakati pa anthu amene amadya nyama mwadyera.
21 nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
Paja anthu oledzera ndi adyera amadzakhala amphawi ndipo aulesi adzavala sanza.
22 Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
Mvera abambo ako amene anakubala, usanyoze amayi ako pamene akalamba.
23 Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
Gula choonadi ndipo usachigulitse; ugulenso nzeru, mwambo ndiponso kumvetsa zinthu bwino.
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
Abambo a munthu wolungama ali ndi chimwemwe chachikulu; Wobala mwana wanzeru adzakondwera naye.
25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
Abambo ndi amayi ako asangalale; amene anakubereka akondwere!
26 Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
Mwana wanga, undikhulupirire ndipo maso ako apenyetsetse njira zanga.
27 Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
Paja mkazi wachiwerewere ali ngati dzenje lozama; ndipo mkazi woyendayenda ali ngati chitsime chopapatiza.
28 Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
Amabisala ngati mbala yachifwamba, ndipo amuna amakhala osakhulupirika chifukwa cha iyeyu.
29 Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
Ndani ali ndi tsoka? Ndani ali ndi chisoni? Ndani ali pa mkangano? Ndani ali ndi madandawulo? Ndani ali ndi zipsera zosadziwika uko zachokera? Ndani ali ndi maso ofiira?
30 Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
Ndi amene amakhalitsa pa mowa, amene amapita nalawa vinyo osakanizidwa.
31 Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
Usatengeke mtima ndi kufiira kwa vinyo, pamene akuwira mʼchikho pamene akumweka bwino!
32 Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
Potsiriza pake amaluma ngati njoka, ndipo amajompha ngati mphiri.
33 Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
Maso ako adzaona zinthu zachilendo ndipo maganizo ndi mawu ako adzakhala osokonekera.
34 Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
Udzakhala ngati munthu amene ali gone pakati pa nyanja, kapena ngati munthu wogona pa msonga ya mlongoti ya ngalawa.
35 Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
Iwe udzanena kuti, “Anandimenya, koma sindinapwetekedwe! Andimenya koma sindinamve kanthu! Kodi ndidzuka nthawi yanji? Ndiye ndifunefunenso vinyo wina.”

< Ilu 23 >