< Ilu 22 >
1 Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
A good name is more desirable than great riches; favor is better than silver and gold.
2 Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.
The rich and the poor have this in common: The LORD is Maker of them all.
3 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
The prudent see danger and take cover, but the simple keep going and suffer the consequences.
4 Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
The rewards of humility and the fear of the LORD are wealth and honor and life.
5 Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
Thorns and snares lie on the path of the perverse; he who guards his soul stays far from them.
6 Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Train up a child in the way he should go, and when he is old he will not depart from it.
7 Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
The rich rule over the poor, and the borrower is slave to the lender.
8 Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
He who sows injustice will reap disaster, and the rod of his fury will be destroyed.
9 Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
A generous man will be blessed, for he shares his bread with the poor.
10 Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
Drive out the mocker, and conflict will depart; even quarreling and insults will cease.
11 Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
He who loves a pure heart and gracious lips will have the king for a friend.
12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
The LORD’s eyes keep watch over knowledge, but He frustrates the words of the faithless.
13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
The slacker says, “There is a lion outside! I will be slain in the streets!”
14 Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
The mouth of an adulteress is a deep pit; he who is under the wrath of the LORD will fall into it.
15 Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
Foolishness is bound up in the heart of a child, but the rod of discipline drives it far from him.
16 Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
Oppressing the poor to enrich oneself or giving gifts to the rich will surely lead to poverty.
17 Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
Incline your ear and hear the words of the wise— apply your mind to my knowledge—
18 Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
for it is pleasing when you keep them within you and they are constantly on your lips.
19 Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
So that your trust may be in the LORD, I instruct you today—yes, you.
20 Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
Have I not written for you thirty sayings about counsel and knowledge,
21 Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
to show you true and reliable words, that you may soundly answer those who sent you?
22 Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
Do not rob a poor man because he is poor, and do not crush the afflicted at the gate,
23 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
for the LORD will take up their case and will plunder those who rob them.
24 Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
Do not make friends with an angry man, and do not associate with a hot-tempered man,
25 ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
or you may learn his ways and entangle yourself in a snare.
26 Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
Do not be one who gives pledges, who puts up security for debts.
27 Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
If you have nothing with which to pay, why should your bed be taken from under you?
28 Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
Do not move an ancient boundary stone which your fathers have placed.
29 Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.
Do you see a man skilled in his work? He will be stationed in the presence of kings; he will not stand before obscure men.