< Ilu 2 >

1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
Mwana na ngai, soki ondimi maloba na ngai mpe obateli kati na motema na yo mibeko na ngai;
2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
soki opesi litoyi na yo na maloba ya bwanya mpe okabi motema na yo na makambo ya mayele;
3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
soki obeleli mayele mpe ogangi epai ya bososoli;
4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
soki oluki yango penza ndenge balukaka palata to bomengo oyo ebombama,
5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
okososola solo soki kotosa Yawe elakisi nini mpe okozwa boyebi ya Nzambe.
6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
Pamba te Yawe nde apesaka bwanya, mpe maloba ya monoko na Ye epesaka mayele mpe bososoli.
7 Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
Abongiselaka bato ya sembo elonga mpe azali nguba ya bato oyo batambolaka na bosembo.
8 Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
Pamba te abatelaka bayengebene mpe nzela ya bato oyo batosaka Ye.
9 Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
Boye, okososola likambo nini ezali solo, alima, sembo: nzela nyonso oyo ememaka na bolamu.
10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
Pamba te bwanya ekokota kati na motema na yo mpe boyebi ekosepelisa molimo na yo.
11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
Bososoli ekobatela yo, mpe mayele ekobomba yo
12 Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
mpo na kobikisa yo na nzela mabe, na moto oyo alobaka makambo ezanga tina,
13 ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
na bato oyo batikaka nzela ya sembo mpo na kolanda nzela ya molili,
14 ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
na bato oyo basepelaka kosala mabe, na bato oyo bazalaka na esengo ya kokota na bozindo ya mabe,
15 Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
na bato oyo nzela na bango etengama-tengama mpe etamboli na bango etonda na mobulu.
16 Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
Bwanya ekobikisa yo lisusu liboso ya mwasi mopaya, liboso ya mwasi oyo atonda na maloba ya sukali,
17 Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
oyo akima mobali na ye ya bolenge mpe abosana boyokani oyo asalaki elongo na Nzambe na ye;
18 Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. (questioned)
pamba te ndako na ye ememaka na kufa, mpe nzela na ye ememaka na mboka ya bakufi.
19 Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
Moto moko te oyo akotaka epai na ye azongaka mpe amonaka lisusu nzela ya bomoi.
20 Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
Boye, okotambola na nzela ya bato malamu mpe okolanda nzela ya bato ya sembo.
21 nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
Pamba te bato ya sembo bakovanda na mokili, mpe bato oyo bazangi pamela bakotikala kati na yango;
22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
kasi bato mabe bakokufa na mokili mpe bakolongola bango kati na mokili ya bato ya songisongi.

< Ilu 2 >