< Ilu 2 >

1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
내 아들아 네가 만일 나의 말을 받으며 나의 계명을 네게 간직하며
2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
네 귀를 지혜에 기울이며 네 마음을 명철에 두며
3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
지식을 불러 구하며 명철을 얻으려고 소리를 높이며
4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
은을 구하는 것 같이 그것을 구하며 감추인 보배를 찾는 것 같이 그것을 찾으면
5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
여호와 경외하기를 깨달으며 하나님을 알게 되리니
6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
대저 여호와는 지혜를 주시며 지식과 명철을 그 입에서 내심이며
7 Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
그는 정직한 자를 위하여 완전한 지혜를 예비하시며 행실이 온전한 자에게 방패가 되시나니
8 Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
대저 그는 공평의 길을 보호하시며 그 성도들의 길을 보전하려 하심이니라
9 Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
그런즉 네가 공의와 공평과 정직 곧 모든 선한 길을 깨달을 것이라
10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
곧 지혜가 네 마음에 들어가며 지식이 네 영혼에 즐겁게 될 것이요
11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
근신이 너를 지키며 명철이 너를 보호하여
12 Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
악한 자의 길과 패역을 말하는 자에게서 건져내리라
13 ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
이 무리는 정직한 길을 떠나 어두운 길로 행하며
14 ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
행악하기를 기뻐하며 악인의 패역을 즐거워하나니
15 Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
그 길은 구부러지고 그 행위는 패역하리라
16 Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
지혜가 또 너를 음녀에게서, 말로 호리는 이방 계집에게서 구원하리니
17 Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
그는 소시의 짝을 버리며 그 하나님의 언약을 잊어버린 자라
18 Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. (questioned)
그 집은 사망으로, 그 길은 음부로 기울어졌나니
19 Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
누구든지 그에게로 가는 자는 돌아오지 못하며 또 생명길을 얻지 못하느니라
20 Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
지혜가 너로 선한 자의 길로 행하게 하며 또 의인의 길을 지키게 하리니
21 nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
대저 정직한 자는 땅에 거하며 완전한 자는 땅에 남아 있으리라
22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
그러나 악인은 땅에서 끊어지겠고 궤휼한 자는 땅에서 뽑히리라

< Ilu 2 >