< Ilu 19 >
1 Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
Better a poor man who walks with integrity than a fool whose lips are perverse.
2 Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
Even zeal is no good without knowledge, and he who hurries his footsteps misses the mark.
3 Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
A man’s own folly subverts his way, yet his heart rages against the LORD.
4 Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
Wealth attracts many friends, but a poor man is deserted by his friend.
5 Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
A false witness will not go unpunished, and one who utters lies will not escape.
6 Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
Many seek the favor of the prince, and everyone is a friend of the gift giver.
7 Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
All the brothers of a poor man hate him— how much more do his friends avoid him! He may pursue them with pleading, but they are nowhere to be found.
8 Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
He who acquires wisdom loves himself; one who safeguards understanding will find success.
9 Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
A false witness will not go unpunished, and one who pours out lies will perish.
10 Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
Luxury is unseemly for a fool— how much worse for a slave to rule over princes!
11 Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
A man’s insight gives him patience, and his virtue is to overlook an offense.
12 Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
A king’s rage is like the roar of a lion, but his favor is like dew on the grass.
13 Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
A foolish son is his father’s ruin, and a quarrelsome wife is like a constant dripping.
14 Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
Houses and wealth are inherited from fathers, but a prudent wife is from the LORD.
15 Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
Laziness brings on deep sleep, and an idle soul will suffer hunger.
16 Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
He who keeps a commandment preserves his soul, but he who is careless in his ways will die.
17 Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Kindness to the poor is a loan to the LORD, and He will repay the lender.
18 Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
Discipline your son, for in that there is hope; do not be party to his death.
19 Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
A man of great anger must pay the penalty; if you rescue him, you will have to do so again.
20 Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
Listen to counsel and accept discipline, that you may be wise the rest of your days.
21 Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
Many plans are in a man’s heart, but the purpose of the LORD will prevail.
22 Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
The desire of a man is loving devotion; better to be poor than a liar.
23 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
The fear of the LORD leads to life, that one may rest content, without visitation from harm.
24 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
The slacker buries his hand in the dish; he will not even bring it back to his mouth.
25 Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
Strike a mocker, and the simple will beware; rebuke the discerning man, and he will gain knowledge.
26 Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
He who assaults his father or evicts his mother is a son who brings shame and disgrace.
27 Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
If you cease to hear instruction, my son, you will stray from the words of knowledge.
28 Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
A corrupt witness mocks justice, and a wicked mouth swallows iniquity.
29 Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.
Judgments are prepared for mockers, and beatings for the backs of fools.