< Ilu 17 >

1 Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
Better a dry morsel in quietness than a house full of feasting with strife.
2 Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
A wise servant will rule over a disgraceful son and share his inheritance as one of the brothers.
3 Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
A crucible for silver and a furnace for gold, but the LORD is the tester of hearts.
4 Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
A wicked man listens to evil lips; a liar gives ear to a destructive tongue.
5 Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
He who mocks the poor insults their Maker; whoever gloats over calamity will not go unpunished.
6 Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Grandchildren are the crown of the aged, and the glory of a son is his father.
7 Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
Eloquent words are unfit for a fool; how much worse are lying lips to a ruler!
8 Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
A bribe is a charm to its giver; wherever he turns, he succeeds.
9 Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
Whoever conceals an offense promotes love, but he who brings it up separates friends.
10 Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
A rebuke cuts into a man of discernment deeper than a hundred lashes cut into a fool.
11 Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.
An evil man seeks only rebellion; a cruel messenger will be sent against him.
12 Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
It is better to meet a bear robbed of her cubs than a fool in his folly.
13 Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
If anyone returns evil for good, evil will never leave his house.
14 Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
To start a quarrel is to release a flood; so abandon the dispute before it breaks out.
15 Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
Acquitting the guilty and condemning the righteous— both are detestable to the LORD.
16 Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
Why should the fool have money in his hand with no intention of buying wisdom?
17 Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
A friend loves at all times, and a brother is born for adversity.
18 Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
A man lacking judgment strikes hands in pledge and puts up security for his neighbor.
19 Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
He who loves transgression loves strife; he who builds his gate high invites destruction.
20 Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
The one with a perverse heart finds no good, and he whose tongue is deceitful falls into trouble.
21 Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
A man fathers a fool to his own grief; the father of a fool has no joy.
22 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
A joyful heart is good medicine, but a broken spirit dries up the bones.
23 Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
A wicked man takes a covert bribe to subvert the course of justice.
24 Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
Wisdom is the focus of the discerning, but the eyes of a fool wander to the ends of the earth.
25 Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
A foolish son brings grief to his father and bitterness to her who bore him.
26 Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
It is surely not good to punish the innocent or to flog a noble for his honesty.
27 Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
A man of knowledge restrains his words, and a man of understanding maintains a calm spirit.
28 A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
Even a fool is considered wise if he keeps silent, and discerning when he holds his tongue.

< Ilu 17 >