< Ilu 16 >
1 Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
Zolinga za mu mtima ndi za munthu, koma kwa Yehova ndiye kumachokera yankho.
2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
Zochita zonse za munthu zimaoneka zabwino pamaso pake, koma Yehova ndiye amasanthula zolinga zako.
3 Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
Pereka ntchito zako zonse mʼmanja mwa Yehova, ndipo zolinga zako zidzachitikadi.
4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
Yehova amachita zonse ndi cholinga chake, ngakhale anthu oyipa kuti aone tsiku latsoka.
5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
Munthu aliyense wodzikuza amamunyansa Yehova. Koma dziwani izi: Iwo sadzakhala osalangidwa.
6 Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
Chifukwa cha chikondi chosasinthika ndi kukhulupirika, munthu amakhululukidwa machimo ake; chifukwa cha kuopa Yehova munthu amapewa zoyipa.
7 Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
Pamene makhalidwe a munthu akondweretsa Yehova, ngakhale adani ake amakhala naye mwa mtendere.
8 Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
Kuli bwino kukhala ndi zinthu pangʼono zozipeza mwachilungamo, kusiyana ndi kukhala ndi zinthu zambiri zozipeza popanda chilungamo.
9 Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
Mtima wa munthu umalingalira zochita, koma Yehova ndiye amakhazikitsa njira zake.
10 Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
Mawu a mfumu ali ngati mawu ochokera kwa Mulungu; ndipo pakamwa pake sipalakwa poweruza mlandu.
11 Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
Miyeso ndi masikelo achilungamo zimachokera kwa Yehova; miyala yonse yoyesera ya mʼthumba anayipanga ndi Yehova.
12 Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
Kuchita zoyipa kumanyansa mafumu, pakuti chilungamo ndiye maziko a ufumu wake.
13 Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
Mawu owona amakondweretsa mfumu. Iyo imakonda munthu woyankhula choonadi.
14 Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
Ukali wa mfumu ndi mthenga wa imfa, koma munthu wanzeru amawupepesa ukaliwo.
15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
Kuwala kwa nkhope ya mfumu kumapatsa moyo; ndipo kukoma mtima kwake kuli ngati mitambo ya mvula nthawi ya chilimwe.
16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
Nʼkwabwino kwambiri kupeza nzeru kupambana golide. Kukhala womvetsa bwino zinthu nʼkwabwino kupambana ndi kukhala ndi siliva.
17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
Msewu wa munthu wowongoka mtima umapewa zoyipa; wopenyetsetsa kumene akupita amasunga moyo wake.
18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
Kunyada kumafikitsa ku chiwonongeko, ndipo munthu wodzikuza adzagwa.
19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
Nʼkwabwino kukhala ndi mtima wodzichepetsa pakati pa anthu oponderezedwa, kusiyana ndi kugawana zolanda ndi anthu onyada.
20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
Munthu womvera malangizo zinthu zimamuyendera bwino, ndipo wodala ndi amene amadalira Yehova.
21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
A mtima wanzeru amatchedwa ozindikira zinthu, ndipo mawu ake okoma amawonjezera nzeru.
22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
Kumvetsa zinthu ndi kasupe wa moyo kwa iwo amene ali nako, koma uchitsiru umabweretsa chilango kwa zitsiru.
23 Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
Mtima wanzeru umathandiza munthu kuyankhula mwa nzeru, ndipo mawu ake amawonjezera nzeru.
24 Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
Mawu okometsera ali ngati chisa cha njuchi, amakoma mu mtima ndipo amalimbitsa thupi.
25 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
Pali njira ina yooneka ngati yowongoka kwa munthu koma kumatsiriziro kwake ndi imfa.
26 Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
Njala ya munthu wantchito imamuthandiza kulimbikira; njalayo imamukakamiza kuchitapo kanthu.
27 Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
Munthu wopanda pake amakonzekera kuchita zoyipa ndipo mawu ake ali ngati moto wopsereza.
28 Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
Munthu woyipa mtima amayambitsa mikangano, ndipo miseche imalekanitsa anthu okondana kwambiri.
29 Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.
Munthu wandewu amakopa mnansi wake, ndipo amamuyendetsa njira imene si yabwino.
30 Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
Amene amatsinzinira maso ake amalingalira zinthu zokhota; amene amachita msunamo amakonzeka kuchita zoyipa.
31 Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
Imvi zili ngati chipewa chaufumu chaulemerero; munthu amazipeza akakhala moyo wolungama.
32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
Munthu wosapsa mtima msanga amaposa munthu wankhondo, munthu wowugwira mtima wake amaposa amene amalanda mzinda.
33 A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
Maere amaponyedwa pa mfunga, koma ndiye Yehova amene amalongosola zonse.