< Ilu 15 >
1 Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
A gentle answer turns away wrath, but a harsh word stirs up anger.
2 Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.
The tongue of the wise commends knowledge, but the mouth of the fool spouts folly.
3 Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.
The eyes of the LORD are in every place, observing the evil and the good.
4 Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
A soothing tongue is a tree of life, but a perverse tongue crushes the spirit.
5 Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
A fool rejects his father’s discipline, but whoever heeds correction is prudent.
6 Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.
The house of the righteous has great treasure, but the income of the wicked is trouble.
7 Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
The lips of the wise spread knowledge, but not so the hearts of fools.
8 Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.
The sacrifice of the wicked is detestable to the LORD, but the prayer of the upright is His delight.
9 Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.
The LORD detests the way of the wicked, but He loves those who pursue righteousness.
10 Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.
Discipline is harsh for him who leaves the path; he who hates correction will die.
11 Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? (Sheol )
Sheol and Abaddon lie open before the LORD— how much more the hearts of men! (Sheol )
12 Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.
A mocker does not love to be reproved, nor will he consult the wise.
13 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.
A joyful heart makes a cheerful countenance, but sorrow of the heart crushes the spirit.
14 Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.
A discerning heart seeks knowledge, but the mouth of a fool feeds on folly.
15 Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.
All the days of the oppressed are bad, but a cheerful heart has a continual feast.
16 Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
Better a little with the fear of the LORD than great treasure with turmoil.
17 Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
Better a dish of vegetables where there is love than a fattened ox with hatred.
18 Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.
A hot-tempered man stirs up strife, but he who is slow to anger calms dispute.
19 Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
The way of the slacker is like a hedge of thorns, but the path of the upright is a highway.
20 Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
A wise son brings joy to his father, but a foolish man despises his mother.
21 Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya, ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.
Folly is joy to one who lacks judgment, but a man of understanding walks a straight path.
22 Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala, ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.
Plans fail for lack of counsel, but with many advisers they succeed.
23 Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
A man takes joy in a fitting reply— and how good is a timely word!
24 Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. (Sheol )
The path of life leads upward for the wise, that he may avoid going down to Sheol. (Sheol )
25 Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako, ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.
The LORD tears down the house of the proud, but He protects the boundaries of the widow.
26 Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.
The LORD detests the thoughts of the wicked, but the words of the pure are pleasant to Him.
27 Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
He who is greedy for unjust gain brings trouble on his household, but he who hates bribes will live.
28 Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.
The heart of the righteous ponders how to answer, but the mouth of the wicked blurts out evil.
29 Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.
The LORD is far from the wicked, but He hears the prayer of the righteous.
30 Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ. Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.
The light of the eyes cheers the heart, and good news nourishes the bones.
31 Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ.
He who listens to life-giving reproof will dwell among the wise.
32 Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.
He who ignores discipline despises himself, but whoever heeds correction gains understanding.
33 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
The fear of the LORD is the instruction of wisdom, and humility comes before honor.