< Ilu 13 >

1 Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
A wise son hears his father's instruction, but a scoffer listens not to rebuke.
2 Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
A man shall eat good by the fruit of his mouth, but the soul of the treacherous, violence.
3 Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
He who guards his mouth keeps his life. He who opens wide his lips shall have destruction.
4 Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
The soul of the sluggard desires, and has nothing, but the soul of the diligent shall be made fat.
5 Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
A righteous man hates lying, but a wicked man is loathsome, and comes to shame.
6 Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
Righteousness guards him who is upright in the way, but wickedness overthrows the sinner.
7 Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
There is he who makes himself rich, yet has nothing, and he who makes himself poor, yet has great wealth.
8 Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
The ransom of a man's life is his riches, but the poor hears no threatening.
9 Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
The light of the righteous rejoices, but the lamp of the wicked shall be put out.
10 Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
Through pride a vain man causes contention, but wisdom is with the well-advised.
11 Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
Wealth gotten by vanity shall be diminished, but he who gathers by labor shall have increase.
12 Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
Hope deferred makes the heart sick, but when the desire comes, it is a tree of life.
13 Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
He who despises the word brings destruction on himself, but he who fears the commandment shall be rewarded.
14 Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
The law of a wise man is a fountain of life, to depart from the snares of death.
15 Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
Good understanding gives favor, but the way of the transgressor is hard.
16 Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
Every prudent man works with knowledge, but a fool flaunts folly.
17 Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
A wicked messenger falls into evil, but a faithful ambassador is health.
18 Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
Poverty and shame are to him who refuses correction, but he who regards reproof shall be honored.
19 Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
The desire accomplished is sweet to the soul, but it is an abomination to fools to depart from evil.
20 Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
Walk with wise men, and thou shall be wise. But the companion of fools shall smart for it.
21 Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
Evil pursues sinners, but the righteous shall be recompensed with good.
22 Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
A good man leaves an inheritance to his son's sons, and the wealth of the sinner is laid up for the righteous.
23 Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
Much food is in the tillage of the poor, but there is that is consumed because of injustice.
24 Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
He who spares his rod hates his son, but he who loves him chastens him promptly.
25 Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.
A righteous man eats to the satisfying of his soul, but the belly of the wicked shall want.

< Ilu 13 >