< Ilu 12 >

1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.
Yeyote apendaye kuadibishwa hupenda maarifa, bali yeye achukiaye kuonywa ni mpumbavu.
2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.
Mtu mwema hupata kibali kutoka kwa Bwana, bali Bwana humhukumu mwenye hila.
3 Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
Mtu hathibitiki kutokana na uovu, bali mwenye haki hataondolewa.
4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
Mke mwenye tabia nzuri ni taji ya mumewe, bali aaibishaye ni kama uozo katika mifupa ya mumewe.
5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
Mipango ya mtu mwadilifu ni ya haki, bali ushauri wa mwovu ni udanganyifu.
6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
Maneno ya waovu huotea kumwaga damu, bali maneno ya waadilifu huwaokoa.
7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
Watu waovu huondolewa na kutoweka, bali nyumba ya mwenye haki husimama imara.
8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.
Mtu husifiwa kulingana na hekima yake, bali watu wenye akili zilizopotoka hudharauliwa.
9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
Heri mtu wa hali ya chini mwenye mtumishi, kuliko kujifanya mtu wa hali ya juu nawe huna chakula.
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
Mtu mwenye haki hujali mahitaji ya mnyama wake, bali matendo ya huruma ya mwovu ni ukatili.
11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
Yeye alimaye shamba lake atakuwa na chakula tele, bali yeye afuataye mambo ya upuzi hana akili.
12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
Waovu hutamani mateka ya watu wabaya, bali shina la mwenye haki hustawi.
13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
Mtu mwovu hunaswa kwa mazungumzo yake ya dhambi, bali mwenye haki huepuka taabu.
14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
Kutokana na tunda la midomo yake mtu hujazwa na mambo mema, hakika kama ilivyo kazi ya mikono yake humtunza.
15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
Njia ya mpumbavu huonekana sawa machoni pake mwenyewe, bali mtu mwenye hekima husikiliza ushauri.
16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
Mpumbavu huonyesha kuudhika kwake mara moja, bali mtu wa busara hupuuza matukano.
17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
Shahidi wa kweli hutoa ushuhuda wa kuaminika, bali shahidi wa uongo husema uongo.
18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Maneno ya kipumbavu huchoma kama upanga, bali ulimi wa mwenye hekima huleta uponyaji.
19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
Midomo isemayo kweli hudumu milele, bali ulimi wa uongo hudumu kwa muda mfupi tu.
20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
Upo udanganyifu katika mioyo ya wale ambao hupanga mabaya, bali kuna furaha kwa wale wanaoleta amani.
21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
Hakuna dhara linalompata mwenye haki, bali waovu wana taabu nyingi.
22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
Bwana anachukia sana midomo idanganyayo, bali hufurahia watu ambao ni wa kweli.
23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
Mtu mwenye busara hujihifadhia maarifa yeye mwenyewe, bali moyo wa wapumbavu hububujika upumbavu.
24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
Mikono yenye bidii itatawala, bali uvivu huishia katika kazi za utumwa.
25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
Moyo wa wasiwasi humlemea mtu, bali neno la huruma humfurahisha.
26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
Mtu mwenye haki ni mwangalifu katika urafiki, bali njia ya waovu huwapotosha.
27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
Mtu mvivu haoki mawindo yake, bali mtu mwenye bidii ana mali za thamani.
28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
Katika njia ya haki kuna uzima; katika mapito hayo kuna maisha ya milele.

< Ilu 12 >