< Ilu 12 >
1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.
喜愛管教的,就是喜愛知識; 恨惡責備的,卻是畜類。
2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.
善人必蒙耶和華的恩惠; 設詭計的人,耶和華必定他的罪。
3 Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
人靠惡行不能堅立; 義人的根必不動搖。
4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
才德的婦人是丈夫的冠冕; 貽羞的婦人如同朽爛在她丈夫的骨中。
5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
義人的思念是公平; 惡人的計謀是詭詐。
6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
惡人的言論是埋伏流人的血; 正直人的口必拯救人。
7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
惡人傾覆,歸於無有; 義人的家必站得住。
8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.
人必按自己的智慧被稱讚; 心中乖謬的,必被藐視。
9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
被人輕賤,卻有僕人, 強如自尊,缺少食物。
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
義人顧惜他牲畜的命; 惡人的憐憫也是殘忍。
11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
耕種自己田地的,必得飽食; 追隨虛浮的,卻是無知。
12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
惡人想得壞人的網羅; 義人的根得以結實。
13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
惡人嘴中的過錯是自己的網羅; 但義人必脫離患難。
14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
人因口所結的果子,必飽得美福; 人手所做的,必為自己的報應。
15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
愚妄人所行的,在自己眼中看為正直; 惟智慧人肯聽人的勸教。
16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
愚妄人的惱怒立時顯露; 通達人能忍辱藏羞。
17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
說出真話的,顯明公義; 作假見證的,顯出詭詐。
18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
說話浮躁的,如刀刺人; 智慧人的舌頭卻為醫人的良藥。
19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
口吐真言,永遠堅立; 舌說謊話,只存片時。
20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
圖謀惡事的,心存詭詐; 勸人和睦的,便得喜樂。
21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
義人不遭災害;惡人滿受禍患。
22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
說謊言的嘴為耶和華所憎惡; 行事誠實的,為他所喜悅。
23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
通達人隱藏知識; 愚昧人的心彰顯愚昧。
24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
殷勤人的手必掌權; 懶惰的人必服苦。
25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
人心憂慮,屈而不伸; 一句良言,使心歡樂。
26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
義人引導他的鄰舍; 惡人的道叫人失迷。
27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
懶惰的人不烤打獵所得的; 殷勤的人卻得寶貴的財物。
28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
在公義的道上有生命; 其路之中並無死亡。