< Ilu 11 >
1 Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
statera dolosa abominatio apud Dominum et pondus aequum voluntas eius
2 Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
ubi fuerit superbia ibi erit et contumelia ubi autem humilitas ibi et sapientia
3 Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
simplicitas iustorum diriget eos et subplantatio perversorum vastabit illos
4 Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
non proderunt divitiae in die ultionis iustitia autem liberabit a morte
5 Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
iustitia simplicis diriget viam eius et in impietate sua corruet impius
6 Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
iustitia rectorum liberabit eos et in insidiis suis capientur iniqui
7 Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
mortuo homine impio nulla erit ultra spes et expectatio sollicitorum peribit
8 Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
iustus de angustia liberatus est et tradetur impius pro eo
9 Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
simulator ore decipit amicum suum iusti autem liberabuntur scientia
10 Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
in bonis iustorum exultabit civitas et in perditione impiorum erit laudatio
11 A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
benedictione iustorum exaltabitur civitas et ore impiorum subvertetur
12 Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
qui despicit amicum suum indigens corde est vir autem prudens tacebit
13 Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
qui ambulat fraudulenter revelat arcana qui autem fidelis est animi celat commissum
14 Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
ubi non est gubernator populus corruet salus autem ubi multa consilia
15 Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
adfligetur malo qui fidem facit pro extraneo qui autem cavet laqueos securus erit
16 Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
mulier gratiosa inveniet gloriam et robusti habebunt divitias
17 Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
benefacit animae suae vir misericors qui autem crudelis est et propinquos abicit
18 Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
impius facit opus instabile seminanti autem iustitiam merces fidelis
19 Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
clementia praeparat vitam et sectatio malorum mortem
20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
abominabile Domino pravum cor et voluntas eius in his qui simpliciter ambulant
21 Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
manus in manu non erit innocens malus semen autem iustorum salvabitur
22 Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
circulus aureus in naribus suis mulier pulchra et fatua
23 Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
desiderium iustorum omne bonum est praestolatio impiorum furor
24 Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
alii dividunt propria et ditiores fiunt alii rapiunt non sua et semper in egestate sunt
25 E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
anima quae benedicit inpinguabitur et qui inebriat ipse quoque inebriabitur
26 Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
qui abscondit frumenta maledicetur in populis benedictio autem super caput vendentium
27 Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
bene consurgit diluculo qui quaerit bona qui autem investigator malorum est opprimetur ab eis
28 Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
qui confidet in divitiis suis corruet iusti autem quasi virens folium germinabunt
29 Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
qui conturbat domum suam possidebit ventos et qui stultus est serviet sapienti
30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
fructus iusti lignum vitae et qui suscipit animas sapiens est
31 Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
si iustus in terra recipit quanto magis impius et peccator