< Ilu 10 >
1 Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
Àwọn òwe Solomoni. Ọlọ́gbọ́n ọmọ ń mú inú baba rẹ̀ dùn, ṣùgbọ́n aṣiwèrè ọmọ ń ba inú ìyá rẹ̀ jẹ́.
2 Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
Ìṣúra tí a kójọ nípa ìwà búburú kò ní èrè, ṣùgbọ́n òdodo a máa gbani lọ́wọ́ ikú.
3 Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
Olúwa kì í jẹ́ kí ebi máa pa olódodo, ṣùgbọ́n ó ba ète àwọn ènìyàn búburú jẹ́.
4 Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
Ọwọ́ tí ó lẹ máa ń sọ ènìyàn di tálákà, ṣùgbọ́n ọwọ́ tí ó múra ṣíṣẹ́ a máa sọ ni di ọlọ́rọ̀.
5 Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
Ẹni tí ó kó irúgbìn jọ ní àsìkò òjò jẹ́ ọlọ́gbọ́n ọmọ, ṣùgbọ́n ẹni tí ó sùn ní àsìkò ìkórè jẹ́ adójútini ọmọ.
6 Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
Ìbùkún ní ó máa ń kún orí olódodo, ṣùgbọ́n ìwà ipá máa ń kún ẹnu ènìyàn búburú.
7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
Ìrántí olódodo yóò jẹ́ ìbùkún, ṣùgbọ́n orúkọ ènìyàn búburú yóò jẹrà.
8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
Ẹni tí ó gbọ́n nínú ọkàn rẹ̀ máa ń gba àṣẹ, ṣùgbọ́n ètè wérewère yóò parun.
9 Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
Ẹni tí ó ń rìn déédé, ń rìn láìléwu, ṣùgbọ́n àṣírí ẹni tí ń rin ọ̀nà pálapàla yóò tú.
10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
Ẹni tí ń ṣẹ́jú pàkòpàkò fún ibi ń fa àìbalẹ̀ ọkàn, aláìgbọ́n tí ń ṣàròyé kiri yóò parun.
11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
Ẹnu olódodo jẹ́ orísun ìyè, ṣùgbọ́n ìwà ipá ni ó gba gbogbo ẹnu ènìyàn búburú.
12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
Ìríra a máa dá ìjà sílẹ̀, ṣùgbọ́n ìfẹ́ a máa bo gbogbo àṣìṣe mọ́lẹ̀.
13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
Ọgbọ́n ni a ń bá lẹ́nu àwọn olóye, ṣùgbọ́n kùmọ̀ wà fún ẹ̀yìn àwọn aláìlóye.
14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
Ọlọ́gbọ́n ènìyàn kó ìmọ̀ jọ, ṣùgbọ́n ẹnu aláìgbọ́n a máa ṣokùnfà ìparun.
15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
Ọrọ̀ àwọn olódodo ni ìlú olódi wọn, ṣùgbọ́n òsì ni ìparun aláìní.
16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
Èrè olódodo ń mú ìyè wá fún wọn, ṣùgbọ́n èrè ènìyàn búburú ń mú ìjìyà wá fún wọn.
17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
Ẹni tí ó gbọ́ ìbáwí fi ọ̀nà sí ìyè hàn, ṣùgbọ́n ẹni tí ó kọ ìbáwí mú àwọn mìíràn ṣìnà.
18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
Ẹni tí ó pa ìkórìíra rẹ̀ mọ́ jẹ́ òpùrọ́ ẹni tí ó sì ń ba ni jẹ́ jẹ́ aláìgbọ́n.
19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
Nínú ọ̀rọ̀ púpọ̀ a kò le fẹ́ ẹ̀ṣẹ̀ kù ṣùgbọ́n ẹni tí ó pa ẹnu rẹ̀ mọ́ jẹ́ ọlọ́gbọ́n.
20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
Ètè olódodo jẹ́ ààyò fàdákà, ṣùgbọ́n ọkàn ènìyàn búburú kò níye lórí.
21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
Ètè olódodo ń bọ́ ọ̀pọ̀lọpọ̀, ṣùgbọ́n aláìgbọ́n ń kú nítorí àìlóye.
22 Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
Ìbùkún Olúwa ń mú ọrọ̀ wá, kì í sì í fi ìdààmú sí i.
23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
Aláìgbọ́n a máa ní inú dídùn sí ìwà búburú, ṣùgbọ́n olóye ènìyàn a máa ní inú dídùn sí ọgbọ́n.
24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
Ohun tí ènìyàn búburú bẹ̀rù yóò dé bá a; olódodo yóò rí ohun tí ó fẹ́ gbà.
25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
Nígbà tí ìjì bá ti jà kọjá, ènìyàn búburú a kọjá lọ, ṣùgbọ́n olódodo yóò dúró ṣinṣin láéláé.
26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
Bí ọtí kíkan sí eyín, àti èéfín sí ojú, bẹ́ẹ̀ ni ọ̀lẹ sí ẹni tí ó rán an níṣẹ́.
27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
Ìbẹ̀rù Olúwa ń mú ọjọ́ ayé gígùn wá, ṣùgbọ́n a gé ọjọ́ ayé ènìyàn búburú kúrú.
28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
Ìrètí olódodo ni ayọ̀, ṣùgbọ́n ìrètí ènìyàn búburú jásí òfo.
29 Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
Ọ̀nà Olúwa jẹ́ ààbò fún olódodo, ṣùgbọ́n ìparun ni ó jẹ́ fún àwọn tí ń ṣe ibi.
30 A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
A kì yóò fa olódodo tu láéláé, ṣùgbọ́n ènìyàn búburú kì yóò dúró pẹ́ lórí ilẹ̀.
31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
Ẹnu olódodo ń mú ọgbọ́n jáde wá, ṣùgbọ́n ètè àyípadà ni a ó gé kúrò.
32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
Ètè olódodo mọ ohun ìtẹ́wọ́gbà, ṣùgbọ́n ètè ènìyàn búburú kò mọ̀ ju èké lọ.