< Ilu 10 >
1 Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
智慧的兒子使父親喜樂;愚昧的兒子,使母親憂愁。
2 Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
不義之財,毫無益處;惟有正義,救人脫免死亡。
3 Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
上主不忍義人受飢,卻使惡人大失所望。
4 Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
游手好閒,使人貧窮;勤奮工作,使人富有。
5 Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
夏季貯蓄的,是明智的孩童;秋收酣睡的是無恥的兒子。
6 Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
上主的祝福在義人頭上,災禍卻使惡人啞口無言。
7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
義人受人懷念祝福,惡人卻必身敗名裂。
8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
心靈智慧的人,必接受命令;饒舌的愚的人,必自招喪亡。
9 Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
走正路的,行路穩妥;走邪路的,終必敗露。
10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
暗中擠眼的人,必引人煩惱;坦然規勸的人,必促進和平。
11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
義人的口,是生命的泉源;惡人的口,是殘暴的淵藪。
12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
仇恨引起爭端,愛情遮掩一切過失。
13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
有見識的口唇上,可找著智慧;棍杖只是為打缺乏智慧者的脊背。
14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
智慧的人,隱諱自己的學問;愚昧人的口,招致逼近的喪亡。
15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
富人的財富,是他自己的堅城;窮人的零落,卻是他們的貧乏。
16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
義人的薪金,用以維持生活;惡人的收入,卻只用來犯罪。
17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
誰遵守勸告,必走向生命之路;誰輕視規勸,必自誤入迷途。
18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
撒謊的唇舌,必暗藏仇恨;散播謠言的,必是愚昧人。
19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
多言難免無過,明智的人必約束自己的唇舌。
20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
義人的舌,貴若純金;惡人的心,賤似草芥。
21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
義人的唇舌教育群眾,愚人必因缺乏心智而死亡。
22 Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
使人致富的,是上主的祝福;營營的辛勞,卻無補於事。
23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
愚昧人樂於作惡,明哲人樂於求智。
24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
惡人畏懼的,反向他侵襲;義人的希望,終獲得應允。
25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
暴風雨一過,惡人不復存在;義人卻根深蒂固。
26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
懶漢之於派遣他的人,就如醋之於牙,煙之於目。
27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
敬畏上主,將延年益壽;惡人的歲月,必要短縮。
28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
義人的期待,終歸是喜樂;惡人的希望,終歸是失望。
29 Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
上主的道路,是正人君子的保障;為作惡的人,卻是滅亡。
30 A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
義人永不會動搖,惡人決不會久留地上。
31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
義人的口,散播智慧;邪惡的舌,必被剷除。
32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
義人的唇,常吐雅言;惡人的口,只說邪惡。