< Ndị Filipai 4 >

1 Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.
ᎾᏍᎩ ᎢᏳᏍᏗ ᎢᏓᎵᏅᏟ ᎢᏨᎨᏳᎢ ᎠᎴ ᎤᏣᏘ ᎢᏨᏯᏅᏘ, ᏍᎩᏯᎵᎡᎵᏍᏗᏍᎩ ᎠᎴ ᎠᏆᎵᏍᏚᎶᏙᏗ, ᏅᏩᏍᏕᏍᏗ ᎤᎵᏂᎩᏛ ᏕᏥᏙᎨᏍᏗ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎡᏣᎵᏍᎦᏍᏙᏛᎢ, ᎢᏨᎨᏳᎢ.
2 Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.
ᏥᏍᏗᏰᏗᎭ ᏳᎣᏗᏯ, ᎠᎴ ᏥᏍᏗᏰᏗᎭ ᏏᏂᏗᎩ ᎾᏍᎩ ᎤᏠᏱᏉ ᎢᏧᏅᏁᏗᏱ ᏚᎾᏓᏅᏛ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᏓᏂᎧᎿᎭᏩᏗᏒᎢ.
3 E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.
ᎠᎴ ᎬᏍᏗᏰᏗᎭ ᎾᏍᏉ ᏂᎯ ᏂᏣᏠᎾᏍᏛᎾ ᎬᎩᎾᏖᏆᎶᎯ, ᎬᎩᏍᏕᎸᏗᏱ Ꮎ ᎠᏂᎨᏴ ᎬᎩᏍᏕᎸᎯᏙᎸᎯ ᏓᎩᎸᏫᏍᏓᏁᎸ ᎦᎵᏥᏙᏂᏙᎲ ᎣᏍᏛ ᎧᏃᎮᏛ, ᎯᏯᏠᏯᏍᏔᏅᎭ ᎾᏍᏉ ᏞᎻᎾ ᎠᎴ ᎠᏂᏐᎢ ᎤᏠᏱ ᏦᎩᎸᏫᏍᏓᏁᎯ, ᎾᏍᎩ ᏚᎾᏙᎥ ᏥᏕᎪᏪᎳ ᎬᏂᏛ ᎠᏓᏁᎯ ᎪᏪᎵᎯ.
4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
ᎢᏣᎵᎮᎵᎨᏍᏗ ᏂᎪᎯᎸ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᏅᏗᎦᎵᏍᏙᏗᏍᎨᏍᏗ; ᎢᏣᎵᎮᎵᎨᏍᏗ, ᎦᏗᎭ ᏔᎵᏁ.
5 Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
ᎢᏣᏓᏅᏘᏳ ᎨᏒ ᎾᏅᎢ ᏴᏫ ᎠᏂᎦᏔᎮᏍᏗ; ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎾᎥᏂᏳ ᏓᏯᎢ.
6 Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
ᏞᏍᏗ ᎪᎱᏍᏗ ᏱᏤᎵᎯᏍᎨᏍᏗ; ᏄᏓᎴᏒᏍᎩᏂ ᎪᎱᏍᏗ ᎠᏓᏙᎵᏍᏙᏗ ᎠᎴ ᎠᏔᏲᏍᏗ ᎨᏒ ᎬᏗ ᎠᎵᎮᎵᏍᏗ ᎬᏩᎵᏠᏯᏍᏗ, ᎬᏂᎨᏒ ᏁᏨᏁᎮᏍᏗ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᏄᏍᏛ ᎢᏣᏚᎵᏍᎬᎢ;
7 Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
ᏅᏩᏙᎯᏯᏛᏃ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎤᏓᏁᏗ ᎨᏒ, ᎾᏍᎩ ᏥᎦᎶᏒᏍᏗᎭ ᏂᎦᎥ ᎬᏓᏅᏖᏗ ᎨᏒᎢ, ᏧᏍᏆᏂᎪᏙᏗ ᎨᏎᏍᏗ ᏗᏥᎾᏫ ᎠᎴ ᏗᏣᏓᏅᏙ, ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᏂᎬᏂᏏᏍᎨᏍᏗ.
8 Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.
ᎤᎵᏍᏆᎸᏗᏃ ᎨᏒᎢ ᎢᏓᎵᏅᏟ, ᏂᎦᎥ ᎦᏰᎪᎩ ᏂᎨᏒᎾ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᎦᎸᏉᏙᏗ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᏚᏳᎪᏛ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᎦᏓᎭ ᏂᎨᏒᎾ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᎣᏏᏳ ᎬᏰᎸᏗ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᎣᏏᏳ ᎠᏂᏃᎮᏍᎨᏍᏗ; ᎢᏳᏃ ᎣᏏᏳ ᎢᏯᏛᏁᏗ ᏰᎭ, ᎢᏳᏃ ᎪᎱᏍᏗ ᎦᎸᏉᏙᏗ ᎨᏎᏍᏗ, ᎾᏍᎩ ᏕᏣᏓᏅᏖᏍᎨᏍᏗ.
9 Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
ᎾᏍᎩ ᎫᏓᎴᏅᏛ ᏍᎩᏯᏕᎶᏆᎡᎸᎯ ᎨᏒᎢ, ᎠᎴ ᏗᏍᎩᏯᏓᏂᎸᏤᎸᎯ ᎨᏒᎢ, ᎠᎴ ᏍᎩᏯᏛᎦᏁᎸᎯ ᎨᏒᎢ, ᎠᎴ ᏍᎩᎪᎡᎸᎯ ᎨᏒᎢ, ᏂᏣᏛᏁᎮᏍᏗ; ᎤᏁᎳᏅᎯᏃ ᏅᏩᏙᎯᏯᏛ ᎠᏓᏁᎯ ᏗᏥᎧᎿᎭᏩᏗᏓᏍᏗ ᎨᏎᏍᏗ.
10 Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.
ᎠᏎᏃ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎤᏣᏘ ᏥᏯᎵᎡᎵᏨᎩ, ᎾᏍᎩ ᎿᎭᏉ ᎤᏬᎯᏨᎯ ᏍᎩᏯᏅᏛ ᏔᎵᏁ ᎠᏤᎯᏲᎩ, ᎾᏍᎩ ᎾᎿᎭᎤᎬᏩᎵ ᎾᏍᏉ ᏍᎩᏯᏅᏛᎩ, ᎠᏎᏃ ᎥᏝ ᏱᏣᏜᏓᏅᏓᏕᎮᎢ.
11 Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.
ᎥᏝ ᎠᏗᎾ ᎠᎩᏂᎬᏎᎲ ᏥᏁᎢᏍᏗᏍᎬ ᏱᎩ, ᎠᏆᏕᎶᏆᎥᏰᏃ ᏂᎦᎥ ᎾᏆᎵᏍᏓᏁᎵᏕᎬ ᎣᏏᏳᏉ ᎠᎩᏰᎸᏗᏱ.
12 Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ.
ᏥᎦᏔᎭ ᎢᏯᏆᏛᏁᏗᏱ ᎡᎳᏗ ᏱᎾᏆᏛᎿᎭᏕᎦ, ᎠᎴ ᏥᎦᏔᎭ ᎢᏯᏆᏛᏁᏗᏱ ᎤᏣᏘ ᏯᎩᎭ; ᏂᎦᎥ ᏕᎨᏌᏗᏒᎢ, ᎠᎴ ᏂᎦᎥ ᎾᏆᎵᏍᏓᏁᎵᏕᎬᎢ, ᎥᏇᏲᏅ ᎢᏯᏆᏛᏁᏗᏱ ᎾᏍᏉ ᏯᏉᎳᏅ ᎠᎴ ᎾᏍᏉ ᏯᎩᏲᏏᎭ, ᎾᏍᏉ ᎤᏣᏘ ᏯᎩᎭ ᎠᎴ ᎾᏍᏉ ᏯᎩᏂᎬᏎᎭ
13 Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
ᏂᎦᎥᏉ ᎢᎬᏆᏛᏁᏗ ᎦᎶᏁᏛ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ ᎾᏍᎩ ᏣᏆᎵᏂᎪᎯᏍᏗᎭ.
14 Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya.
ᎠᏎᏍᎩᏂᏃᏅ ᎣᏏᏳ ᏂᏣᏛᏁᎸ ᏥᏍᎩᏁᎸ ᎠᏆᎵᏍᏕᎸᏙᏗ ᏥᎩᎵᏲᎬ ᎢᏳᎢ.
15 Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu.
ᎾᏍᎩᏃ ᏂᎯ ᏈᎵᎩᏱ ᎢᏤᎯ, ᎢᏥᎦᏔᎮᏍᏗ ᎾᏍᏉ, ᎾᏍᎩ ᎣᏍᏛ ᎧᏃᎮᏛ ᎢᎬᏱᏱ ᎢᏨᏯᎵᏥᏙᏁᎸ ᎾᎯᏳ ᎹᏏᏙᏂ ᎠᏆᏂᎩᏒ, ᎥᏝ ᎢᎸᎯᏢ ᎤᎾᏓᏡᎬ ᏧᎾᏁᎶᏗ ᎪᎱᏍᏗ ᏱᎬᏆᏛᏁᎴ ᎾᏍᎩ ᎠᏓᏁᏗ ᎠᎴ ᎥᏓᏘᏁᏗ ᎨᏒ ᎤᎬᏩᎵ, ᏂᎯ ᎢᏨᏒ.
16 Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.
ᏕᏏᎶᏂᎦᏰᏃ ᏫᎨᏙᎲ ᏌᏉ ᏂᏣᏓᏅᏒᎩ ᎠᎩᏂᎬᏎᎲ ᎠᏆᎵᏍᏕᎸᏙᏗ, ᎠᎴ ᎾᏍᏉ ᏔᎵᏁᎢ.
17 Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru.
ᎥᏝ ᎠᏗᎾ ᎠᏆᏚᎵᏍᎬ ᎠᏓᏁᏗ ᎨᏒ ᏱᏅᏗᎦᎵᏍᏙᏗᎭ; ᎤᏓᏔᏅᎯᏍᎩᏂ ᎠᏆᏚᎵᎭ ᎤᏣᏘ ᎢᏣᎵᏍᏕᎸᏙᏗ ᎢᏳᎵᏍᏙᏗᏱ.
18 Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.
ᎠᏎᏃ ᏂᎦᎥᏉ ᎠᎩᎭ ᎠᎴ ᎤᏣᏔᏅᎯ; ᎠᎩᎧᎵᏬᎯ, ᏗᏆᏓᏂᎸᏨᎯ ᎨᏒ ᎢᏆ’ᎶᏓᏓ ᎤᏲᎸᎯ ᎾᏍᎩ ᏅᏓᏣᏓᏅᏒᎯ, ᎤᏣᏘ ᎤᎦᎾᏍᏛ ᎦᏩᏒᎩ, ᎠᏥᎸ ᎨᎳᏍᏗ ᏗᎬᏓᏂᎸᎢᏍᏗ, ᎣᏏᏳ ᎤᏰᎸᏗ ᎤᏁᎳᏅᎯ.
19 Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
ᎠᏎᏃ ᎠᏆᏁᎳᏅᎯ ᎢᏥᏁᏗ ᎨᏎᏍᏗ ᏂᎦᎥ ᎢᏥᏂᎬᏎᎲᎢ, ᎾᏍᎩᏯ ᎤᏪᎿᎭᎢᏳ ᎠᎴ ᎦᎸᏉᏗᏳ ᎨᏒᎢ, ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ.
20 Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
ᎿᎭᏉᏃ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎠᎴ ᎢᎩᏙᏓ ᎦᎸᏉᏙᏗ ᎨᏎᏍᏗ ᏂᎪᎯᎸ ᎠᎴ ᏂᎪᎯᎸᎢ. ᎡᎺᏅ. (aiōn g165)
21 Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
ᏕᏥᏲᎵᎭ ᎾᏂᎥ ᎤᎾᏓᏅᏘ ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᎠᏃᎯᏳᎲᏍᎩ. ᎣᏣᎵᏅᏟ ᎠᏂ ᏦᏤᏙᎭ ᏫᎨᏥᏲᎵᎭ.
22 Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza.
ᎾᏂᎥ ᎤᎾᏓᏅᏘ ᏫᎨᏥᏲᎵᎭ, Ꮀ ᎤᎬᏫᏳᎭ ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏏᏌ ᏚᏓᏘᎾᎥᎢ.
23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
ᎬᏩᎦᏘᏯ ᎤᏓᏙᎵᏍᏗ ᎨᏒ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎢᎦᏤᎵ ᏥᏌ ᎦᎶᏁᏛ ᎤᏤᎵᎦ ᎢᏤᎳᏗᏙᎮᏍᏗ ᏂᏥᎥᎢ. ᎡᎺᏅ.

< Ndị Filipai 4 >