< Ndị Filipai 3 >

1 Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile.
На останок, браттє моє, радуйтесь у Господї. Те ж саме писати вам менї не противно, для вас же певно.
2 Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
Остерегайтесь собак, остерегайтесь лихих робітників, остерегайтесь відрізання.
3 Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
Ми бо обрізаннє, которі духом Богу служимо, і хвалимось в Ісусї Христї, а не в тїлї надіємось,
4 Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:
хоч і я маю також надїю в тїлї. Коли хто инший думає надіятись у тїлї, то я тим більш, -
5 e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii;
обрізаний восьмого дня, з роду Ізраїлевого, з колїна Веняминового, Євреїн з Євреїв, по закону Фарисей,
6 igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.
по ревности гонив я церкву, по праведности законній непорочен.
7 Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst.
Та що було менї надбаннєм, те вважав я за втрату ради Христа.
8 E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.
Так оце я все вважаю за втрату ради вищого розуміння Христа Ісуса, Господа мого, ради котрого я все втеряв, і вважаю все за сьміттє, аби придбати Христа,
9 Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.
та й явитись у Ньому, не маючи моєї праведности, що від закону, а (маючи) ту, що вірою Христовою (здобуваєть ся), праведність від Бога увірі,
10 Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
іцоб зрозуміти Його, і силу воскресення Його, і спільність мук Його, приподоблюючись смерти Його,
11 Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
аби тільки достигнути до воскресення мертвих.
12 Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.
Не тим, щоб уже я достиг, або вже був звершений; гоню ж, чи не достигну того, за що і Христос Ісус достиг мене.
13 Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
Браттє, я про себе не думаю, що я вже достиг; одно ж (роблю), забуваючи вже те що позаду, і сягаючи по те, що спереду,
14 Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.
біжу до мети по нагороду вишнього поклику Божого в Христї Ісусї.
15 Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.
Скільки оце (нас) звершених, се думаймо, і коли що инакше думаєте, то й се Бог вам одкриє.
16 Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
Тільки ж (те), до чого ми достигли, (єсть) одним правилом жити і те саме думати.
17 Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.
Приподоблюйтссь до мене, браттє, і вважайте, хто так ходить, яко ж маєте за взір нас.
18 Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.
(Многі бо ходять, про котрих не раз говорив я вам, тепер же й плачучи говорю, про ворогів хреста Христового,
19 Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.
котрим кінець - погибель, котрим Бог черево, а слава в соромі їх, котрі про земне думають.)
20 Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.
Наше бо життє єсть на небесах, звідкіля ждемо і Спасителя, Господа нашого Ісуса Христа,
21 Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.
котрий переобразить тіло смирення нашого, щоб було подобне тїлу слави Його, по дійству, котрим зможе і покорити собі все.

< Ndị Filipai 3 >