< Ndị Filipai 2 >
1 Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko,
Znamená pro vás něco napomenutí ve jménu Kristovu? Má pro vás význam, že nás Duch Boží vzájemně spojuje?
2 meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche.
Záleží vám na mé upřímné lásce? Pak tedy buďte svorní, mějte se rádi, usilujte o jednotu a jednomyslnost.
3 Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.
Ničím jiným mi neuděláte větší radost. Nebuďte laskaví a jednomyslní jen z vypočítavosti, nechtějte sklízet vděčnost a uznání, ale přejte je jiným.
4 Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.
Nemyslete jen na sebe a na vlastní blaho, spíš přemýšlejte, jak prospět jiným.
5 Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:
Osvojte si smýšlení Ježíše Krista:
6 Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.
Ač sám byl Bůh, nedomáhal se božských nároků,
7 Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.
odložil svou slávu a moc, stal se člověkem
8 Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe.
a dokonce přijal úděl otroka. Poslušně šel cestou ponížení až k potupné smrti: popravili ho na kříži jako zločince.
9 Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.
Ale právě proto ho Bůh nade všechno povýšil a dal mu takovou slávu,
10 Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.
aby se před jeho jménem každé stvoření v úctě sklonilo a uznalo, že je Pánem všeho.
11 Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
12 Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji.
Moji drazí, dokud jsem byl u vás, vždycky jste dbali mých slov. Tím spíše teď, když mezi vámi být nemohu, úzkostlivě se snažte, abyste získali věčný život.
13 Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.
Bůh, jenž ve vás působí, k tomu povzbudí vaši vůli a dá vám sílu proměnit ji v činy.
14 Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.
Všechno, co činíte, dělejte bez reptání a pochybností.
15 Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa!
Tím dokážete čistotu svého srdce a mezi zkaženými a převrácenými se osvědčíte jako ryzí Boží děti. Buďte svému okolí světlem. Až se Kristus zase objeví – jak budu šťasten, že jsem se nenamáhal zbytečně.
16 Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.
17 Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ
I kdybych měl své poslání zpečetit vlastní krví,
18 otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.
raduji se z toho a také vy se můžete radovat se mnou.
19 Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ.
Věřím, že mi Pán brzo umožní poslat k vám Timotea, abych se potěšil zprávami o vás.
20 Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu.
Jinak tu nemám nikoho, kdo by měl o vás tak upřímný zájem.
21 Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst.
Všichni myslí spíš na svůj vlastní prospěch než na zájmy Kristovy.
22 Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.
Ale Timotea jste už poznali, když mi ve službě Boží věci pomáhal jako vlastní syn.
23 Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
Jakmile bude o mně rozhodnuto, pošlu ho hned k vám.
24 Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya.
Mám ale ke Kristu důvěru, že brzo přijdu i já sám.
25 Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.
Rozhodl jsem se však poslat k vám zpátky Epafrodita. Jeho služby byly pro mne velmi cenné. V práci i boji mi stál po boku jako bratr.
26 Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga.
Ale teď se mu přece jen silně zastesklo po domově, zvlášť když uslyšel, že jste se dověděli o jeho nemoci.
27 Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.
Měl už opravdu namále, ale Bůh se nad ním slitoval. Také mne tím ušetřil další velké rány.
28 Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.
Vypravil jsem ho nazpět co nejrychleji, aby vás osobně uklidnil a zbavil mne tím velké starosti.
29 Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya.
Buďte k němu milí jako k bratrovi. Takových lidí si važte.
30 Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.
Vždyť pro Kristovo dílo dal v sázku vlastní život a ve snaze nahradit mi vás všechny by byl se málem uštval k smrti.