< Fịlịmọn 1 >
1 Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
Pauro musungwa waKristu Jesu, naTimotio hama, kuna Firimoni mudikanwi nemushumiri pamwe nesu,
2 Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
nekumudikanwi Apifia, nekuna Akipo muuto pamwe nesu, nekukereke iri mumba mako:
3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
Nyasha kwamuri nerugare rwunobva kuna Mwari Baba vedu naIshe Jesu Kristu.
4 Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
Ndinovonga Mwari wangu, ndichikureva nguva dzese paminyengetero yangu,
5 Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.
ndichinzwa zverudo rwako, nerutendo rwaunarwo kuna Ishe Jesu nekuvatsvene vese,
6 Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
kuti kudyidzana kwerutendo rwako kuve nesimba pakuziva chese chakanaka chiri mamuri muna Kristu Jesu.
7 Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
Nokuti tine mufaro mukuru nekunyaradzwa parudo rwako, nokuti ura hwevatsvene hwakavandudzwa newe, hama.
8 Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
Naizvozvo kunyange ndine kushinga kukuru muna Kristu kukuraira izvo zvakafanira,
9 Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
asi nekuda kwerudo zviri nani kukumbirisa, sezvandakadai ini Pauro mutana, uye ikozvinowo musungwa waJesu Kristu.
10 Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
Ndinokukumbirisa pamusoro pemwana wangu, wandakabereka muzvisungo zvangu, Onesimo,
11 Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
wakange asingambokubatsiri, asi ikozvino anobatsira kwauri nekwandiri,
12 Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.
wandatumirazve kwauri; asi iwe, mugamuchire, ndiko kuti ura hwangu;
13 Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.
wandaida kuramba naye aneni, kuti panzvimbo yako andishumire pazvisungo zveevhangeri;
14 Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.
asi handina kuda kuita chinhu kunze kwetendero yako, kuti chakanaka chako chirege kuitwa nekurovererwa, asi sepachido.
15 Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. (aiōnios )
Nokuti zvimwe wakaparadzaniswa newe chinguva nemhaka iyi, kuti umugamuchirezve nekusingaperi; (aiōnios )
16 Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
arege kuchiva semuranda, asi anopfuura muranda, hama inodikanwa, zvikuru kwandiri, asi zvikuru sei kwauri zvese panyama nemuna Ishe.
17 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
Naizvozvo kana uchindiverenga semubatidzani, mugamuchire seunogamuchira ini.
18 Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
Asi kana akakutadzira chimwe kana kuva nengava newe, izvozvo zviverengere kwandiri;
19 Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
ini Pauro ndanyora neruoko rwangu, ini ndicharipa; kuti ndirege kuti kwauri, uri ngava kwandiri iwewo pachako.
20 Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
Hongu, hama, ngandive nemufaro newe muna Ishe; vandudza ura hwangu muna Ishe.
21 Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
Ndakunyorera ndichivimba kuteerera kwako, ndichiziva kutiwo uchaita kupfuura zvandinoreva.
22 Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
Uyewo panguva iyoyo ndigadzirire pekugara; nokuti ndinotarisira kuti kubudikidza neminyengetero yenyu ndichapiwa kwamuri.
23 Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
Anokukwazisa Epafrasi musungwa pamwe neni muna Kristu Jesu,
24 Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
Mariko, Arisitako, Dhemasi, Ruka, vabati pamwe neni.
25 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
Nyasha dzaIshe wedu Jesu Kristu ngadzive nemweya wenyu. Ameni.