< Fịlịmọn 1 >
1 Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
Paul, a prisoner of Christ Jesus, and the brother Timothy to Philemon, our dear friend and fellow worker,
2 Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
and to Apphia our sister, and to Archippus our fellow soldier, and to the church that meets in your home.
3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
May grace be to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.
4 Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
I always thank my God. I mention you in my prayers.
5 Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.
I have heard of the love and the faith that you have in the Lord Jesus and for all the believers.
6 Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
I pray that the fellowship of your faith may be effective for the knowledge of everything good that is among us in Christ.
7 Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
For I have had much joy and comfort because of your love, because the hearts of the saints have been refreshed by you, brother.
8 Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
Therefore, although I have all the boldness in Christ to command you to do what you should do,
9 Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
yet because of love, I appeal to you instead—I, Paul, an old man, and now a prisoner for Christ Jesus.
10 Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
I am asking you concerning my child Onesimus, whom I have fathered in my chains.
11 Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
For he once was useless to you, but now he is useful both to you and to me.
12 Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.
I have sent him back to you, he who is my very heart.
13 Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.
I wish I could have kept him with me, so he could serve me for you, while I am in chains for the sake of the gospel.
14 Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.
But I did not want to do anything without your consent. I did not want your good deed to be from necessity but from good will.
15 Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. (aiōnios )
Perhaps for this he was separated from you for a time, so that you might have him back forever. (aiōnios )
16 Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
No longer would he be a slave, but better than a slave, a beloved brother. He is beloved especially to me, and much more so to you, in both the flesh and in the Lord.
17 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
So if you have me as a partner, receive him as me.
18 Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
If he has wronged you or owes you anything, charge that to me.
19 Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
I, Paul, write this with my own hand. I myself will pay it back—not to mention that you owe me your own self!
20 Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
Yes, brother, do me a favor in the Lord; refresh my heart in Christ.
21 Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
Confident about your obedience, I am writing to you. I know that you will do even more than I ask.
22 Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
At the same time, prepare a guest room for me, for I hope that through your prayers I will be given back to you.
23 Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
Epaphras, my fellow prisoner in Christ Jesus, greets you.
24 Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
So do Mark, Aristarchus, Demas, and Luke, my fellow workers.
25 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
May the grace of our Lord Jesus Christ be with your spirit. Amen.