< Ọbadaya 1 >

1 Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”
Vision d’Abdias. Voici ce que dit le Seigneur Dieu à Edom: [Nous avons entendu une nouvelle venant du Seigneur; et il a envoyé un messager vers les nations: Levez-vous, et levons-nous ensemble contre lui pour le combat].
2 “Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.
Voici que je t’ai placé très petit parmi les nations, tu es fort méprisable.
3 Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
L’orgueil de ton cœur t’a élevé, toi habitant dans les fentes des rochers, exaltant ton trône; toi qui dis dans ton cœur: Qui me fera descendre à terre?
4 A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Si tu t’élèves comme l’aigle, et que parmi les astres tu poses ton nid, je t’en ferai descendre, dit le Seigneur.
5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Si des voleurs, si des brigands étaient entrés chez toi durant la nuit, comment aurais-tu gardé le silence? N’auraient-ils pas volé ce qui leur suffisait? Si des vendangeurs étaient entrés chez toi, est-ce qu’ils ne t’auraient pas laissé au moins une grappe de raisin?
6 Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
Comment les ennemis ont-ils fouillé Esaü, fureté dans ce qu’il avait de caché?
7 Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.
Ils t’ont éconduit jusqu’à la frontière; tous tes alliés se sont joués de toi; les hommes qui vivaient en paix avec toi ont prévalu contre toi; ceux qui mangent ton pain dresseront des embûches sous tes pas; il n’y a pas de prudence en lui.
8 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
N’est-ce pas en ce jour-là, dit le Seigneur, que je perdrai les sages de l’Idumée et bannirai la prudence de la montagne d’Esaü?
9 Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.
Et ils craindront, tes braves du midi, que l’homme de la montagne d’Esaü ne périsse.
10 Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
À cause de tes meurtres et à cause de ton iniquité contre Jacob ton frère, la confusion te couvrira, et tu périras pour jamais.
11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
Au jour que tu t’élevais contre lui, quand des ennemis se rendaient maîtres de son armée, et que des étrangers entraient dans ses portes, et que sur Jérusalem ils jetaient le sort, toi aussi tu étais comme l’un d’entre eux.
12 Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.
Et tu ne mépriseras pas ton frère en son jour malheureux, au jour de son exil, et tu ne te réjouiras pas sur les fils de Juda au jour de leur ruine; et tu ne parleras pas orgueilleusement au jour de l’angoisse.
13 I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.
Et tu n’entreras pas dans la porte de mon peuple au jour de leur ruine; et tu ne les mépriseras pas, toi non plus, au milieu de ses maux, au jour de sa désolation; et tu ne seras pas envoyé contre son armée au jour de sa désolation.
14 I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.
Et tu ne te tiendras pas dans les carrefours, afin de tuer ceux qui fuiront, et tu n’enfermeras pas les restes de ses habitants au jour de la tribulation.
15 “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
Parce que le jour du Seigneur est près d’éclater sur toutes les nations; comme tu as fait, il te sera fait; ce que tu leur as fait, il le fera retomber sur ta tête.
16 Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.
Car comme vous avez bu sur ma montagne sainte, toutes les nations boiront sans discontinuer; et elles boiront, elles avaleront, et elles seront comme si elles n’étaient point.
17 Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
Mais sur la montagne de Sion sera le salut et elle sera sainte: la maison de Jacob possédera ceux qui l’avaient possédée.
18 Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
Et la maison de Jacob sera un feu, et la maison de Joseph une flamme, et la maison d’Esaü une paille; et ils l’embraseront, et ils la dévoreront, et il n’y aura pas de restes de la maison d’Esaü, parce que le Seigneur a parlé.
19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
Et ceux qui sont au midi hériteront de la montagne d’Esaü; et ceux qui sont dans les plaines assujettiront les Philistins; et ils posséderont la contrée d’Ephraïm et la contrée de Samarie, et Benjamin possédera Galaad.
20 Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.
Et les exilés de cette armée des enfants d’Israël posséderont tous les lieux des Chananéens jusqu’à Sarepta; et les exilés de Jérusalem, qui sont sur le Bosphore, posséderont les cités du midi.
21 Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn maka ịchị ugwu Ịsọ niile. Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.
Et les libérateurs monteront sur la montagne de Sion pour juger la montagne d’Esaü; et le règne sera au Seigneur.

< Ọbadaya 1 >