< Ọnụọgụgụ 1 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,
Mungu alimwambia Musa katika hema ya kukutania walipokuwa katika jangwa la Sinai. Hii ilitokea katika siku ya kwanza ya mwezi wa pili miaka miwili baadaya Waisraeli kutoka nchi ya Misri. Mungu alisema,
2 “Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
'fanya sensa ya wanaume wote wa Israel kutoka kila ukoo, katika familia za baba zao. Wahesabu kwa majina, wahesabu kila mume, kila mwanamume
3 Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
kuanzia umri a miaka ishirini na zaidi. Uwahesabu wote wanaoweza kupigana kama askari wa Israel. Wewe na Haruni mtaandika idadi ya wanaume katika makundi ya majeshi yao.
4 Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.
Kila mwanamume kwa kila kabila, kichwa cha ukoo, lazima atumike na wewe kama kiongozi wa kabila.
5 “Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
Haya ndiyo majina ya viongozi ambao watapigana pamoja na wewe: Kutoka kabila la Reubeni, Elizuri mwana wa Shedeuri;
6 site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai,
kutoka kabila la Simeoni, Shelumiel mwana wa Zurishadai
7 site nʼebo Juda, Nashọn nwa Aminadab,
Kutoka kabila la Yuda, Nashoni mwana wa Aminadabu;
8 site nʼebo Isaka, Netanel nwa Zua,
Ktoka kabila la Isakari, Nethaneli mwana wa Zuari;
9 site nʼebo Zebụlọn, Eliab nwa Helọn,
kutoka kabila Zebuluni, Eliabu mwana wa Heloni
10 Site nʼụmụ Josef: site nʼebo Ifrem, Elishama nwa Amihud site nʼebo Manase, Gamaliel nwa Pedazo
kutoka kabila la Efraimu mwana wa Yusufu, Elishama mwana wa Ammihudi; kutoka kabila la Manase, Gamaliel mwan wa Pedazuri;
11 site nʼebo Benjamin, Abidan nwa Gidiọn
kutoka kabila la Benjamini mwana wa Ysufu, Abidani mwan wa Gidion;
12 site nʼebo Dan, Ahieza nwa Amishadai
Kutoka kabila la Dan, Ahizeri mwana wa Amishadai;
13 site nʼebo Asha, Pagịel nwa Okran
kutoka kabila Asheri, Pagieli mwana wa Okirani;
14 site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel
kutoka kabila la Gadi, Eliasafu mwana wa Deuli;
15 site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”
na kutoka kabila la Naftali, Ahira mwana wa Enani.”
16 Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.
Hawa ndio wanaume waliochaguliwa kutoka kwa watu. Waliongoza kabila za mababu zao. Walikuwa viongozi wa koo katika Israel.
17 Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.
Musa na Haruni wakawachukua wale wanaume, waliokuwa wameandikwa kwa majina,
18 Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,
na pamoja na wanaume hao waliwakusanya wanume wote katika siku ya kwanza ya mwezi wa pili. Kisha kila mwanume wa miaka ishirini na zaidi alitambua babu zake. Alitakiwa kutaja koo na famila kutoka katika ukoo.
19 dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.
Kisha Musa akaandika hesabu yao huko katika nyika ya Sinai, Kama Mungu alivyokuwa amemwamuru kufanya.
20 Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Reubeni, mtoto wa kwanza wa Israel, yalihesabiwa majina yote ya kila mwanamume mwenye umri wa miaka ishirini na zaidi wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka hesabu ya ukoo na familia.
21 Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise.
Waliwahesabu wanaume 46, 000 kutoka ukoo wa Reubeni.
22 Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Simeoni yalihesabiwa majina yote ya kila mwanamume mwenye umri wa miaka ishirini na zaidi au wenye uwezo wa kwenda vitani, kutokana na hesabu ya ukoo na familia.
23 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Simiọn dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ.
Walihesabu wanaume 59, 300 kutoka kabila la Simeoni.
24 Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Gadi yalihesabiwa majina yote ya kila mwanamume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
25 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Gad dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise.
Walihesabu wanaume 45, 650 kutoka kabila la Gadi.
26 Site nʼụmụ Juda, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Yuda yalihesabiwa majina yote ya wanaume wenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
27 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Juda dị iri puku asaa, puku anọ na narị isii.
walihesabiwa wanume 74, 000 kutoka kabila la Yuda.
28 Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Isakari yalihesabiwa majina yote ya kila mwanamume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
29 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ.
Walihesabiwa wanaume 54, 000 kutoka kabila la Isakari.
30 Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Zabuloni yalihesabiwa majina yote ya kila mwanamume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
31 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ.
Walihesabiwa wanume 57, 400 kutoka kabila la Zabuloni.
32 Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Efraimu mwana wa Yusufu yalihesabiwa majina yote ya kila mwanaume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
33 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Ifrem dị iri puku anọ na narị ise.
Walihesabiwa wanaume 40, 500 kutoka kabila la Efraimu.
34 Site nʼụmụ Manase, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Manase mwana wa Yusufu yaliheabiwa majina yote ya kila mwanaume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu y a ukoo na familia.
35 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Manase dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ.
Walihesabiwa wanaume 32, 000 kutoka kabila la Manase.
36 Site nʼụmụ Benjamin, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Benjamini yalihesabiwa majina yote ya kila mwanaume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na wenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
37 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Benjamin dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ.
Walihesabiwa wanaume 35, 000 kutoka kabila la Benjamini.
38 Site nʼụmụ Dan, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Dani yalihesabiwa majina yote ya kila mwanaume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na mwenye uwezo wa kwenda vitani, Kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
39 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Dan dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa.
Walihesabiwa wanaume 62, 000 kutoka kabila la Dani.
40 Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka uzao wa Asheri yalihesabiwa majina yote ya kila mwanume mwenye umri wa miaka ishirini au zadi na mwenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu y a ukoo na familia.
41 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise.
Walihesabiwa wanaume 41, 500 kutoka ukoo wa Asheri.
42 Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Kutoka ukoo wa Naftali yalihesabiwa majina yote ya kila mwanaume mwenye umri wa miaka ishirini au zaidi na mwenye uwezo wa kwenda vitani, kutoka kwenye hesabu ya ukoo na familia.
43 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
Walihesabiwa wanaume 53, 400 kutoka kabila la Naftari
44 Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.
Musa na Haruni waliwahesabu wanaume wote hawa, pamoja na wale wanaume kumi na wawili waliokuwa wakiongoza yale makabila kumi na mawili ya Israeli.
45 Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị.
Kwa hiyo wanaume wote wa Israeli wenye umri wa miak ishirini au zaidi, wote wenye uwezo wa kwenda vitani, walihesabiwa kutoka kwenye familia zao.
46 Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise.
Walihesabu wanaume 603, 550.
47 A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a,
Lakini wanaume toka uzao wa Lawi hawakuhesabiwa,
48 nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
Kwa sababu BWANA alimwambia Musa,
49 “Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel.
“usiwahesabu wale wa kabila la Lawi wala kuwajumuisha kwenye jumla ya watu wa Israeli.
50 Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.
Badala yake, waagize Walawi kuliangalia hema la amri za agano, na kuangalia mapambo ya hema na vyote vilivyomo. Walawi watalazimika kulibeba hema na lazima wayabebe mapambo ya hema. Lazima waliangalie hema na kuyatengeneza mazingira yake. Wataiangalia masikani na kuzitengeneza kambi zinazolizunguka.
51 Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.
Kila hema litakapotakiwa kuhamishiwa eneo jingine, Walawi ndio watakaolipeleka pale. Na kila hema litakapotakiwa kusimamishwa, Walawi ndio watakao lisimamisha. Na mgeni yeyote atakayelisogelea hema lazima auawe.
52 Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha.
Wakati watu wa Israeli watakaposimamisha hema zao, kila mwanaume lazima awe karibu na bango la jeshi lake.
53 Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”
Hata hivyo Walawi lazima waweke hema zao kuizunguka hiyo masikani ya amri za agano ili kwamba hasira yangu isije ikawaka juu ya wana wa Israeli. Walawi lazima wailinde hiyo masikani ya amri za agano.”
54 Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Wana wa Israeli walifanya yote haya. Walifanya yote ambayo BWANA aliagiza kupitia Musa.

< Ọnụọgụgụ 1 >