< Ọnụọgụgụ 6 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
Olúwa sọ fún Mose pé,
2 Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait,
“Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé, ‘Bí ọkùnrin tàbí obìnrin kan bá jẹ́ ẹ̀jẹ́ pàtàkì, ẹ̀jẹ́ ìyara-ẹni-sọ́tọ̀ sí Olúwa nípa àìgé irun orí (Nasiri),
3 ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.
irú ẹni bẹ́ẹ̀ gbọdọ̀ yàgò fún wáìnì tàbí ọtí líle, ọtí wáìnì kíkan àti àwọn ohun mímu mìíràn tó bá kan. Kò gbọdọ̀ mu èso àjàrà tàbí kí ó jẹ èso àjàrà tútù tàbí gbígbẹ.
4 Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
Níwọ́n ìgbà tí ó sì jẹ́ Nasiri, ní kò gbọdọ̀ jẹ ohunkóhun tí a fi èso àjàrà ṣe, ìbá à ṣe kóró tàbí èèpo rẹ̀.
5 “‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
“‘Ní gbogbo ìgbà ẹ̀jẹ́ ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ yìí, kí abẹ kankan má ṣe kàn án ní orí. Ó gbọdọ̀ jẹ́ mímọ́ títí tí àkókò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ sí Olúwa yóò fi pé; ó gbọdọ̀ jẹ́ kí irun orí rẹ̀ gùn.
6 “‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,
“‘Ní gbogbo àkókò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ sí Olúwa kò gbọdọ̀ súnmọ́ òkú ènìyàn.
7 ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.
Ìbá à ṣe òkú baba, àti ìyá rẹ̀, ẹ̀gbọ́n rẹ̀ ọkùnrin tàbí obìnrin tàbí àbúrò rẹ̀, kò gbọdọ̀ sọ ara rẹ̀ di aláìmọ́ nítorí wọn, nítorí pé àmì ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ sí Ọlọ́run wà ní orí rẹ̀.
8 Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.
Ní gbogbo àsìkò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ yìí, ó jẹ́ mímọ́ sí Olúwa.
9 “‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.
“‘Bí ẹnìkan bá kú ní ọ̀dọ̀ rẹ̀ ní òjijì, tí ó sì ba irun rẹ̀ tó yà sọ́tọ̀ jẹ́; ó gbọdọ̀ gé irun rẹ̀ ní ọjọ́ ìwẹ̀nùmọ́ rẹ̀ èyí tí í ṣe ọjọ́ keje.
10 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
Ní ọjọ́ kẹjọ, yóò mú àdàbà méjì àti ọmọ ẹyẹlé méjì wá sọ́dọ̀ àlùfáà ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ ìpàdé.
11 Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
Àlùfáà yóò fi ọ̀kan rú ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ àti èkejì fún ẹbọ sísun láti fi ṣe ètùtù fún un nítorí pé ó ti ṣẹ̀ nípa wíwà níbi tí òkú ènìyàn wà. Yóò sì ya orí rẹ̀ sí mímọ́ ní ọjọ́ náà gan an.
12 Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
Ó gbọdọ̀ ya ara rẹ̀ sọ́tọ̀ sí Olúwa fún àkókò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀, ó sì gbọdọ̀ mú akọ ọ̀dọ́-àgùntàn ọlọ́dún kan wá gẹ́gẹ́ bí ọrẹ ẹ̀bi. Kò sì ní í ka àwọn ọjọ́ ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ ti tẹ́lẹ̀ nítorí pé ó tí ba ara rẹ̀ jẹ́ ní àkókò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀.
13 “‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
“‘Èyí ni òfin fún Nasiri nígbà tí àkókò ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ bá pé. Wọn ó mu wá sí ẹnu-ọ̀nà àgọ́ ìpàdé.
14 Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,
Níbẹ̀ ni yóò ti mú ọrẹ wá fún Olúwa, akọ ọ̀dọ́-àgùntàn ọlọ́dún kan tí kò ní àbùkù fún ẹbọ sísun àti ẹgbọrọ-àgùntàn ọlọ́dún kan, tí kò ní àbùkù fún ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀, àgbò kan tí kò ní àbùkù fún ọrẹ àlàáfíà,
15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
pẹ̀lú ọrẹ ohun jíjẹ àti ọrẹ ohun mímu, apẹ̀rẹ̀ àkàrà tí a kò fi ìwúkàrà ṣe, àkàrà tí a fi ìyẹ̀fun dáradára pò mọ́ òróró àti àkàrà fẹ́lẹ́fẹ́lẹ́ tí a fi òróró sọjọ̀ lé lórí.
16 “‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
“‘Àlùfáà yóò gbé gbogbo rẹ̀ wá síwájú Olúwa, yóò sì rú ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ àti ẹbọ sísun.
17 Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
Àlùfáà yóò fi àgbò náà rú ẹbọ àlàáfíà sí Olúwa, pẹ̀lú apẹ̀rẹ̀ àkàrà tí kò ní ìwúkàrà; yóò rú ẹbọ ohun jíjẹ àti ọrẹ ohun mímu.
18 “‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
“‘Nígbà náà ni Nasiri náà yóò fá irun ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ ìpàdé. Yóò fi irun náà sínú iná tó wà lábẹ́ ẹbọ àlàáfíà.
19 “‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.
“‘Lẹ́yìn tí Nasiri bá ti fá irun ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ tan, àlùfáà yóò mú apá àgbò bíbọ̀, àkàrà aláìwú kan àti àkàrà fẹ́lẹ́fẹ́lẹ́ tí kò ní ìwúkàrà láti inú apẹ̀rẹ̀ yóò sì kó gbogbo rẹ̀ lé e lọ́wọ́.
20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
Àlùfáà yóò fi gbogbo rẹ̀ níwájú Olúwa gẹ́gẹ́ bí ẹbọ fífì, wọ́n jẹ́ mímọ́, wọ́n sì jẹ́ ti àlùfáà pẹ̀lú igẹ̀ tí a fì àti itan tí wọ́n mú wá. Lẹ́yìn èyí, Nasiri náà lè mu wáìnì.
21 “‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’”
“‘Èyí ni òfin Nasiri tó jẹ́ ẹ̀jẹ́, ọrẹ rẹ̀ sí Olúwa, yóò wà ní ìbámu pẹ̀lú ìyàsọ́tọ̀ rẹ̀ gẹ́gẹ́ bí Nasiri, ní àfikún sí àwọn ohun mìíràn tó lágbára láti mú wá. Ó gbọdọ̀ mú ẹ̀jẹ́ tó jẹ́ ṣe gẹ́gẹ́ bí òfin Nasiri.’”
22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
Olúwa sọ fún Mose pé,
23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
“Sọ fún Aaroni àti àwọn ọmọ rẹ̀ pé, ‘Báyìí ni kí ẹ ṣe máa súre fún àwọn ọmọ Israẹli. Ẹ sọ fún wọn pé,
24 “‘“Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
“‘“Kí Olúwa bùkún un yín, kí ó sì pa yín mọ́.
25 Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,
Kí Olúwa kí o mú ojú rẹ̀ kí ó mọ́lẹ̀ sí i yín lára. Kí ó sì ṣàánú fún un yín.
26 Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.”’
Kí Olúwa bojú wò yín, kí ó sì fún un yín ní àlàáfíà.”’
27 “Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”
“Báyìí ni wọn ó ṣe fi orúkọ mi sára àwọn ọmọ Israẹli, Èmi ó sì bùkún wọn.”

< Ọnụọgụgụ 6 >