< Ọnụọgụgụ 5 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Chúa Hằng Hữu phán bảo Môi-se:
2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.
“Hãy dạy người Ít-ra-ên phải trục xuất những người phong hủi, người mắc bệnh lậu, và người bị ô uế vì đụng vào xác người chết ra khỏi trại quân.
3 Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”
Dù họ là đàn ông hay đàn bà cũng phải trục xuất để họ không làm ô uế trại quân, vì Ta ở giữa trại dân Ta.”
4 Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Người Ít-ra-ên vâng lời Chúa Hằng Hữu phán cùng Môi-se.
5 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Vậy, Chúa Hằng Hữu phán bảo Môi-se dạy người Ít-ra-ên:
6 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
“Khi một người—dù đàn ông hay đàn bà—phạm tội mà vi phạm luật Chúa Hằng Hữu,
7 Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
người ấy phải xưng tội, bồi thường thiệt hại do mình gây ra, cộng thêm một phần năm số ấy cho nạn nhân.
8 Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
Trường hợp nạn nhân không còn bà con gần để nhận bồi thường, số bồi thường phải nộp cho Chúa Hằng Hữu, và số ấy sẽ thuộc về thầy tế lễ, cộng thêm một con chiên để làm lễ chuộc tội.
9 Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
Như vậy, khi người Ít-ra-ên đem dâng lên Chúa vật gì, vật ấy sẽ thuộc về các thầy tế lễ.
10 Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’”
Những vật biệt riêng ra thánh mà mỗi người dâng sẽ thuộc về người; vật chi mỗi người ban cho thầy tế lễ, chắc sẽ thuộc về người vậy.”
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
Chúa Hằng Hữu lại phán bảo Môi-se:
12 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
“Hãy phán dạy người Ít-ra-ên rằng: Nếu một người đàn bà ngoại tình
13 site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
nhưng nàng giấu kín, không bị bắt quả tang, cũng không có nhân chứng,
14 ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
và nếu người chồng đâm nghi, nổi ghen,
15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
thì người ấy nên đưa vợ mình đến gặp thầy tế lễ, cũng đem theo một lễ vật gồm 2,2 lít bột lúa mạch không pha dầu, không rắc nhũ hương lên trên, vì là một tế lễ chay về sự ghen tuông, một tế lễ chay để ghi nhớ về tội lỗi.
16 “‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
Thầy tế lễ sẽ đem người đó đến trước Chúa Hằng Hữu,
17 Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
đổ nước thánh vào một cái bình bằng đất, bốc bụi dưới sàn Đền Tạm bỏ vào.
18 Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
Thầy tế lễ sẽ bảo người đứng trước mặt Chúa Hằng Hữu, lột trần đầu người, đặt lễ vật hồi tưởng vào tay; còn tay thầy tế lễ cầm bình nước đắng nguyền rủa.
19 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.
Thầy tế lễ bảo người ấy thề rồi nói: ‘Nếu không có ai nằm với ngươi ngoài chồng ngươi thì ngươi sẽ không chịu ảnh hưởng của nước đắng nguyền rủa này.
20 Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”
Nhưng nếu ngươi lỗi đạo với chồng và ngoại tình với người nam khác,
21 (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.
cầu Chúa Hằng Hữu khiến cho ngươi trở nên một mầm rủa sả và trù ẻo giữa vòng dân tộc ngươi, làm cho ngươi ốm lòi hông và phình bụng lên;
22 Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
nước đắng rủa sả này khá chui vào ruột gan làm cho bụng ngươi phình lên và ốm lòi hông.’ Nàng sẽ nói: ‘Xin cứ đúng như thế.’
23 “‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
Thầy tế lễ viết những lời nguyền rủa này vào sách, rồi rửa sách trong nước đắng.
24 Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
Khi người ấy uống nước đắng nguyền rủa, nó sẽ gây nhiều cay đắng trong bụng.
25 Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
Thầy tế lễ sẽ lấy lễ vật hồi tưởng khỏi tay người ấy, đem dâng đưa qua đưa lại trước Chúa Hằng Hữu, rồi đem lễ vật đến trước bàn thờ,
26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
bốc một nắm bột tượng trưng cho toàn thể lễ vật, đem đốt trên bàn thờ, rồi bảo người ấy uống nước.
27 Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
Nếu người đó ngoại tình, thì nước sẽ trở nên đắng trong bụng, bụng phình lên, đùi rữa nát, dân chúng sẽ nhắc đến người ấy mỗi khi nguyền rủa, thề thốt.
28 Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
Nhưng nếu trong sạch, thì người ấy sẽ không bị hại mà vẫn có thể sinh nở.
29 “‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
Đó là luật trường hợp về sự ghen tuông khi một người đàn bà, ở dưới quyền chồng mình, lỗi đạo và bị ô uế,
30 Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
hoặc khi nào tính ghen phát sinh nơi người chồng mà ghen vợ mình: Người phải đem vợ đến trước mặt Chúa Hằng Hữu và thầy tế lễ sẽ làm cho nàng hết thảy điều chi luật lệ này đã truyền dạy.
31 A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’”
Người chồng sẽ không có tội, mặc dù hậu quả tai hại xảy ra cho vợ mình, trong trường hợp vợ ngoại tình thật.”

< Ọnụọgụgụ 5 >