< Ọnụọgụgụ 5 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
UThixo wathi kuMosi,
2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.
“Tshela abako-Israyeli ukuthi basuse ezihonqweni wonke olobulephero loba ophuma ubovu loba bungobunjani, loba engongcolileyo ngokomkhuba ngenxa yesidumbu sofileyo.
3 Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”
Susani ngokufananayo loba ngowesilisa loba ngowesifazane; kumele limsuse ukuze angangcolisi isihonqo sakwabo; ngoba ngihlala khona phakathi kwabo.”
4 Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Abako-Israyeli bakwenza lokho; babakhuphela ngaphandle kwezihonqo. Bakwenza njengokulaywa kukaMosi nguThixo.
5 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
UThixo wathi kuMosi,
6 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
“Tshono kwabako-Israyeli uthi: ‘Nxa indoda loba umfazi onele omunye loba ngayiphi indlela etshengisele ukungathembeki kuThixo, lowomuntu ulomlandu
7 Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
njalo kumele avume isono sakhe. Kahlawule ngokugcweleyo icala lakhe, engezelele ingxenye yesihlanu ekuhlawuleni lowo amoneleyo.
8 Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
Kodwa uba lowo engelasihlobo okungahlawulwa kuso icala, inhlawulo ngekaThixo, kodwa lizaphiwa umphristi, kanye lenqama azamenzela ngayo indlela yokubuyisana.
9 Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
Izipho zonke ezingcwele ezilethwa ngabako-Israyeli kumphristi zizakuba ngezakhe.
10 Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’”
Izipho zendoda inye ngayinye ezingcwele ngezayo, kodwa lokho indoda ezakupha umphristi ngokomphristi.’”
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
UThixo wathi kuMosi,
12 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
“Khuluma labako-Israyeli ubatshele ukuthi: ‘Nxa umfazi wendoda ephambuka engathembeki endodeni
13 site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
ngokulala lamanye amadoda kodwa lokhu kungesobala endodeni yakhe lehlazo lelo lingabonakali (njengoba kungelamfakazi njalo engabanjwanga ekwenza),
14 ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
kodwa indoda ikhulelwe yibukhwele ibisimnakanela umfazi wayo ukuthi ungcolile, loba ilobukhwele imnakanela kodwa yena engangcolanga,
15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
kumele ithathe umfazi wayo iye laye kumphristi. Phezu kwalokho kumele imphathele ifulawa yebhali eyingxenye yetshumi yehefa. Akumelanga ithele amafutha e-oliva phezu kwayo loba afake impepha phezu kwayo ngoba kungumnikelo wobukhwele wamabele, umnikelo wokubonisa ukuthi kulecala.
16 “‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
Umphristi uzamletha owesifazane amise phambi kukaThixo.
17 Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
Abesethatha amanzi angcwele ngembiza yomdaka athele emanzini uthuli olubuthwe phansi ethabanikeleni.
18 Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
Ngemva kokuba umphristi eseke wamisa owesifazane phambi kukaThixo kumele atshombulule inwele zakhe abesefaka ezandleni zakhe umnikelo wokukhumbuza, umnikelo wobukhwele wamabele, umphristi yena uzabe ephethe amanzi ababayo aletha isithuko.
19 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.
Ngalokho-ke umphristi uzafungisa owesifazane athi kuye, “Nxa kungelandoda eke yalala lawe loba ungazange uphambuke ungcole wena wendile, akuthi lamanzi ababayo aletha isithuko angakulimazi.
20 Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”
Kodwa nxa uphambukile wena wendile wazingcolisa ngokulala lenye indoda engasumkakho,”
21 (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.
lapho umphristi kufanele afungise owesifazane ngesithuko lesi athi, “sengathi uThixo angenza abakini bakuthuke, bakuhlamukele lapho ekwenza ukuba uswele kuthi isisu sakho sikhukhumale.
22 Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
Akuthi amanzi la aletha isithuko angene emzimbeni wakho ukuze isisu sakho sikhukhumale kumbe uswele.” Ngakho owesifazane uzakuthi, “Ameni. Akube njalo.”
23 “‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
Umphristi uzaloba lezi zithuko ogwalweni azigezisele emanzini ababayo.
24 Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
Uzanathisa owesifazane amanzi ababayo aletha isithuko, wona amanzi azamzwisa ubuhlungu nxa esewanathile.
25 Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
Umphristi uzasusa ezandleni zowesifazane umnikelo wamabele obukhwele, awuzunguze phambi kukaThixo abesewuletha e-alithareni.
26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
Umphristi abesechupha-ke ngesandla umnikelo wamabele njengomnikelo wesikhumbuzo awutshisele e-alithareni; ngemva kwalokho kumele anathise owesifazane amanzi la.
27 Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
Nxa ezingcolisile ngokungathembeki kumkakhe, kuzakuthi lapho enatha amanzi aletha isithuko, angene emzimbeni abangele ubuhlungu; isisu sakhe sizakhukhumala njalo aswele, abe ngoqalekisiweyo ebantwini bakibo.
28 Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
Kodwa-ke nxa lo owesifazane engazingcolisanga, emsulwa, uzakhululwa kulelo cala abelakho ukuthola inzalo.
29 “‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
Ngakho-ke, lo yiwo umlayo wobukhwele nxa owesifazane ephambukile wazingcolisa yena endile,
30 Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
loba nxa indoda ifikelwa yibukhwele ngoba ilesazela ngomkayo. Umphristi uzamisa owesifazane phambi kukaThixo asebenzise lumlayo ngokugcweleyo kowesifazane.
31 A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’”
Indoda izabe imsulwa ekoneni konke, kodwa owesifazane uzathwala izehlakalo zonke zesono sakhe.’”

< Ọnụọgụgụ 5 >