< Ọnụọgụgụ 4 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
The LORD spoke to Moses and to Aaron, saying,
2 “Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
"Take a census of the sons of Kohath from among the sons of Levi, by their families, by their fathers' houses,
3 Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
from thirty years old and upward even until fifty years old, all who enter into the service, to do the work in the Tent of Meeting.
4 “Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
This is the service of the sons of Kohath in the Tent of Meeting, the most holy things.
5 Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
When the camp moves forward, Aaron shall go in, and his sons, and they shall take down the veil of the screen, and cover the ark of the Testimony with it,
6 Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
and shall put a covering of sealskin on it, and shall spread over it a cloth all of blue, and shall put in its poles.
7 “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
On the table of show bread they shall spread a blue cloth, and put on it the dishes, the spoons, the bowls, and the pitchers for pouring with them; and the continual bread shall be on it.
8 Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
They shall spread on them a scarlet cloth, and cover the same with a covering of sealskin, and shall put in its poles.
9 “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
They shall take a blue cloth, and cover the lampstand of the light, and its lamps, and its snuffers, and its snuff dishes, and all its oil vessels, with which they minister to it.
10 Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
They shall put it and all its vessels within a covering of sealskin, and shall put it on the frame.
11 “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
On the golden altar they shall spread a blue cloth, and cover it with a covering of sealskin, and shall put in its poles.
12 “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.
They shall take all the vessels of ministry, with which they minister in the sanctuary, and put them in a blue cloth, and cover them with a covering of sealskin, and shall put them on the frame.
13 “A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ.
They shall take away the ashes from the altar, and spread a purple cloth on it.
14 Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.
They shall put on it all its vessels, with which they minister about it, the fire pans, the flesh hooks, the shovels, and the basins; all the vessels of the altar; and they shall spread on it a covering of sealskin, and put in its poles.
15 “Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.
"When Aaron and his sons have finished covering the sanctuary, and all the furniture of the sanctuary, as the camp moves forward; after that, the sons of Kohath shall come to carry it: but they shall not touch the sanctuary, lest they die. These things are the burden of the sons of Kohath in the Tent of Meeting.
16 “Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.”
"The duty of Eleazar the son of Aaron the priest shall be the oil for the light, the sweet incense, the continual meal offering, and the anointing oil, the requirements of all the tabernacle, and of all that is in it, the sanctuary, and its furnishings."
17 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
The LORD spoke to Moses and to Aaron, saying,
18 “Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
"Do not cut off the tribe of the families of the Kohathites from among the Levites;
19 Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.
but thus do to them, that they may live, and not die, when they approach to the most holy things: Aaron and his sons shall go in, and appoint them everyone to his service and to his burden;
20 Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.”
but they shall not go in to see the sanctuary even for a moment, lest they die."
21 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
The LORD spoke to Moses, saying,
22 “Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
"Take a census of the sons of Gershon also, by their fathers' houses, by their families;
23 Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.
you shall count them from thirty years old and upward until fifty years old; all who enter in to wait on the service, to do the work in the Tent of Meeting.
24 “Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu.
This is the service of the families of the Gershonites, in serving and in bearing burdens:
25 Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
they shall carry the curtains of the tabernacle, and the Tent of Meeting, its covering, and the covering of sealskin that is above on it, and the screen for the door of the Tent of Meeting,
26 Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.
and the tapestries of the court, and the screen for the door of the gate of the court, which is by the tabernacle and around the altar, and their cords, and all the instruments of their service, and whatever shall be done with them. So they are to serve.
27 Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.
At the commandment of Aaron and his sons shall be all the service of the sons of the Gershonites, in all their burden, and in all their service; and you shall appoint their duty to them in all their responsibilities.
28 Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.
This is the service of the families of the sons of the Gershonites in the Tent of Meeting: and their duty shall be under the hand of Ithamar the son of Aaron the priest.
29 “Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
"As for the sons of Merari, you shall number them by their families, by their fathers' houses;
30 Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.
you shall count them from thirty years old and upward even to fifty years old, everyone who enters on the service, to do the work of the Tent of Meeting.
31 Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile;
This is the duty of their burden, according to all their service in the Tent of Meeting: the tabernacle's boards, its bars, its pillars, its sockets,
32 tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
and the pillars of the court around it, and their sockets, and their pins, and their cords, with all their instruments, and with all their service: and by name you shall appoint the instruments of the duty of their burden.
33 Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.”
This is the service of the families of the sons of Merari, according to all their service, in the Tent of Meeting, under the hand of Ithamar the son of Aaron the priest."
34 Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Moses and Aaron and the leaders of the congregation numbered the sons of the Kohathites by their families, and by their fathers' houses,
35 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ
from thirty years old and upward even to fifty years old, everyone who entered into the service, for work in the Tent of Meeting.
36 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise.
Those who were numbered of them by their families were two thousand seven hundred fifty.
37 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Kohat ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
These are those who were numbered of the families of the Kohathites, all who served in the Tent of Meeting, whom Moses and Aaron numbered according to the commandment of the LORD by Moses.
38 A gụrụ ụmụ Geshọn ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Those who were numbered of the sons of Gershon, their families, and by their fathers' houses,
39 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute,
from thirty years old and upward even to fifty years old, everyone who entered into the service, for work in the Tent of Meeting,
40 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ.
even those who were numbered of them, by their families, by their fathers' houses, were two thousand six hundred thirty.
41 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
These are those who were numbered of the families of the sons of Gershon, all who served in the Tent of Meeting, whom Moses and Aaron numbered according to the commandment of the LORD.
42 A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Those who were numbered of the families of the sons of Merari, by their families, by their fathers' houses,
43 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute
from thirty years old and upward even to fifty years old, everyone who entered into the service, for work in the Tent of Meeting,
44 dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ.
even those who were numbered of them by their families, were three thousand two hundred.
45 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
These are those who were numbered of the families of the sons of Merari, whom Moses and Aaron numbered according to the commandment of the LORD by Moses.
46 Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
All those who were numbered of the Levites, whom Moses and Aaron and the leaders of Israel numbered, by their families, and by their fathers' houses,
47 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ
from thirty years old and upward even to fifty years old, everyone who entered in to do the work of service, and the work of bearing burdens in the Tent of Meeting,
48 dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ.
even those who were numbered of them, were eight thousand five hundred eighty.
49 Dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
According to the commandment of the LORD they were numbered by Moses, everyone according to his service, and according to his burden. Thus were they numbered by him, as the LORD commanded Moses.

< Ọnụọgụgụ 4 >