< Ọnụọgụgụ 36 >

1 Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:
سران طوایف جلعاد (جلعاد پسر ماخیر، ماخیر پسر منسی و منسی پسر یوسف بود) با درخواستی نزد موسی و رهبران اسرائیل آمدند و به موسی یادآوری کرده، گفتند: «خداوند به تو دستور داد که زمین را به قید قرعه بین قوم اسرائیل تقسیم کنی و ارث برادرمان صَلُفحاد را به دخترانش بدهی.
2 “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.
3 Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.
ولی اگر آنها با مردان قبیلهٔ دیگری ازدواج کنند، زمینشان هم با خودشان به آن قبیله انتقال خواهد یافت و بدین‌سان از کل زمین قبیلهٔ ما کاسته خواهد گردید
4 Mgbe afọ inwere onwe nye Izrel ruru, a ga-agụnye ihe nketa ha nʼebo ebe ha lụrụ dị. A ga-esi otu a wepụ ala ha site nʼihe nketa nke nna nna anyị ha ketara.”
و در سال یوبیل هم بازگردانده نخواهد شد.»
5 Mgbe ahụ, Mosis nyere ndị Izrel ntụziaka site nʼiwu Onyenwe anyị sị, “Ihe ndị ikom ebo Josef na-ekwu ziri ezi.
آنگاه موسی در حضور قوم این دستورها را از جانب خداوند به ایشان داد: «شکایت مردان قبیلهٔ یوسف بجاست،
6 Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha.
آنچه خداوند دربارهٔ دختران صلفحاد امر فرموده این است: بگذارید این دختران با مردان دلخواه خود ازدواج کنند، ولی فقط به شرط آنکه این مردان از قبیلهٔ خودشان باشند.
7 O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.
به این طریق هیچ قسمتی از زمینهای قبیلهٔ یوسف به قبیلهٔ دیگری منتقل نخواهد شد، زیرا میراث هر قبیله بایستی همان‌طور که در اول تقسیم شد برای همیشه همان‌طور باقی بماند.
8 Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.
دخترانی که در تمامی قبایل اسرائیل وارث زمین هستند بایستی با مردان قبیلهٔ خودشان ازدواج کنند تا زمین ایشان از آن قبیله، جدا نشود.
9 Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
به این طریق هیچ میراثی از قبیله‌ای به قبیلهٔ دیگر منتقل نخواهد شد.»
10 Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
دختران صلفحاد همان‌طور که خداوند به موسی دستور داده بود عمل کردند.
11 Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.
این دختران، یعنی محله، تِرصه، حُجله، مِلکه و نوعه با پسر عموهای خود ازدواج کردند. بدین ترتیب آنها با مردانی از قبیلهٔ خود یعنی قبیلهٔ منسی (پسر یوسف) ازدواج کردند و میراث آنان در قبیلهٔ خودشان باقی ماند.
12 Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.
13 Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị sitere nʼaka Mosis nye ndị Izrel nʼoge ha nọ nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko.
این است احکام و اوامری که خداوند توسط موسی به قوم اسرائیل داد، هنگامی که آنها در دشت موآب کنار رود اردن و در مقابل اریحا اردو زده بودند.

< Ọnụọgụgụ 36 >