< Ọnụọgụgụ 35 >
1 Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Lórí pẹ̀tẹ́lẹ̀ Moabu ní Jordani tí ó rékọjá láti Jeriko, Olúwa sọ fún Mose pé,
2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.
“Pàṣẹ fún àwọn ọmọ Israẹli láti fún àwọn Lefi ní ilẹ̀ láti gbé lára ogún tí àwọn ọmọ Israẹli yóò jogún. Kí ẹ sì fún wọn ní ilẹ̀ lára pápá oko tútù, káàkiri ìlú.
3 Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
Nígbà náà, wọn yóò ní ìlú tí wọn yóò gbé àti ilẹ̀ pápá oko tútù fún ẹran ọ̀sìn, ọ̀wọ́ ẹran pẹ̀lú gbogbo ìní wọn.
4 “Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
“Ilẹ̀ pápá oko tútù káàkiri ìlú tí ẹ ó fi fún àwọn ọmọ Lefi, wíwọ̀n rẹ̀ yóò jẹ́ ẹgbẹ̀rún ìgbọ̀nwọ́ (1,500 ẹsẹ̀ bàtà) láti ògiri ìlú náà.
5 Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
Lẹ́yìn ìlú náà, wọn ẹgbẹ̀rún méjì ìgbọ̀nwọ́ lápá ibi ìhà ìlà-oòrùn, ẹgbẹ̀rún méjì ẹsẹ̀ bàtà ní ìhà gúúsù, ẹgbẹ̀rún méjì ní ìhà ìwọ̀-oòrùn àti ẹgbẹ̀rún méjì ní ìhà àríwá, kí ìlú náà sì wà ní àárín. Wọn yóò ní agbègbè yìí gẹ́gẹ́ bí ilẹ̀ pápá oko tútù fún ìlú náà.
6 “Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
“Mẹ́fà lára ìlú tí ẹ fún àwọn ọmọ Lefi yóò jẹ́ ìlú ààbò, tí ẹni tí ó bá pa ènìyàn yóò sá sí. Ní àfikún, ẹ fún wọn ní méjìlélógójì ìlú sí i.
7 Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
Ní gbogbo rẹ̀, kí ẹ fún àwọn ọmọ Lefi ní méjìdínláàádọ́ta ìlú lápapọ̀ pẹ̀lú ilẹ̀ pápá oko tútù wọn.
8 Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
Ìlú tí ẹ fún àwọn ọmọ Lefi láti ara ilẹ̀ tí àwọn ọmọ Israẹli jogún, olúkúlùkù kí ó fi nínú ìlú rẹ̀ fún àwọn ọmọ Lefi gẹ́gẹ́ bí ilẹ̀ ìní rẹ̀ tí ó ní. Gba púpọ̀ lọ́wọ́ ẹ̀yà tí ó ní púpọ̀ àti díẹ̀ lọ́wọ́ ẹ̀yà tí ó ní díẹ̀.”
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Nígbà náà ni Olúwa sọ fún Mose pé,
10 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
“Sọ̀rọ̀ sí àwọn ọmọ Israẹli, kí o sì sọ fún wọn: ‘Nígbà tí ẹ bá rékọjá odò Jordani sí Kenaani,
11 họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
yan àwọn ìlú kan láti jẹ́ gẹ́gẹ́ bí ìlú ààbò fún yín, kí apani tó pa ènìyàn ní àìmọ̀ máa sálọ síbẹ̀.
12 Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
Wọn yóò jẹ́ ibi ìsásí kúrò lọ́wọ́ olùgbẹ̀san, kí ẹni tí a fi ẹ̀sùn ìpànìyàn kàn má ba à kú kí ó tó dúró níwájú àwọn ìjọ àwọn ènìyàn ní ìdájọ́.
13 Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
Mẹ́fà nínú ìlú tí ẹ ó fi fún wọn yóò jẹ́ ìlú ààbò fún yín.
14 Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
Yan ìlú mẹ́ta ní ìhà ti Jordani, kí ẹ sì yan ìlú mẹ́ta ní ìhà Kenaani tí yóò máa jẹ́ ìlú ìsásí.
15 Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
Ìlú mẹ́fà yìí yóò jẹ́ ìlú ìsásí fún àwọn ọmọ Israẹli, fún àjèjì àti ẹnikẹ́ni tí ó bá ń gbé láàrín wọn, kí ẹnikẹ́ni tí ó bá pa ènìyàn ní àìmọ̀ sálọ síbẹ̀.
16 “‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.
“‘Bí ọkùnrin kan bá fi ohun èlò irin lu ènìyàn tí ó kú, apànìyàn ni, pípa ni a ó pa, apànìyàn náà.
17 A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.
Tàbí tí ènìyàn bá mú òkúta tí ó lè pa ènìyàn lọ́wọ́ tí ó sì fi lu ènìyàn, tí ó sì kú, apànìyàn ni, pípa ni a ó pa apànìyàn náà.
18 A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.
Tàbí tí ènìyàn bá mú ohun èlò igi ní ọwọ́ rẹ̀ tí ó sì lẹ̀ ẹ́ pa ènìyàn, tí ó sì fi lu ènìyàn, tí ó sì kú, apànìyàn ni; pípa ní a ó pa apànìyàn náà.
19 Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.
Olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ yóò pa apànìyàn náà; tí ó bá bá a, yóò pa á.
20 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,
Tí ẹnikẹ́ni tí ó bá ń yan odì pẹ̀lú ìríra tí ẹlòmíràn tàbí ju nǹkan sí i pẹ̀lú èrò, tí ó sì kú.
21 maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
Tàbí pẹ̀lú ìjà gbangba lù ú pẹ̀lú ìkùùkuu tí ó sì kú, pípa ni a ó pa ẹni bẹ́ẹ̀; apànìyàn ni. Olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ yóò pa apànìyàn náà tí ó bá bá a.
22 “‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,
“‘Ṣùgbọ́n bí ó bá fi nǹkan gún un lójijì láìṣọ̀ta, tàbí tí ó sọ ohunkóhun lù ú láìmọ̀-ọ́n-mọ̀ ṣe
23 maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
tàbí, láìri, ju òkúta sí tí ó lè pa á, tí ó sì kú, nígbà tí kì í ṣe ọ̀tá rẹ̀, láti ṣe é léṣe.
24 mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
Àwọn àpéjọ gbọdọ̀ dájọ́ láàrín rẹ̀ àti olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ìlànà.
25 Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
Àpéjọ gbọdọ̀ dá ààbò bo ẹni tí a fi ẹ̀sùn ìpànìyàn kàn, kí a sì rán an padà lọ sí ìlú ìsásí tí ó ti wá. Ó gbọdọ̀ dúró níbẹ̀ títí di ìgbà tí olórí àlùfáà bá kú, ẹni tí a fi àmì òróró yàn.
26 “‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
“‘Ṣùgbọ́n ti ẹni tí a fi sùn kan bá jáde kọjá ààlà ìlú ìsásí tí ó sá sí.
27 na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.
Tí olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ sì ri ní ìta ìlú náà, olùgbẹ̀san lè pa ẹni tí a fi ẹ̀sùn kàn láìjẹ̀bi ẹ̀sùn ìpànìyàn.
28 Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
Ẹni tí a fi ẹ̀sùn kàn gbọdọ̀ dúró nínú ìlú ìsásí títí di ìgbà tí olórí àlùfáà bá kú; lẹ́yìn ikú olórí àlùfáà, ni ó tó lè padà sí ibi tí dúkìá rẹ̀ wà.
29 “‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
“‘Wọ̀nyí ni ó jẹ́ ìlànà ìdájọ́ fún yín ní ìran yín tó ń bọ̀, ní ibikíbi tí ẹ bá ń gbé.
30 “‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
“‘Ẹnikẹ́ni tí ó bá pa ènìyàn gbọdọ̀ kú gẹ́gẹ́ bí apànìyàn lórí ìjẹ́rìí àwọn ènìyàn. Ṣùgbọ́n ẹlẹ́rìí kan ṣoṣo. Kì yóò jẹ́rìí sí ẹnìkan láti pa.
31 “‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
“‘Má ṣe gba ohun ìràpadà fún ẹ̀mí apànìyàn, tí ó jẹ̀bi kí ó kú. Ṣùgbọ́n pípa ni kí a pa á.
32 “‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
“‘Má ṣe gba ìràsílẹ̀ fún ẹnikẹ́ni tí ó bá lọ sí ìlú ìsásí, pe kí ó padà máa gbé ní ilẹ̀ tirẹ̀ kí ó tó di ìgbà ikú olórí àlùfáà.
33 “‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
“‘Má ṣe sọ ilẹ̀ tí ẹ wà di àìmọ́. Ìtàjẹ̀ sílẹ̀ sọ ilẹ̀ náà di àìmọ́. Àtúnṣe kì yóò sí fún ilẹ̀ tí a ti ta ẹ̀jẹ̀ lé lórí, àyàfi ẹ̀jẹ̀ ẹni tí ó ta á sílẹ̀.
34 Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’”
Má ṣe sọ di àìmọ́, ilẹ̀ tí ẹ ń gbé, àti èyí tí mo ń gbé, nítorí Èmi Olúwa ń gbé láàrín àwọn ọmọ Israẹli.’”