< Ọnụọgụgụ 35 >

1 Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The LORD spoke to Moses in the plains of Moab by the Jordan at Jericho, saying,
2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.
"Command the children of Israel that they give to the Levites of the inheritance of their possession cities to dwell in; and you shall give suburbs for the cities around them to the Levites.
3 Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
The cities shall they have to dwell in; and their suburbs shall be for their livestock, and for their substance, and for all their animals.
4 “Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
"The suburbs of the cities, which you shall give to the Levites, shall be from the wall of the city and outward one thousand seven hundred twenty-two feet six inches around it.
5 Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
You shall measure outside of the city for the east side three thousand four hundred forty-five feet, and for the south side three thousand four hundred forty-five feet, and for the west side three thousand four hundred forty-five feet, and for the north side three thousand four hundred forty-five feet, the city being in the midst. This shall be to them the suburbs of the cities.
6 “Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
"The cities which you shall give to the Levites, they shall be the six cities of refuge, which you shall give for the manslayer to flee to: and besides them you shall give forty-two cities.
7 Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
All the cities which you shall give to the Levites shall be forty-eight cities together with their suburbs.
8 Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
Concerning the cities which you shall give of the possession of the children of Israel, from the many you shall take many; and from the few you shall take few: everyone according to his inheritance which he inherits shall give of his cities to the Levites."
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The LORD spoke to Moses, saying,
10 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
"Speak to the children of Israel, and tell them, 'When you pass over the Jordan into the land of Canaan,
11 họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
then you shall appoint you cities to be cities of refuge for you, that the manslayer who kills any person unwittingly may flee there.
12 Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
The cities shall be to you for refuge from the avenger, that the manslayer not die, until he stands before the congregation for judgment.
13 Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
The cities which you shall give shall be for you six cities of refuge.
14 Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
You shall give three cities beyond the Jordan, and you shall give three cities in the land of Canaan; they shall be cities of refuge.
15 Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
For the children of Israel, and for the stranger and for the foreigner living among them, shall these six cities be for refuge; that everyone who kills any person unwittingly may flee there.
16 “‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.
"'But if he struck him with an instrument of iron, so that he died, he is a murderer: the murderer shall surely be put to death.
17 A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.
If he struck him with a stone in the hand, by which a man may die, and he died, he is a murderer: the murderer shall surely be put to death.
18 A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.
Or if he struck him with a weapon of wood in the hand, by which a man may die, and he died, he is a murderer: the murderer shall surely be put to death.
19 Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.
The avenger of blood shall himself put the murderer to death: when he meets him, he shall put him to death.
20 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,
If he thrust him of hatred, or hurled at him, lying in wait, so that he died,
21 maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
or in enmity struck him with his hand, so that he died; he who struck him shall surely be put to death. He is a murderer, the murderer must surely be put to death; the avenger of blood shall put the murderer to death when he meets him.
22 “‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,
"'But if he thrust him suddenly without enmity, or hurled on him anything without lying in wait,
23 maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
or with any stone, by which a man may die, not seeing him, and cast it on him, so that he died, and he was not his enemy, neither sought his harm;
24 mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
then the congregation shall judge between the striker and the avenger of blood according to these ordinances;
25 Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
and the congregation shall deliver the manslayer out of the hand of the avenger of blood, and the congregation shall restore him to his city of refuge, where he was fled: and he shall dwell in it until the death of the high priest, who was anointed with the holy oil.
26 “‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
"'But if the manslayer shall at any time go beyond the border of his city of refuge, where he flees,
27 na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.
and the avenger of blood find him outside of the border of his city of refuge, and the avenger of blood kill the manslayer; he shall not be guilty of blood,
28 Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
because he should have remained in his city of refuge until the death of the high priest: but after the death of the high priest the manslayer shall return into the land of his possession.
29 “‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
"'These things shall be for a statute and ordinance to you throughout your generations in all your dwellings.
30 “‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
"'Whoever kills any person, the murderer shall be slain at the mouth of witnesses: but one witness shall not testify against any person that he die.
31 “‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
"'Moreover you shall take no ransom for the life of a murderer who is guilty of death; but he shall surely be put to death.
32 “‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
"'You shall take no ransom for him who is fled to his city of refuge, that he may come again to dwell in the land, until the death of the priest.
33 “‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
"'So you shall not pollute the land in which you are: for blood, it pollutes the land; and no expiation can be made for the land for the blood that is shed in it, but by the blood of him who shed it.
34 Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’”
You shall not defile the land which you inhabit, in the midst of which I dwell: for I, the LORD, dwell in the midst of the children of Israel.'"

< Ọnụọgụgụ 35 >