< Ọnụọgụgụ 34 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Bwana akamwambia Mose,
2 “Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
“Waamuru Waisraeli na uwaambie: ‘Mtakapoingia nchi ya Kanaani, nchi ambayo itagawanywa kwenu kama urithi itakuwa na mipaka ifuatayo:
3 “‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
“‘Upande wenu wa kusini utajumuisha sehemu ya Jangwa la Sini kufuata mpaka wa Edomu. Upande wa mashariki mpaka wenu wa kusini utaanzia mwisho wa Bahari ya Chumvi,
4 gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
katiza kusini mwa Pito la Akrabimu, endelea mpaka Sini na kwenda kusini ya Kadesh-Barnea. Kisha mpaka huo utaenda hadi Hasar-Adari hadi Azmoni,
5 ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
mahali ambapo utapinda, na kuunganika na Kijito cha Misri na kumalizikia kwenye Bahari ya Kati.
6 Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
“‘Mpaka wenu wa magharibi utakuwa Bahari ya Kati. Huu utakuwa mpaka wenu upande wa magharibi.
7 Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
“‘Kwa mpaka wenu wa kaskazini, wekeni alama kuanzia Bahari ya Kati hadi mlima Hori,
8 Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
na kutoka mlima Hori hadi Pito la Hamathi. Kisha mpaka utaenda hadi Sedadi,
9 ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
kuendelea hadi Zifroni, na kuishia Hasar-Enani. Huu utakuwa mpaka wenu upande wa kaskazini.
10 Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
“‘Kwa mpaka wenu wa mashariki, wekeni alama kuanzia Hasar-Enani hadi Shefamu.
11 Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
Mpaka utaelekea kusini kuanzia Shefamu hadi Ribla upande wa mashariki wa Aini, na kuendelea kwenye miteremko mashariki mwa Bahari ya Kinerethi.
12 Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’”
Kisha mpaka utashuka kuelekea Mto Yordani na kuishia katika Bahari ya Chumvi. “‘Hii itakuwa nchi yenu, ikiwa na mipaka yake kila upande.’”
13 Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
Mose akawaamuru Waisraeli: “Gawanyeni nchi hii kwa kura kama urithi. Bwana ameagiza kwamba itolewe kwa yale makabila tisa na nusu,
14 Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
kwa sababu jamaa ya kabila la Reubeni, kabila la Gadi, na nusu ya kabila la Manase wamekwishapokea urithi wao.
15 Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
Haya makabila mawili na nusu wamekwishapokea urithi wao upande wa mashariki wa Yordani ngʼambo ya Yeriko, kuelekea mawio ya jua.”
16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Bwana akamwambia Mose,
17 “Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
“Haya ndiyo majina ya watu ambao watakusaidia kugawanya nchi kama urithi: Eleazari kuhani na Yoshua mwana wa Nuni.
18 Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
Tena uteue kiongozi mmoja kutoka kila kabila kusaidia kuigawanya nchi.
19 “Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
Haya ndiyo majina yao: “Kalebu mwana wa Yefune, kutoka kabila la Yuda;
20 Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
Shemueli mwana wa Amihudi, kutoka kabila la Simeoni;
21 Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
Elidadi mwana wa Kisloni, kutoka kabila la Benyamini;
22 Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
Buki mwana wa Yogli, kiongozi kutoka kabila la Dani;
23 Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
Hanieli mwana wa Efodi, kiongozi kutoka kabila la Manase mwana wa Yosefu;
24 Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
Kemueli mwana wa Shiftani, kiongozi kutoka kabila la Efraimu mwana wa Yosefu;
25 Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
Elisafani mwana wa Parnaki, kiongozi kutoka kabila la Zabuloni;
26 Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
Paltieli mwana wa Azani, kiongozi kutoka kabila la Isakari;
27 Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
Ahihudi mwana wa Shelomi, kiongozi kutoka kabila la Asheri;
28 Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
Pedaheli mwana wa Amihudi, kiongozi kutoka kabila la Naftali.”
29 Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
Hawa ndio watu ambao Bwana aliamuru wagawanye urithi kwa Waisraeli katika nchi ya Kanaani.

< Ọnụọgụgụ 34 >