< Ọnụọgụgụ 34 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
耶和華曉諭摩西說:
2 “Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
「你吩咐以色列人說:你們到了迦南地,就是歸你們為業的迦南四境之地,
3 “‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
南角要從尋的曠野,貼着以東的邊界;南界要從鹽海東頭起,
4 gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
繞到亞克拉濱坡的南邊,接連到尋,直通到加低斯‧巴尼亞的南邊,又通到哈薩‧亞達,接連到押們,
5 ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
從押們轉到埃及小河,直通到海為止。
6 Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
「西邊要以大海為界;這就是你們的西界。
7 Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
「北界要從大海起,劃到何珥山,
8 Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
從何珥山劃到哈馬口,通到西達達,
9 ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
又通到西斐崙,直到哈薩‧以難。這要作你們的北界。
10 Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
「你們要從哈薩‧以難劃到示番為東界。
11 Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
這界要從示番下到亞延東邊的利比拉,又要達到基尼烈湖的東邊。
12 Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’”
這界要下到約旦河,通到鹽海為止。這四圍的邊界以內,要作你們的地。」
13 Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
摩西吩咐以色列人說:「這地就是耶和華吩咐拈鬮給九個半支派承受為業的;
14 Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
因為呂便支派和迦得支派按着宗族受了產業,瑪拿西半個支派也受了產業。
15 Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
這兩個半支派已經在耶利哥對面、約旦河東、向日出之地受了產業。」
16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
耶和華曉諭摩西說:
17 “Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
「要給你們分地為業之人的名字是祭司以利亞撒和嫩的兒子約書亞。
18 Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
又要從每支派中選一個首領幫助他們。
19 “Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
這些人的名字:猶大支派有耶孚尼的兒子迦勒。
20 Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
西緬支派有亞米忽的兒子示母利。
21 Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
便雅憫支派有基斯倫的兒子以利達。
22 Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
但支派有一個首領,約利的兒子布基。
23 Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
約瑟的子孫瑪拿西支派有一個首領,以弗的兒子漢聶。
24 Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
以法蓮支派有一個首領,拾弗但的兒子基母利。
25 Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
西布倫支派有一個首領,帕納的兒子以利撒番。
26 Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
以薩迦支派有一個首領,阿散的兒子帕鐵。
27 Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
亞設支派有一個首領,示羅米的兒子亞希忽。
28 Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
拿弗他利支派有一個首領,亞米忽的兒子比大黑。」
29 Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
這些人就是耶和華所吩咐、在迦南地把產業分給以色列人的。

< Ọnụọgụgụ 34 >