< Ọnụọgụgụ 32 >

1 Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.
Àwọn ọmọ Reubeni àti àwọn ọmọ Gadi, tí wọ́n ní ẹran ọ̀sìn àti ohun ọ̀sìn rí wí pé ilẹ̀ Jaseri àti Gileadi dára fún ohun ọ̀sìn.
2 Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,
Àwọn ọmọ Gadi àti àwọn ọmọ Reubeni sì wá, wọ́n wá sí ọ̀dọ̀ Mose àti Eleasari àlùfáà àti sí olórí gbogbo ìlú, wọ́n sì wí pé,
3 “Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,
“Atarotu, Diboni, Jaseri, Nimra, Heṣboni, Eleale, Sebamu, Nebo, àti Beoni.
4 bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.
Ni ilẹ̀ tí Olúwa ti ṣẹ́gun níwájú ìjọ Israẹli tí ó sì dára fún ohun ọ̀sìn, ṣáwọn ìránṣẹ́ rẹ̀ sì ní ohun ọ̀sìn.”
5 Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”
Wọ́n wí pé, “Tí a bá rí ojúrere rẹ, jẹ́ kí a fi ilẹ̀ yìí fún ìránṣẹ́ rẹ gẹ́gẹ́ bí ìní. Má ṣe jẹ́ kí a rékọjá odò Jordani.”
6 Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
Mose sọ fún àwọn ọmọ Gadi àti fún ọmọ Reubeni pé, “Ṣé kí àwọn arákùnrin yín lọ sí ogun, kí ẹ̀yin kí ó sì jókòó sí bí?
7 Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
Kí ni ó dé tí o fi mú ìrẹ̀wẹ̀sì bá àwọn ọmọ Israẹli láti lọ sí ibi ilẹ̀ tí Olúwa ti fi fún wọn?
8 Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
Èyí ni nǹkan tí baba yín ṣe nígbà tí mo rán wọn láti Kadeṣi-Barnea láti lọ wo ilẹ̀ náà.
9 Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
Lẹ́yìn ìgbà tí wọ́n lọ sí àfonífojì Eṣkolu tí wọ́n rí ilẹ̀ náà, wọ́n mú ìrẹ̀wẹ̀sì bá àwọn ọmọ Israẹli láti wọ ilẹ̀ tí Olúwa ti fi fún wọn.
10 Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
Ìbínú Olúwa sì dìde sí wọn ní ọjọ́ náà, ó sì búra, wí pé,
11 ‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
‘Nítorí wọn kò tẹ̀lé mi tọkàntọkàn, kì í ṣe ọ̀kan nínú àwọn ọkùnrin náà tí ó jẹ́ ogún ọdún tàbí jù bẹ́ẹ̀ lọ tí ó gòkè láti Ejibiti ni yóò rí ilẹ̀ tí mo pinnu gẹ́gẹ́ bí ìbúra fún Abrahamu, fún Isaaki àti fún Jakọbu:
12 Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
kò sí ẹnìkankan àyàfi Kalebu ọmọ Jefunne ti Kenissiti àti Joṣua ọmọ Nuni, nítorí wọ́n tẹ̀lé Olúwa tọkàntọkàn.’
13 Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
Ìbínú Olúwa ru sí àwọn ọmọ Israẹli ó sì mú wọn rìn ní aginjù fún ogójì ọdún, títí tí àwọn ìran tí wọ́n ṣe búburú ní ojú rẹ̀ fi lọ.
14 “Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
“Níbí ni ẹ̀yin wà, ẹ̀yin ẹlẹ́ṣẹ̀, ẹ̀yin dìde ní ipò baba yín, ẹ sì jẹ́ kí ìbínú gbígbóná Olúwa ru sí Israẹli.
15 Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
Tí ẹ̀yin bá yípadà ní ẹ̀yìn rẹ̀ yóò sì fi àwọn ènìyàn wọ̀nyí sílẹ̀ ní aginjù, ìwọ yóò sì mú un ṣe ìparun.”
16 Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
Nígbà náà wọ́n wá sí òkè ní ọ̀dọ̀ rẹ̀, “Àwa yóò fẹ́ láti kọ́ ilé ẹran níhìn-ín yìí fún ohun ọ̀sìn wa, àti ìlú fún àwọn obìnrin àti ọmọ wẹ́wẹ́ wa.
17 Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.
Ṣùgbọ́n àwa ṣetán láti dira ogun ṣáájú àwọn ọmọ Israẹli títí tí a yóò fi mú wọn dé ọ̀dọ̀ wọn lákokò yìí, àwọn obìnrin àti ọmọ wẹ́wẹ́ wa yóò gbé inú ìlú tí a mọ odi sí fún ìdáàbòbò wọn lọ́wọ́ olùgbé ilẹ̀ náà.
18 Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.
A kì yóò padà sí ilẹ̀ wa láìṣe pé gbogbo àwọn ọmọ Israẹli ti gba ogún wọn.
19 Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
A kì yóò gba ogún kankan pẹ̀lú wọn ní òdìkejì Jordani, nítorí ogún ti wa, ti wá sí ọ̀dọ̀ wa ní ìhà ìlà-oòrùn Jordani.”
20 Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.
Nígbà náà ni Mose sọ fún wọn pé, “Tí ẹ̀yin yóò bá pa ara yín lára, níwájú Olúwa fún ogún.
21 Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
Bí gbogbo yín yóò bá lọ sí Jordani ní ìhámọ́ra níwájú Olúwa, títí yóò fi lé àwọn ọ̀tá rẹ̀ kúrò níwájú rẹ̀.
22 mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
Tí a ó sì fi ṣe ilẹ̀ náà níwájú Olúwa; ẹ̀yin lè padà tí yóò sì di òmìnira lọ́wọ́ ìdè níwájú Olúwa àti Israẹli. Ilẹ̀ yìí yóò sì jẹ́ tiyín níwájú Olúwa.
23 “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
“Ṣùgbọ́n tí ẹ̀yin bá kọ̀ láti ṣe èyí, ẹ̀yin yóò máa dẹ́ṣẹ̀ sí Olúwa; kí ẹ̀yin kí ó sì mọ̀ dájú pé ẹ̀ṣẹ̀ yín yóò fi yín hàn.
24 Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
Ẹ kọ́ ilé fún àwọn obìnrin yín àti ọmọ wẹ́wẹ́ yín, àti ilé fún agbo ẹran yín, ṣùgbọ́n kí ẹ̀yin kí ó ṣe ohun tí ẹ ti pinnu.”
25 Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Àwọn ọmọ Gadi àti ọmọ Reubeni sọ fún Mose pé, “Àwa ìránṣẹ́ rẹ yóò ṣe gẹ́gẹ́ bí olúwa wa ti pàṣẹ.
26 Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
Àwọn ọmọ wa àti ìyàwó wa, àwọn agbo ẹran àti ohun ọ̀sìn wa yóò dúró ní ìlú Gileadi.
27 Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
Ṣùgbọ́n àwọn ìránṣẹ́ rẹ, gbogbo ọkùnrin tí ó wọ ìhámọ́ra ogun, yóò rékọjá lọ láti jà níwájú Olúwa; gẹ́gẹ́ bí olúwa wa ti sọ.”
28 Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha,
Nígbà náà ni Mose pàṣẹ nípa wọn fún Eleasari àlùfáà àti Joṣua ọmọ Nuni àti sí gbogbo olórí ìdílé ẹ̀yà Israẹli.
29 Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
Mose sì wí fún wọn pé, “Tí àwọn ọmọ Gadi àti ọmọ Reubeni, gbogbo ọkùnrin tí ó wọ ìhámọ́ra fún ogun rékọjá odò Jordani pẹ̀lú níwájú Olúwa, nígbà tí ẹ ṣẹ́gun ilẹ̀ náà níwájú yín, fún wọn ní ilẹ̀ Gileadi gẹ́gẹ́ bí ìní wọn.
30 Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.”
Ṣùgbọ́n tí wọn kò bá fẹ́ bá yín rékọjá pẹ̀lú ìhámọ́ra, wọn gbọdọ̀ gba ìní wọn pẹ̀lú yín ní Kenaani.”
31 Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
Àwọn ọmọ Gadi àti ọmọ Reubeni dáhùn pé, “Ìránṣẹ́ rẹ yóò ṣe ohun tí Olúwa ti sọ.
32 Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”
A máa rékọjá níwájú Olúwa lọ sí Kenaani pẹ̀lú ìhámọ́ra, ṣùgbọ́n ẹrù tí a jogún yóò wà ní ẹ̀bá Jordani.”
33 Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
Nígbà náà Mose fún àwọn ọmọ Gadi àti àwọn ọmọ Reubeni àti ààbọ̀ ẹ̀yà Manase ọmọ Josẹfu ní ilẹ̀ ọba Sihoni ọba àwọn ọmọ Amori àti ilẹ̀ ọba Ogu ọba Baṣani ní gbogbo ilẹ̀ náà pẹ̀lú ìlú rẹ̀ àti agbègbè tí ó yí i ka.
34 Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea
Àwọn ará Gadi wọ́n kọ́ Diboni, Atarotu, Aroeri;
35 Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,
pẹ̀lú Atrotu Ṣofani, Jaseri, àti Jogbeha,
36 Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
pẹ̀lú Beti-Nimra, àti Beti-Harani ìlú olódi, àti agbo fún àgùntàn.
37 Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
Àwọn ọmọ Reubeni sì kọ́ Heṣboni, Eleale, Kiriataimu,
38 Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
pẹ̀lú Nebo pẹ̀lú Baali-Meoni (wọ́n pàrọ̀ orúkọ wọn) àti Sibma. Wọ́n sì sọ ìlú tí wọ́n tún kọ́ ní orúkọ mìíràn.
39 Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
Àwọn ọmọ Makiri ọmọ Manase lọ sí Gileadi, wọ́n sì lé àwọn ọmọ Amori tí ó wà níbẹ̀.
40 Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
Mose sì fi àwọn ọmọ Gileadi fún àwọn ọmọ Makiri àwọn ìran Manase, wọ́n sì tẹ̀dó síbẹ̀.
41 Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
Jairi, ọmọ Manase gba ibùjókòó wọn, ó sì pè wọ́n ní Haffotu Jairi.
42 Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
Noba gba Kenati àti àwọn ìtẹ̀dó rẹ̀, ó sì pè é ní Noba lẹ́yìn orúkọ ara rẹ̀.

< Ọnụọgụgụ 32 >