< Ọnụọgụgụ 31 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
And the Lord spoke to Moses, saying,
2 “Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”
Avenge the wrongs of the children of Israel on the Madianites, and afterwards you shall be added to your people.
3 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.
And Moses spoke to the people, saying, Arm some of you, and set yourselves in array before the Lord against Madian, to inflict vengeance on Madian from the Lord.
4 Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”
Send a thousand of each tribe from all the tribes of the children of Israel to set themselves in array.
5 Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.
And they numbered of the thousands of Israel a thousand of [each] tribe, twelve thousands; [these were] armed for war.
6 Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.
And Moses sent them away a thousand of every tribe with their forces, and Phinees the son of Eleazar the son of Aaron the priest: and the holy instruments, and the signal trumpets [were] in their hands.
7 Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.
And they set themselves in array against Madian, as the Lord commanded Moses; and they killed every male.
8 Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.
And they killed the kings of Madian together with their slain [subjects]; even Evi and Rocon, and Sur, and Ur, and Roboc, five kings of Madian; and they killed with the sword Balaam the son of Beor with their [other] slain.
9 Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
And they made a prey of the women of Madian, and their store, and their cattle, and all their possessions: and they spoiled their forces.
10 Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
And they burnt with fire all their cities in the places of their habitation and they burnt their villages with fire.
11 Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.
And they took all their plunder, and all their spoils, both man and beast.
12 Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.
And they brought to Moses and to Eleazar the priest, and to all the children of Israel, the captives, and the spoils, and the plunder, to the camp to Araboth Moab, which is at Jordan by Jericho.
13 Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
And Moses and Eleazar the priest and all the rulers of the synagogue went forth out of the camp to meet them.
14 Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.
And Moses was angry with the captains of the host, the heads of thousands and the heads of hundreds who came from the battle-array.
15 Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ?
And Moses said to them, Why have you saved every female alive?
16 Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.
For they were [the occasion] to the children of Israel by the word of Balaam of their revolting and despising the word of the Lord, because of Phogor; and there was a plague in the congregation of the Lord.
17 Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke.
Now then kill every male in all the spoil, kill every woman, who has known the lying with man.
18 Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.
And as for all the captivity of women, who have not known the lying with man, save you them alive.
19 “Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.
And you shall encamp outside the [great] camp seven days; every one who has slain and who touches a dead body, shall be purified on the third day, and you and your captivity [shall purify yourselves] on the seventh day.
20 Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”
And you shall purify every garment and every leather utensil, and all furniture of goat skin, and every wooden vessel.
21 Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
And Eleazar the priest said to the men of the host that came from the battle-array, This [is] the ordinance of the law which the Lord has commanded Moses.
22 Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,
Beside the gold, and the silver, and the brass, and the iron, and lead, and tin,
23 na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
every thing that shall pass through the fire shall so be clean, nevertheless it shall be purified with the water of sanctification; and whatever will not pass through the fire shall pass through water.
24 Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”
And on the seventh day you shall wash your garments, and be clean; and afterwards you shall come into the camp.
25 Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
And the Lord spoke to Moses, saying,
26 “Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
Take the sum of the spoils of the captivity both of man and beast, you and Eleazar the priest, and the heads of the families of the congregation.
27 Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
And you shall divide the spoils between the warriors that went out to battle, and the whole congregation.
28 Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.
And you shall take a tribute for the Lord from the warriors that went out to battle; one soul out of five hundred, from the men, and from the cattle, even from the oxen, and from the sheep, and from the asses; and you shall take from their half.
29 Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.
And you shall give [them] to Eleazar the priest [as] the first fruits of the Lord.
30 Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”
And from the half belonging to the children of Israel you shall take one in fifty from the men, and from the oxen, and from the sheep, and from the asses, and from all the cattle; and you shall give them to the Levites that keep the charges in the tabernacle of the Lord.
31 Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu.
And Moses and Eleazar the priest did as the Lord commanded Moses.
32 Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise,
And that which remained of the spoil which the warriors took, was—of the sheep, six hundred and seventy-five thousand:
33 Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ,
and oxen, seventy-two thousand:
34 ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku,
and asses, sixty-one thousand.
35 Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ.
And persons of women who had not known lying with man, all the souls, thirty-two thousand.
36 Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise.
And the half, [even] the portion of them that went out to war, from the number of the sheep, was three hundred and thirty-seven thousand and five hundred.
37 Nʼime ya, ụtụ e nyere Onyenwe anyị site nʼigwe atụrụ ahụ dị narị isii na iri asaa na ise.
And the tribute to the Lord from the sheep was six hundred and seventy-five.
38 Igwe ehi dị iri puku atọ na puku isii. Nʼime ya, ihe e nyere Onyenwe anyị bụ iri asaa na abụọ.
And the oxen, six and thirty thousand, and the tribute to the Lord seventy-two.
39 Ịnyịnya ibu dị iri puku atọ na narị ise. Nke e nyere Onyenwe anyị bụ iri isii na otu.
And asses, thirty thousand and five hundred, and the tribute to the Lord, sixty-one:
40 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii. Ndị e nyere Onyenwe anyị dị iri atọ na abụọ.
and the persons, sixteen thousand, and the tribute of them to the Lord, thirty-two souls.
41 Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
And Moses gave the tribute to the Lord, the heave-offering of God, to Eleazar the priest, as the Lord commanded Moses;
42 Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.
from the half belonging to the children of Israel, whom Moses separated from the men of war.
43 Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise,
And the half [taken] from the sheep, belonging to the congregation, was three hundred and thirty-seven thousand and five hundred.
44 igwe ehi, iri puku atọ na isii,
And the oxen, thirty-six thousand;
45 ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise,
asses, thirty thousand and five hundred;
46 ụmụ agbọghọ, puku iri na isii.
and persons, sixteen thousand.
47 Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị mmadụ na anụ ụlọ ndị a.
And Moses took of the half belonging to the children of Israel the fifties part, of men and of cattle, and he gave them to the Levites who keep the charges of the tabernacle of the Lord, as the Lord commanded Moses.
48 Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis,
And all those who were appointed to be officers of thousands of the host, captains of thousands and captains of hundreds, approached Moses, and said to Moses,
49 sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
Your servants have taken the sum of the men of war with us, and not one is missing.
50 Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
And we have brought our gift to the Lord, [every] man who has found an article of gold, whether an armlet, or a chain, or a ring, or a bracelet, or a clasp for hair, to make atonement for us before the Lord.
51 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.
And Moses and Eleazar the priest took the gold from them, even every wrought article.
52 Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.
And all the wrought gold, even the offering that they offered to the Lord, was sixteen thousand and seven hundred and fifty shekels from the captains of thousands and the captains of hundreds.
53 Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.
For the men of war took plunder every one for himself.
54 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe ncheta nye Onyenwe anyị nʼihi ndị Izrel niile.
And Moses and Eleazar the priest took the gold from the captains of thousands and captains of hundreds, and brought the vessels into the tabernacle of witness, a memorial of the children of Israel before the Lord.

< Ọnụọgụgụ 31 >