< Ọnụọgụgụ 3 >

1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị.
These are the generations of Aaron and Moses in the day that the Lord spoke to Moses in mount Sinai.
2 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama.
And these the names of the sons of Aaron: his firstborn Nadab, then Abiu, and Eleazar, and Ithamar.
3 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja.
These the names of the sons of Aaron the priests that were anointed, and whose hands were filled and consecrated, to do the functions of priesthood.
4 Ma Onyenwe anyị mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn.
Now Nadab and Abiu died, without children, when they offered strange fire before the Lord, in the desert of Sinai: and Eleazar and Ithamar performed the priestly office in the presence of Aaron their father.
5 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
And the Lord spoke to Moses, saying:
6 “Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.
Bring the tribe of Levi, and make them stand in the sight of Aaron the priest to minister to him, and let them watch,
7 Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.
And observe whatsoever appertaineth to the service of the multitude before the tabernacle of the testimony,
8 Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ.
And let them keep the vessels of the tabernacle, serving in the ministry thereof.
9 Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.
And thou shalt give the Levites for a gift,
10 Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.”
To Aaron and to his sons, to whom they are delivered by the children of Israel. But thou shalt appoint Aaron and his sons over the service of priesthood. The stranger that approacheth to minister, shall be put to death.
11 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
And the Lord spoke to Moses, saying:
12 “Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
I have taken the Levites from the children of Israel, for every firstborn that openeth the womb among the children of Israel, and the Levites shall be mine.
13 Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
For every firstborn is mine: since I struck the firstborn in the land of Egypt: I have sanctified to myself whatsoever is firstborn in Israel both of man and beast, they are mine: I am the Lord.
14 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya,
And the Lord spoke to Moses in the desert of Sinai, saying:
15 “Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
Number the sons of Levi by the houses of their fathers and their families, every male from one month and upward.
16 Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
Moses numbered them as the Lord had commanded.
17 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị: Geshọn, Kohat na Merari.
And there were found sons of Levi by their names, Gerson and Caath and Merari.
18 Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị: Libni na Shimei.
The sons of Gerson: Lebni and Semei.
19 Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị: Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
The sons of Caath: Amram, and Jesaar, Hebron and Oziel:
20 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.
The sons of Merari: Moholi and Musi.
21 Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn.
Of Gerson were two families, the Lebnites, and the Semeites:
22 Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise.
Of which were numbered, people of the male sex from one month and upward, seven thousand five hundred.
23 Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
These shall pitch behind the tabernacle on the west,
24 Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.
Under their prince Eliasaph the son of Lael.
25 Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute.
And their charge shall be in the tabernacle of the covenant:
26 Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.
The tabernacle itself and the cover thereof, the hanging that is drawn before the doors of the tabernacle of the covenant, and the curtains of the court: the hanging also that is hanged in the entry of the court of the tabernacle, and whatsoever belongeth to the rite of the altar, the cords of the tabernacle, and all the furniture thereof.
27 Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.
Of the kindred of Caath come the families of the Amramites and Jesaarites and Hebronites and Ozielites. These are the families of the Caathites reckoned up by their names:
28 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii. Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.
All of the male sex from one month and upward, eight thousand six hundred: they shall have the guard of the sanctuary,
29 Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.
And shall camp on the south side.
30 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
And their prince shall be Elisaphan the son of Oziel:
31 Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.
And they shall keep the ark, and the table and the candlestick, the altars, and the vessels of the sanctuary, wherewith they minister, and the veil, and all the furniture of this kind.
32 Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ.
And the prince of the princes of the Levites, Eleazar, the son of Aaron the priest, shall be over them that watch for the guard of the sanctuary.
33 Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.
And of Merari are the families of the Moholites, and Musites, reckoned up by their names:
34 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ.
All of the male kind from one month and upward, six thousand two hundred.
35 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.
Their prince Suriel the son of Abihaiel: they shall camp on the north side.
36 Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha.
Under their custody shall be the boards of the tabernacle, and the bars, and the pillars and their sockets, and all things that pertain to this kind of service:
37 Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.
And the pillars of the court round about with their sockets, and the pins with their cords.
38 Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.
Before the tabernacle of the covenant, that is to say on the east side, shall Moses and Aaron camp, with their sons, having the custody of the sanctuary, in the midst of the children of Israel. What stranger soever cometh unto it, shall be put to death.
39 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ. Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.
All the Levites, that Moses and Aaron numbered according to the precept of the Lord, by their families, of the male kind from one month and upward, were twenty-two thousand.
40 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.
And the Lord said to Moses: Number the firstborn of the male sex of the children of Israel, from one month and upward, and thou shalt take the sum of them.
41 Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”
And thou shalt take the Levites to me for all the firstborn of the children of Israel, I am the Lord: and their cattle for all the firstborn of the cattle of the children of Israel:
42 Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu,
Moses reckoned up, as the Lord had commanded, the firstborn of the children of Israel:
43 chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ.
And the males by their names, from one month and upward, were twenty-two thousand two hundred and seventy-three.
44 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị:
And the Lord spoke to Moses, saving:
45 “Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Take the Levites for the firstborn of the children of Israel, and the cattle of the Levites for their cattle, and the Levites shall be mine. I am the Lord.
46 Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị
But for the price of the two hundred and seventy-three, of the firstborn of the children of Israel, that exceed the number of the Levites,
47 bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.
Thou shalt take five sides for every head, according to the weight of the sanctuary. A sicle hath twenty obols.
48 Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”
And then shalt give the money to Aaron and his sons, the price of them that are above.
49 Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.
Moses therefore took the money of them that were above, and whom they had redeemed from the Levites,
50 Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
For the firstborn of the children of Israel, one thousand three hundred and sixty-five sicles, according to the weight of the sanctuary,
51 Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
And gave it to Aaron and his sons, according to the word that the Lord had commanded him.

< Ọnụọgụgụ 3 >