< Ọnụọgụgụ 29 >

1 “‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
ובחדש השביעי באחד לחדש מקרא קדש יהיה לכם--כל מלאכת עבדה לא תעשו יום תרועה יהיה לכם
2 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
ועשיתם עלה לריח ניחח ליהוה--פר בן בקר אחד איל אחד כבשים בני שנה שבעה תמימם
3 Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
ומנחתם--סלת בלולה בשמן שלשה עשרנים לפר שני עשרנים לאיל
4 na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
ועשרון אחד לכבש האחד לשבעת הכבשים
5 Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
ושעיר עזים אחד חטאת לכפר עליכם
6 Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
מלבד עלת החדש ומנחתה ועלת התמיד ומנחתה ונסכיהם כמשפטם לריח ניחח אשה ליהוה
7 “‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
ובעשור לחדש השביעי הזה מקרא קדש יהיה לכם ועניתם את נפשתיכם כל מלאכה לא תעשו
8 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
והקרבתם עלה ליהוה ריח ניחח פר בן בקר אחד איל אחד כבשים בני שנה שבעה תמימם יהיו לכם
9 Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
ומנחתם--סלת בלולה בשמן שלשה עשרנים לפר שני עשרנים לאיל האחד
10 jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
עשרון עשרון לכבש האחד--לשבעת הכבשים
11 Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
שעיר עזים אחד חטאת מלבד חטאת הכפרים ועלת התמיד ומנחתה ונסכיהם
12 “‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
ובחמשה עשר יום לחדש השביעי מקרא קדש יהיה לכם--כל מלאכת עבדה לא תעשו וחגתם חג ליהוה שבעת ימים
13 Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
והקרבתם עלה אשה ריח ניחח ליהוה--פרים בני בקר שלשה עשר אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם יהיו
14 A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
ומנחתם--סלת בלולה בשמן שלשה עשרנים לפר האחד לשלשה עשר פרים שני עשרנים לאיל האחד לשני האילם
15 ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
ועשרון עשרון לכבש האחד--לארבעה עשר כבשים
16 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר עזים אחד חטאת מלבד עלת התמיד מנחתה ונסכה
17 “‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
וביום השני פרים בני בקר שנים עשר--אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
18 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
ומנחתם ונסכיהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפט
19 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר עזים אחד חטאת מלבד עלת התמיד ומנחתה ונסכיהם
20 “‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
וביום השלישי פרים עשתי עשר אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
21 Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
ומנחתם ונסכיהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפט
22 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר חטאת אחד מלבד עלת התמיד ומנחתה ונסכה
23 “‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
וביום הרביעי פרים עשרה אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
24 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
מנחתם ונסכיהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפט
25 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר עזים אחד חטאת מלבד עלת התמיד מנחתה ונסכה
26 “‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
וביום החמישי פרים תשעה אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
27 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
ומנחתם ונסכיהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפט
28 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר חטאת אחד מלבד עלת התמיד ומנחתה ונסכה
29 “‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
וביום הששי פרים שמנה אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
30 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
ומנחתם ונסכיהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפט
31 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר חטאת אחד מלבד עלת התמיד מנחתה ונסכיה
32 “‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
וביום השביעי פרים שבעה אילם שנים כבשים בני שנה ארבעה עשר תמימם
33 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
ומנחתם ונסכהם לפרים לאילם ולכבשים במספרם--כמשפטם
34 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר חטאת אחד מלבד עלת התמיד מנחתה ונסכה
35 “‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
ביום השמיני--עצרת תהיה לכם כל מלאכת עבדה לא תעשו
36 Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
והקרבתם עלה אשה ריח ניחח ליהוה--פר אחד איל אחד כבשים בני שנה שבעה תמימם
37 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
מנחתם ונסכיהם לפר לאיל ולכבשים במספרם--כמשפט
38 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
ושעיר חטאת אחד מלבד עלת התמיד ומנחתה ונסכה
39 “‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’”
אלה תעשו ליהוה במועדיכם--לבד מנדריכם ונדבתיכם לעלתיכם ולמנחתיכם ולנסכיכם ולשלמיכם
40 Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.
ויאמר משה אל בני ישראל ככל אשר צוה יהוה את משה

< Ọnụọgụgụ 29 >