< Ọnụọgụgụ 29 >

1 “‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
“‘A rana ta farko ga wata na bakwai, a yi tsattsarkan taro, kada kuma a yi aikin da aka saba na kullum. Rana ce don busa ƙahoni.
2 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
Za a miƙa hadaya ta ƙonawa da bijimi guda, rago guda,’yan raguna bakwai, bana ɗaya-ɗaya don daɗin ƙanshi ga Ubangiji, duka su kasance marasa lahani.
3 Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
Tare da bijimin za a kuma miƙa hadaya ta gari na kashi ɗaya bisa goma na efa na lallausan gari, kwaɓaɓɓe da mai; da rago guda, kashi biyu bisa goma na efa na lallausan gari, kwaɓaɓɓe da mai;
4 na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
kowane’yan raguna bakwai, kashi ɗaya bisa goma.
5 Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, don yin muku kafara.
6 Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
Waɗannan ƙari ne ga hadayun ƙonawa na wata-wata da na kullayaumi, tare da hadayun garinsu da hadayun sha yadda aka tsara. Hadayu ne da aka miƙa wa Ubangiji ta wuta don daɗin ƙanshi.
7 “‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
“‘A rana ta goma ga wannan watan bakwai, za a yi tsattsarkan taro. Ba za ku ci abinci ba, ba kuma za ku yi aiki ba.
8 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
Za a miƙa hadaya ta ƙonawa da bijimi guda, rago guda, da kuma’yan raguna bakwai,’yan bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani don daɗin ƙanshi ga Ubangiji.
9 Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
Tare da bijimin a miƙa hadaya ta gari na kashi ɗaya bisa goma na efa, na lallausan gari kwaɓaɓɓe, da mai; da rago guda, kashi biyu bisa goma na efa, na lallausan gari kwaɓaɓɓe, da mai;
10 jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
kowane’yan raguna bakwai, kashi ɗaya bisa goma.
11 Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, don yin muku kafara da kuma hadaya ta ƙonawa ta kullum; tare da hadaya ta garinta, da kuma hadayu na shansu.
12 “‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
“‘A rana ta goma sha biyar ga wata na bakwai, za a yi tsattsarkan taro, ba kuwa za a yi aikin da aka saba yi ba. Ku yi biki ga Ubangiji har kwana bakwai.
13 Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
A miƙa hadayar da aka yi da wuta, mai daɗin ƙanshi ga Ubangiji, hadaya ta ƙonawa ta bijimai guda sha uku, raguna biyu, da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
14 A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
Da kowane bijimai goma sha uku nan, a miƙa hadaya ta gari, kashi uku bisa goma na efa, kwaɓaɓɓe da mai; da ragunan biyu ɗin, a miƙa hadaya ta gari kashi biyu bisa goma na efa, kwaɓaɓɓe da mai;
15 ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
tare kuma da kowane’yan raguna goma sha huɗu, kashi ɗaya bisa goma.
16 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda, a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa na kullum tare da hadayarta, ta gari da kuma hadaya ta sha.
17 “‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
“‘A rana ta biyu, a miƙa bijimai goma sha biyu, raguna biyu, da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
18 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da’yan ragunan a miƙa hadayarsu da gari da hadaya ta sha, bisa ga adadin da aka ƙayyade.
19 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya, don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum, tare da hadayarta ta gari da hadayunsu ta sha.
20 “‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
“‘A rana ta uku za a miƙa bijimai goma sha ɗaya, raguna biyu, da kuma’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
21 Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da’yan raguna, a miƙa hadayun gari da hadayun sha, bisa ga adadin da aka ƙayyade.
22 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum, tare da hadayarta ta gari da hadaya ta sha.
23 “‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
“‘A rana ta huɗu a miƙa bijimai goma, raguna biyu, da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
24 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da kuma’yan raguna, a miƙa hadayunsu na gari da hadayu na sha bisa ga adadin da aka ƙayyade.
25 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda, a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum, tare da hadayarta ta gari da hadaya ta sha.
26 “‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
“‘A rana ta biyar a miƙa bijimai tara, raguna biyu, da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
27 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da kuma’yan ragunan, a miƙa hadayu na gari, da hadayu na sha bisa ga adadin da aka ƙayyade.
28 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum, tare da hadayarta ta gari da hadaya ta sha.
29 “‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
“‘A rana ta shida a miƙa bijimai takwas, raguna biyu, da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
30 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da kuma’yan raguna, a miƙa hadayunsu ta gari da hadayu na sha bisa adadin da a ƙayyade.
31 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum tare da hadayarta ta hatsi da hadaya ta sha.
32 “‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
“‘A rana ta bakwai a miƙa bijimai bakwai, raguna biyu da’yan raguna goma sha huɗu, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
33 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijiman, ragunan da kuma’yan raguna, a miƙa hadayunsu na gari, da hadayun sha bisa ga adadin da a ƙayyade.
34 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum tare da hadayarta ta hatsi da hadayarta ta sha.
35 “‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
“‘A rana ta takwas kuwa za a yi tsattsarkan taro, ban da aikin da aka saba.
36 Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
A miƙa hadayar da aka yi da wuta mai daɗin ƙanshi ga Ubangiji, a yi hadaya ta ƙonawa da bijimi guda, rago guda, da’yan raguna bakwai, bana ɗaya-ɗaya, dukansu marasa lahani.
37 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
Tare da bijimin, ragon da kuma’yan ragunan, a miƙa hadayunsu na gari da hadayu na sha bisa ga adadin da aka ƙayyade.
38 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
A haɗa da bunsuru guda a matsayin hadaya don zunubi, ban da hadaya ta ƙonawa ta kullum, tare da hadayarta ta hatsi da hadayarta ta sha.
39 “‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’”
“‘Ban da abin da kuka yi alkawari, da kuma sadakokinku na yardar rai, a miƙa waɗannan ga Ubangiji a lokacin bukukkuwanku, hadayunku na ƙonawa, hadayu na gari, hadayu na sha da hadayu na salama.’”
40 Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.
Musa ya faɗa wa Isra’ilawa dukan abin da Ubangiji ya umarce shi.

< Ọnụọgụgụ 29 >