< Ọnụọgụgụ 27 >
1 Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,
Amadodakazi kaZelofehadi indodana kaHeferi, indodana kaGiliyadi, indodana kaMakhiri, indodana kaManase babengabezinsendo zikaManase indodana kaJosefa. Amabizo alawomadodakazi ayenguMahila, uNowa, uHogila, uMilikha, loThiza. Aya
2 nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
esangweni leThente lokuHlangana ema phambi kukaMosi lo-Eliyazari umphristi, abakhokheli kanye lebandla lonke, athi,
3 “Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
“Ubaba wafela enkangala. Wayengekho phakathi kwabalandeli bakaKhora, bona ababambana ekuphikiseni kwabo uThixo, kodwa wafela isono sakhe njalo katshiyanga madodana.
4 Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
Kungani ibizo likababa licitsha kwabosendo lwakhe ngokungabi lendodana na? Sipheni ilifa lethu lathi ezihlotsheni zikababa.”
5 Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
Ngakho uMosi wethula indaba yawo phambi kukaThixo,
6 Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
uThixo wathi kuye,
7 “Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
“Lokho okutshiwo ngamadodakazi kaZelofehadi kuqondile. Kufanele ubaphe isabelo sabo selifa ezihlotsheni zikayise njalo ubaphe ilifa likayise.
8 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
Tshono uthi kwabako-Israyeli, ‘Nxa indoda ife ingelandodana, ilifa layo kaliphiwe indodakazi yayo.
9 Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
Nxa ingelandodakazi, ilifa layo kaliphiwe abafowabo.
10 A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.
Nxa ingelabafowabo ilifa layo kaliphiwe abafowabo bakayise.
11 Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’”
Nxa uyise engelabafowabo, ilifa layo kaliphiwe oyisihlobo esiseduze kwabosendo lwayo, ukuze libe ngelakhe. Lokho kumele kube ngumthetho oyisimiso kwabako-Israyeli, njengokulaywa kukaMosi nguThixo.’”
12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
UThixo wasesithi kuMosi, “Khwela entabeni le yase-Abharimi ukuze ubone ilizwe engilinike abako-Israyeli.
13 Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
Ngemva kokuba usulibonile, lawe uzalandela abakini, ufe njengomfowenu u-Aroni,
14 Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
ngoba ekuhlamukeni kwabantu emanzini asenkangala yaseZini, lina lobabili kalilandelanga ukulaya kwami, ukungidumisa ngobungcwele bami emehlweni abo.” (La ayengamanzi aseMeribha Khadeshi, enkangala yaseZini.)
15 Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
UMosi wathi kuThixo,
16 “Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
“Akuthi uThixo, uNkulunkulu wemimoya yabantu bonke akhethe indoda ezakhokhela abantu laba
17 Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
ekuphumeni lasekungeneni, lowo ozabakhokhela ekuphumeni lekungeneni kwabo, ukuze abantu bakaThixo bangafanani lezimvu ezingelamelusi.”
18 Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
Ngakho uThixo wathi kuMosi, “Thatha uJoshuwa indodana kaNuni, indoda elomoya wobukhokheli, ubeke isandla sakho phezu kwayo.
19 Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
Umise phambi kuka-Eliyazari umphristi laphambi kwebandla lonke ubusumbeka esikhundleni phambi kwabo.
20 Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
Umnike ingxenye yamandla akho ukuze isizwe sonke sako-Israyeli simlalele.
21 Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
Kumele ame phambi kuka-Eliyazari umphristi, yena ozamtholela izinqumo ngokubuza i-Urimi phambi kukaThixo. Ngokulawula kwakhe yena kanye labantu bonke bako-Israyeli bazaphuma, kuthi njalo ngokulawula kwakhe bangene.”
22 Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
UMosi wenza njengokulaywa kwakhe nguThixo. Wathatha uJoshuwa wamisa phambi kuka-Eliyazari umphristi kanye laphambi kwebandla lonke.
23 Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Wasebeka izandla zakhe phezu kwakhe embeka esikhundleni, njengokulaya kukaThixo ngoMosi.