< Ọnụọgụgụ 26 >
1 Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha,
After the plague [ended], Yahweh said to Eleazar and Moses/me,
2 “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”
“Count all the people of Israel [again]. Write down the names of all the men who are at least 20 years old who are able to fight [in battles], along with their family names.”
3 Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,
So while the Israelis were on the plains where the Moab people-group lived, Eleazar and Moses/I told this to the Israeli leaders:
4 “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
“Write down the names of all the Israeli men who are at least 20 years old, as Yahweh has commanded us.” [So they did that], and this is a record of all the descendants of Jacob who came out of Egypt [who were still alive].
5 Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,
[They counted] 43,730 men from the tribe of Reuben, Jacob’s oldest son. They were in clans descended from Hanoch, Pallu, Hezron, and Carmi.
6 site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami
7 Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ.
9 ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị.
and his grandsons were Nemuel, Dathan and Abiram. Dathan and Abiram were the leaders who joined with Korah to conspire against Aaron and Moses/me and rebelled against Yahweh.
10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.
But the earth opened up and swallowed them and Korah. Yahweh also sent a fire that burned up 250 men who supported those three men. That was a warning [to all the Israeli people] that they should respect and obey the leaders whom Yahweh had appointed.
11 Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
But the descendants of Korah did not die [on that day].
12 Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ, site na Nemuel, ikwu Nemuel, site na Jamin, ikwu Jamin, site na Jakin, ikwu Jakin,
The Israeli leaders counted 22,200 men from the tribe of Simeon. They were in clans descended from Nemuel, Jamin, Jakin, Zerah, and Shaul.
13 Site na Zera, ikwu Zera, site na Shaul, ikwu Shaul.
14 Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ.
15 Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Zefọn, site na Zefọn, ikwu Hagi, site na Hagi, ikwu Shuni, site na Shuni,
They counted 40,500 men from the tribe of Gad. They were in clans descended from Zephon, Haggi, Shuni, Ozni, Eri, Arod, and Areli.
16 ikwu Ozni, site na Ozni, ikwu Eri, site na Eri,
17 ikwu Arodi, site na Arodi, ikwu Areli, site na Areli,
18 Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise.
19 Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.
They counted 76,500 men from the tribe of Judah. They were in clans descended from Shelah, Perez, Zerah, Hezron, and Hamul. Judah’s other two sons, Er and Onan, died in Canaan [without having had any children].
20 Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a: ikwu Shela, site na Shela, ikwu Perez, site na Perez, ikwu Zera, site na Zera.
21 Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
22 Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise.
23 Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua
They counted 64,300 men from the tribe of Issachar. They were in clans descended from Tola, Puvah, Jashub, and Shimron.
24 ikwu Jashub, site na Jashub, ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn.
25 Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ.
26 Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ndị Sered, site nʼikwu Sered, ndị Elọn, site nʼikwu Elọn, ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil.
They counted 60,500 men from the tribe of Zebulun. They were in clans descended from Sered, Elon, and Jahleel.
27 Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise.
28 Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
They counted 52,700 men from the tribe of Manasseh, who was one of the sons of Joseph. They were in clans descended from Machir, from his son Gilead, and from his six grandsons—Jezer, Helek, Asriel, Shechem, Shemida, and Hepher. Hepher’s son Zelophehad did not have any sons, but he had five daughters—Mahlah, Noah, Hoglah, Milcah, and Tirzah.
29 Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.
30 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead: ikwu Leza, site na Leza, ikwu Helek, site na Helek.
31 Ikwu Asriel, site na Asriel. Ikwu Shekem, site na Shekem.
32 Ikwu Shemida, site na Shemida, ikwu Hefa, site na Hefa.
33 (Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)
34 Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa.
35 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: ikwu Shutela site na Shutela, ikwu Beka site na Beka, ikwu Tahan site na Tahan.
They counted 32,500 men from the tribe of Ephraim, who was Joseph’s other son. They were in clans descended from Shuthelah, Becher, Tahan, and Shuthelah’s son Eran.
36 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela: ikwu Eran site na Eran.
37 Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Josef dịka ikwu ha si dị.
38 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị: ikwu Bela site na Bela, ikwu Ashbel site Ashbel, ikwu Ahiram site na Ahiram.
They counted 45,600 men from the tribe of Benjamin. They were in clans descended from Bela, Ashbel, Ahiram, Shephupham, and Hupham, and from Bela’s two sons—Ard and Naaman.
39 Ikwu Shufam site na Shufam, ikwu Hufam site na Hufam.
40 Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ, ikwu Aad site na Aad, ikwu Neeman site na Neeman.
41 Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii.
42 Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Shuham, site na Shuham. Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan.
They counted 64,400 men from the tribe of Dan. They were in one clan descended from Shuham.
43 Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ.
44 Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Imna site na Imna, ikwu Ishvi, site na Ishvi, ikwu Beriya, site na Beriya.
They counted 53,400 men from the tribe of Asher. They were in clans descended from Imnah, Ishvi, and Beriah, and from Beriah’s two sons—Heber and Malkiel. Asher also had a daughter named Serah.
45 Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a: ikwu Heba, site na Heba, ikwu Malkiel, site na Malkiel.
46 Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.
47 Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
48 Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Jaziil, site na Jaziil, ikwu Guni, site na Guni,
They counted 45,400 men from the tribe of Naphtali. They were in clans descended from Jahzeel, Guni, Jezer, and Shillem.
49 ikwu Jeza, site na Jeza, ikwu Shilem, site na Shilem.
50 Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ.
51 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ.
The total of the Israeli men whom the leaders counted was 601,730.
52 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Then Yahweh said to Moses/me,
53 “Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.
“Divide Canaan land among the tribes. Distribute the land according the number of people in each tribe that are on your lists.
54 Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.
Decide by (casting lots/throwing stones which are marked) to determine which group will get which area, but give the largest areas to the groups with the most people.”
55 Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.
56 A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”
57 Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
The leaders also counted the male descendants of Levi. They were in clans descended from Gershon, Kohath, and Merari.
58 Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
These also included people from the clans of Libni, Hebron, Mahli, Mushi, and Korah. All of them were descendants of Levi. Kohath was the ancestor of Amram,
59 Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
whose wife was Jochebed. She also was a descendant of Levi, but she was born in Egypt. She and Amram had two sons, Aaron and Moses/me, and their/our [older] sister Miriam.
60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
Aaron’s sons were Nadab, Abihu, Eleazar, and Ithamar.
61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
But Nadab and Abihu died when they burned [incense for a sacrifice] to Yahweh in a way that disobeyed what Yahweh had commanded.
62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ. Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
The leaders counted 23,000 men from the descendants of Levi who were at least one month old. But these men were not counted when the rest of the Israeli people [were counted], because they were not given any land.
63 Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.
Those were the men whom Eleazar and Moses/I said should be counted. They counted the Israeli people on the plains where the Moab people-group lived, on the [east] side of the Jordan River, across from Jericho [city].
64 Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
None of the men whom they counted were on the lists that were made by Aaron and Moses/me when the Israelis were in the Sinai Desert,
65 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.
because Yahweh had said about them, “They will all die in this desert,” [and that is what happened]. The only ones who were still alive were Jephunneh’s son Caleb and Nun’s son Joshua.