< Ọnụọgụgụ 26 >

1 Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha,
Utatha mliri Yehova anati kwa Mose ndi Eliezara mwana wa Aaroni,
2 “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”
“Werengani Aisraeli onse mwa mabanja awo, onse a zaka makumi awiri kapena kuposera pamenepo omwe angathe kugwira ntchito ya usilikali mʼgulu lankhondo la Israeli.”
3 Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,
Kotero mu zigwa za Mowabu pafupi ndi mtsinje wa Yorodani ku Yeriko, Mose ndi wansembe Eliezara anayankhula nawo kuti,
4 “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
“Werengani amuna a zaka makumi awiri kapena kuposera pamenepo, monga momwe Yehova walamulira Mose.” Aisraeli omwe anachokera ku Igupto ndi awa:
5 Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,
Zidzukulu za Rubeni, mwana woyamba wamwamuna wa Israeli, zinali izi: kuchokera mwa Hanoki, fuko la Ahanoki; kuchokera mwa Palu, fuko la Apalu;
6 site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami
kuchokera mwa Hezironi, fuko la Ahezironi; kuchokera mwa Karimi, fuko la Akarimi.
7 Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ.
Awa anali mafuko a Rubeni: onse amene anawerengedwa analipo 43,730.
8 Nwa Palu bụ Eliab,
Mwana wa Palu anali Eliabu,
9 ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị.
ndipo ana a Eliabu anali Nemueli, Datani ndi Abiramu. Datani ndi Abiramu anali gulu la akuluakulu aja amene anawukira Mose ndi Aaroni ndipo analinso mʼgulu la otsatira Kora pamene anawukira Yehova.
10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.
Nthaka inangʼambika ndi kuwameza pamodzi ndi Kora, kotero kuti gulu lawo linafa pamene moto unapsereza anthu 250 aja, nasanduka chenjezo.
11 Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
Koma ana a Kora sanafe nawo.
12 Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ, site na Nemuel, ikwu Nemuel, site na Jamin, ikwu Jamin, site na Jakin, ikwu Jakin,
Zidzukulu za Simeoni mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Nemueli, fuko la Anemuele; kuchokera mwa Yamini, fuko la Ayamini; kuchokera mwa Yakini fuko la Ayakini;
13 Site na Zera, ikwu Zera, site na Shaul, ikwu Shaul.
kuchokera mwa Zera, mbumba ya Zera; kuchokera mwa Sauli, fuko la Asauli.
14 Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ.
Awa anali mafuko a Simeoni. Iwowa analipo amuna 22,200.
15 Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Zefọn, site na Zefọn, ikwu Hagi, site na Hagi, ikwu Shuni, site na Shuni,
Zidzukulu za Gadi mwa mafuko awo ndi izi: kuchokera mwa Zefoni, fuko la Azefoni; kuchokera mwa Hagi, fuko la Ahagi; kuchokera mwa Suni, fuko la Asuni;
16 ikwu Ozni, site na Ozni, ikwu Eri, site na Eri,
kuchokera mwa Ozini, fuko la Aozini; kuchokera mwa Eri, fuko la Aeri;
17 ikwu Arodi, site na Arodi, ikwu Areli, site na Areli,
kuchokera mwa Arodi, fuko la Aarodi; kuchokera mwa Arieli, fuko la a Areli.
18 Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise.
Awa ndiwo anali mafuko a Gadi. Onse amene anawerengedwa analipo 40,500.
19 Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.
Eri ndi Onani anali ana aamuna a Yuda, koma anafera mu Kanaani.
20 Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a: ikwu Shela, site na Shela, ikwu Perez, site na Perez, ikwu Zera, site na Zera.
Zidzukulu za Yuda monga mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Sela, fuko la Asera; kuchokera mwa Perezi, fuko la Aperezi; kuchokera mwa Zera, mbumba ya Zera.
21 Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
Zidzukulu za Perezi zinali izi: kuchokera mwa Hezironi, fuko la Ahezironi; kuchokera mwa Hamuli, fuko la Ahamuli.
22 Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise.
Awa ndiwo anali mafuko a Yuda. Amene anawerenga analipo 76,500.
23 Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua
Zidzukulu za Isakara monga mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Tola, fuko la Atola; kuchokera mwa Puwa, fuko la Apuwa;
24 ikwu Jashub, site na Jashub, ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn.
kuchokera mwa Yasubu, fuko la Ayasubu. Kuchokera mwa Simironi, fuko la Asimironi.
25 Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ.
Awa ndi amene anali a fuko la Isakara. Amene anawerengedwa analipo 64,300.
26 Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ndị Sered, site nʼikwu Sered, ndị Elọn, site nʼikwu Elọn, ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil.
Zidzukulu za Zebuloni mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Seredi, fuko la Aseredi; kuchokera mwa Eloni, fuko la Aeloni; kuchokera mwa Yahaleeli, fuko la Ayahaleeli.
27 Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise.
Awa ndiwo anali mafuko a Zebuloni. Amene anawerengedwa analipo 60,500.
28 Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
Zidzukulu za Yosefe mwa mafuko awo kupyolera mwa Manase ndi Efereimu zinali izi:
29 Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.
Zidzukulu za Manase: kuchokera mwa Makiri, fuko la Amakiri (Makiri anali abambo ake a Giliyadi); kuchokera mwa Giliyadi, fuko la Agiliyadi.
30 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead: ikwu Leza, site na Leza, ikwu Helek, site na Helek.
Izi ndizo zinali zidzukulu za Giliyadi; kuchokera mwa Iyezeri, fuko la Aiyezeri; kuchokera mwa Heleki, fuko la Aheleki;
31 Ikwu Asriel, site na Asriel. Ikwu Shekem, site na Shekem.
kuchokera mwa Asirieli, fuko la Aasirieli; kuchokera mwa Sekemu, fuko la Asekemu;
32 Ikwu Shemida, site na Shemida, ikwu Hefa, site na Hefa.
kuchokera mwa Semida, fuko la Asemida; kuchokera mwa Heferi, fuko la Aheferi.
33 (Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)
(Zelofehadi mwana wa Heferi analibe ana aamuna koma ana aakazi okha, amene mayina awo anali: Mala, Nowa, Hogila, Milika ndi Tiriza.)
34 Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa.
Awa ndiwo anali mafuko a Manase. Amene anawerengedwa analipo 52,700.
35 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: ikwu Shutela site na Shutela, ikwu Beka site na Beka, ikwu Tahan site na Tahan.
Zidzukulu za Efereimu monga mwa mafuko awo zinali izi; kuchokera mwa Sutela, fuko la Asutela; kuchokera mwa Bekeri, fuko la Abekeri; kuchokera mwa Tahani, fuko la Atahani.
36 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela: ikwu Eran site na Eran.
Zidzukulu za Sutela zinali izi: kuchokera mwa Erani, fuko la Aerani.
37 Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Josef dịka ikwu ha si dị.
Awa ndiwo anali mafuko a Efereimu. Amene anawerengedwa analipo 32,500. Zimenezi zinali zidzukulu za Yosefe monga mwa mafuko awo.
38 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị: ikwu Bela site na Bela, ikwu Ashbel site Ashbel, ikwu Ahiram site na Ahiram.
Zidzukulu za Benjamini monga mwa mabanja awo zinali izi: kuchokera mwa Bela, fuko la Abela; kuchokera mwa Asibeli, fuko la Aasibeli; kuchokera mwa Ahiramu, fuko la Ahiramu;
39 Ikwu Shufam site na Shufam, ikwu Hufam site na Hufam.
kuchokera mwa Sufamu, fuko la Asufamu; kuchokera mwa Hufamu, fuko la Ahufamu;
40 Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ, ikwu Aad site na Aad, ikwu Neeman site na Neeman.
Zidzukulu za Bela kupyolera mwa Aridi ndi Naamani zinali izi: kuchokera mwa Aridi, fuko la Aaridi; kuchokera mwa Naamani, fuko la Anaamani;
41 Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii.
Awa ndiwo anali mabanja a Benjamini. Amene nawerengedwa analipo 45,600.
42 Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Shuham, site na Shuham. Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan.
Zidzukulu za Dani mwa mabanja awo zinali izi: kuchokera mwa Suhamu fuko la Asuhamu. Izi zinali zidzukulu za Dani.
43 Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ.
Onse a fuko la Asuhamu amene anawerengedwa analipo 64,400.
44 Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Imna site na Imna, ikwu Ishvi, site na Ishvi, ikwu Beriya, site na Beriya.
Zidzukulu za Aseri monga mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Imina, fuko la Aimuna; kuchokera mwa Isivi, fuko la Ayisivi; kuchokera mwa Beriya, fuko la Aberiya;
45 Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a: ikwu Heba, site na Heba, ikwu Malkiel, site na Malkiel.
ndipo kupyolera mwa zidzukulu za Beriya: kuchokera mwa Heberi, fuko la Aheberi; kuchokera mwa Malikieli, fuko la Amalikieli;
46 Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.
(Aseri anali ndi mwana wamkazi dzina lake Sera)
47 Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
Awa ndiwo anali mafuko a Aseri. Onse amene anawerengedwa analipo 53,400.
48 Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Jaziil, site na Jaziil, ikwu Guni, site na Guni,
Zidzukulu za Nafutali mwa mafuko awo zinali izi: kuchokera mwa Yahazeeli, fuko la Ayahazeeli; kuchokera mwa Guni, fuko la Aguni;
49 ikwu Jeza, site na Jeza, ikwu Shilem, site na Shilem.
kuchokera mwa Yezeri, fuko la Ayezeri; kuchokera mwa Silemu, fuko la Asilemu.
50 Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ.
Awa ndiwo anali mafuko a Nafutali. Onse amene anawerengedwa analipo 45,400.
51 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ.
Chiwerengero chonse cha amuna mu Israeli chinalipo 601,730.
52 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Yehova anawuza Mose kuti,
53 “Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.
“Uwagawire dziko anthu awa kuti likhale cholowa chawo molingana ndi chiwerengero cha mayina awo.
54 Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.
Gulu lalikulu ulipatse cholowa chachikulu, ndipo lochepa cholowa chocheperapo. Gulu lililonse lilandire cholowa chake molingana ndi chiwerengero cha amene anawerengedwa.
55 Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.
Dzikolo uligawe pochita maere. Alandire cholowa chawocho potsata mayina a mafuko a makolo awo.
56 A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”
Cholowa chawo uchigawe pakati pa fuko lalikulu ndi lalingʼono mwa maere.”
57 Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
Alevi omwe anawerengedwa monga mwa mafuko awo ndi awa: kuchokera mwa Geresoni, fuko la Ageresoni; kuchokera mwa Kohati, fuko la Akohati; kuchokera mwa Merari, fuko la Amerari.
58 Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
Awanso anali mabanja a Alevi: banja la Alibini, banja la Ahebroni, banja la Amali, banja la Amusi, fuko la Kora banja la Akohati, (Kohati anali abambo a Amramu.
59 Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
Dzina la mkazi wa Amramu linali Yokobedi, mdzukulu wa Levi, yemwe anabadwa mwa Alevi mu Igupto. Yokobedi anaberekera Amramu Aaroni, Mose ndi Miriamu mlongo wawo.
60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
Aaroni anali abambo a Nadabu, Abihu, Eliezara ndi Itamara.
61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
Koma Nadabu ndi Abihu anafa pamene anapereka nsembe pamaso pa Yehova ndi moto wachilendo).
62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ. Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
Alevi onse aamuna a mwezi umodzi kapena kuposera pamenepa analipo 23,000. Iwowo sanawerengedwe pamodzi ndi Aisraeli ena chifukwa sanalandire cholowa pakati pawo.
63 Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.
Awa ndi amene anawerengedwa ndi Mose ndi Eliezara wansembe pamene ankawerenga Aisraeli pa zigwa za ku Mowabu mʼmbali mwa Yorodani ku Yeriko.
64 Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
Mwa anthu amenewa panalibe ndi mmodzi yemwe amene anali mʼgulu la Aisraeli omwe Mose ndi wansembe Aaroni anawawerenga mʼchipululu cha Sinai;
65 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.
Chifukwa Yehova anali atawuza Aisraeliwo kuti adzafera ndithu mʼchipululu, ndipo palibe ndi mmodzi yemwe amene anatsala kupatula Kalebe mwana wa Yefune ndi Yoswa mwana wa Nuni.

< Ọnụọgụgụ 26 >