< Ọnụọgụgụ 24 >

1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.
And when Balaam saw that it pleased the LORD to bless Israel, he went not, as at other times, to seek for enchantments, but he set his face toward the wilderness.
2 Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
And Balaam lifted up his eyes, and he saw Israel abiding in his tents according to their tribes; and the spirit of God came upon him.
3 O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
And he took up his parable, and said, Balaam the son of Beor hath said, and the man whose eyes are open hath said:
4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
He hath said, who heard the words of God, who saw the vision of the Almighty, falling into a trance, but having his eyes open:
5 “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
How goodly are thy tents, O Jacob, and thy tabernacles, O Israel!
6 “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
As the valleys are they spread forth, as gardens by the river’s side, as the trees of lign aloes which the LORD hath planted, and as cedar trees beside the waters.
7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
He shall pour the water out of his buckets, and his seed shall be in many waters, and his king shall be higher than Agag, and his kingdom shall be exalted.
8 “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
God brought him forth from Egypt; he hath as it were the strength of an unicorn: he shall eat up the nations his enemies, and shall break their bones, and pierce them through with his arrows.
9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
He crouched, he lay down as a lion, and as a great lion: who shall rouse him? Blessed is he that blesseth thee, and cursed is he that curseth thee.
10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
And Balak’s anger was kindled against Balaam, and he smote his hands together: and Balak said to Balaam, I called thee to curse my enemies, and, behold, thou hast altogether blessed them these three times.
11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
Therefore now flee thou to thy place: I thought to promote thee to great honour; but, lo, the LORD hath kept thee back from honour.
12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
And Balaam said to Balak, Did I not speak also to thy messengers whom thou sentest to me, saying,
13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
If Balak would give me his house full of silver and gold, I could not go beyond the commandment of the LORD, to do either good or bad of my own mind; but what the LORD saith, that will I speak?
14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
And now, behold, I go to my people: come therefore, I will advise thee what this people shall do to thy people in the latter days.
15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
And he took up his parable, and said, Balaam the son of Beor hath said, and the man whose eyes are open hath said:
16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
He hath said, who heard the words of God, and knew the knowledge of the most High, who saw the vision of the Almighty, falling into a trance, but having his eyes open:
17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
I shall see him, but not now: I shall behold him, but not near: there shall come a Star out of Jacob, and a Sceptre shall rise out of Israel, and shall smite the corners of Moab, and destroy all the children of Sheth.
18 A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
And Edom shall be a possession, Seir also shall be a possession for his enemies; and Israel shall do valiantly.
19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
Out of Jacob shall come he that shall have dominion, and shall destroy him that remaineth of the city.
20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
And when he looked on Amalek, he took up his parable, and said, Amalek was the first of the nations; but his latter end shall be that he shall perish for ever.
21 Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
And he looked on the Kenites, and took up his parable, and said, Strong is thy dwellingplace, and thou puttest thy nest in a rock.
22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”
Nevertheless the Kenite shall be wasted, until Asshur shall carry thee away captive.
23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?
And he took up his parable, and said, Alas, who shall live when God doeth this!
24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”
And ships shall come from the coast of Chittim, and shall afflict Asshur, and shall afflict Eber, and he also shall perish for ever.
25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.
And Balaam arose, and went and returned to his place: and Balak also went his way.

< Ọnụọgụgụ 24 >