< Ọnụọgụgụ 21 >

1 Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.
And when king Arad the Canaanite, which dwelled in the south, heard tell that Israel came by the way of the spies; then he fought against Israel, and took some of them prisoners.
2 Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”
And Israel vowed a vow to the LORD, and said, If you will indeed deliver this people into my hand, then I will utterly destroy their cities.
3 Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.
And the LORD listened to the voice of Israel, and delivered up the Canaanites; and they utterly destroyed them and their cities: and he called the name of the place Hormah.
4 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.
And they journeyed from mount Hor by the way of the Red sea, to compass the land of Edom: and the soul of the people was much discouraged because of the way.
5 Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”
And the people spoke against God, and against Moses, Why have you brought us up out of Egypt to die in the wilderness? for there is no bread, neither is there any water; and our soul loathes this light bread.
6 Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
And the LORD sent fiery serpents among the people, and they bit the people; and much people of Israel died.
7 Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.
Therefore the people came to Moses, and said, We have sinned, for we have spoken against the LORD, and against you; pray to the LORD, that he take away the serpents from us. And Moses prayed for the people.
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”
And the LORD said to Moses, Make you a fiery serpent, and set it on a pole: and it shall come to pass, that every one that is bitten, when he looks on it, shall live.
9 Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
And Moses made a serpent of brass, and put it on a pole, and it came to pass, that if a serpent had bitten any man, when he beheld the serpent of brass, he lived.
10 Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot.
And the children of Israel set forward, and pitched in Oboth.
11 Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.
And they journeyed from Oboth, and pitched at Ijeabarim, in the wilderness which is before Moab, toward the sun rise.
12 Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.
From there they removed, and pitched in the valley of Zared.
13 Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.
From there they removed, and pitched on the other side of Arnon, which is in the wilderness that comes out of the coasts of the Amorites: for Arnon is the border of Moab, between Moab and the Amorites.
14 Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
Why it is said in the book of the wars of the LORD, What he did in the Red sea, and in the brooks of Arnon,
15 na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”
And at the stream of the brooks that goes down to the dwelling of Ar, and lies on the border of Moab.
16 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”
And from there they went to Beer: that is the well whereof the LORD spoke to Moses, Gather the people together, and I will give them water.
17 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!
Then Israel sang this song, Spring up, O well; sing you to it:
18 Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.
The princes dig the well, the nobles of the people dig it, by the direction of the lawgiver, with their staves. And from the wilderness they went to Mattanah:
19 Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot.
And from Mattanah to Nahaliel: and from Nahaliel to Bamoth:
20 Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
And from Bamoth in the valley, that is in the country of Moab, to the top of Pisgah, which looks toward Jeshimon.
21 Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,
And Israel sent messengers to Sihon king of the Amorites, saying,
22 “Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”
Let me pass through your land: we will not turn into the fields, or into the vineyards; we will not drink of the waters of the well: but we will go along by the king’s high way, until we be past your borders.
23 Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.
And Sihon would not suffer Israel to pass through his border: but Sihon gathered all his people together, and went out against Israel into the wilderness: and he came to Jahaz, and fought against Israel.
24 Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.
And Israel smote him with the edge of the sword, and possessed his land from Arnon to Jabbok, even to the children of Ammon: for the border of the children of Ammon was strong.
25 Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
And Israel took all these cities: and Israel dwelled in all the cities of the Amorites, in Heshbon, and in all the villages thereof.
26 Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.
For Heshbon was the city of Sihon the king of the Amorites, who had fought against the former king of Moab, and taken all his land out of his hand, even to Arnon.
27 Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.
Why they that speak in proverbs say, Come into Heshbon, let the city of Sihon be built and prepared:
28 “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.
For there is a fire gone out of Heshbon, a flame from the city of Sihon: it has consumed Ar of Moab, and the lords of the high places of Arnon.
29 Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.
Woe to you, Moab! you are undone, O people of Chemosh: he has given his sons that escaped, and his daughters, into captivity to Sihon king of the Amorites.
30 “Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.”
We have shot at them; Heshbon is perished even to Dibon, and we have laid them waste even to Nophah, which reaches to Medeba.
31 Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait.
Thus Israel dwelled in the land of the Amorites.
32 Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
And Moses sent to spy out Jaazer, and they took the villages thereof, and drove out the Amorites that were there.
33 Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
And they turned and went up by the way of Bashan: and Og the king of Bashan went out against them, he, and all his people, to the battle at Edrei.
34 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
And the LORD said to Moses, Fear him not: for I have delivered him into your hand, and all his people, and his land; and you shall do to him as you did to Sihon king of the Amorites, which dwelled at Heshbon.
35 Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.
So they smote him, and his sons, and all his people, until there was none left him alive: and they possessed his land.

< Ọnụọgụgụ 21 >