< Ọnụọgụgụ 20 >

1 Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.
ויבאו בני ישראל כל העדה מדבר צן בחדש הראשון וישב העם בקדש ותמת שם מרים ותקבר שם
2 Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
ולא היה מים לעדה ויקהלו על משה ועל אהרן
3 Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
וירב העם עם משה ויאמרו לאמר ולו גוענו בגוע אחינו לפני יהוה
4 Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
ולמה הבאתם את קהל יהוה אל המדבר הזה למות שם אנחנו ובעירנו
5 Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
ולמה העליתנו ממצרים להביא אתנו אל המקום הרע הזה לא מקום זרע ותאנה וגפן ורמון ומים אין לשתות
6 Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
ויבא משה ואהרן מפני הקהל אל פתח אהל מועד ויפלו על פניהם וירא כבוד יהוה אליהם
7 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
וידבר יהוה אל משה לאמר
8 “Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
קח את המטה והקהל את העדה אתה ואהרן אחיך ודברתם אל הסלע לעיניהם ונתן מימיו והוצאת להם מים מן הסלע והשקית את העדה ואת בעירם
9 Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.
ויקח משה את המטה מלפני יהוה כאשר צוהו
10 Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
ויקהלו משה ואהרן את הקהל--אל פני הסלע ויאמר להם שמעו נא המרים--המן הסלע הזה נוציא לכם מים
11 Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
וירם משה את ידו ויך את הסלע במטהו--פעמים ויצאו מים רבים ותשת העדה ובעירם
12 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
ויאמר יהוה אל משה ואל אהרן יען לא האמנתם בי להקדישני לעיני בני ישראל--לכן לא תביאו את הקהל הזה אל הארץ אשר נתתי להם
13 A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
המה מי מריבה אשר רבו בני ישראל את יהוה ויקדש בם
14 Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.
וישלח משה מלאכים מקדש אל מלך אדום כה אמר אחיך ישראל אתה ידעת את כל התלאה אשר מצאתנו
15 Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.
וירדו אבתינו מצרימה ונשב במצרים ימים רבים וירעו לנו מצרים ולאבתינו
16 Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.
ונצעק אל יהוה וישמע קלנו וישלח מלאך ויצאנו ממצרים והנה אנחנו בקדש עיר קצה גבולך
17 Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”
נעברה נא בארצך לא נעבר בשדה ובכרם ולא נשתה מי באר דרך המלך נלך לא נטה ימין ושמאול עד אשר נעבר גבלך
18 Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
ויאמר אליו אדום לא תעבר בי--פן בחרב אצא לקראתך
19 Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”
ויאמרו אליו בני ישראל במסלה נעלה ואם מימיך נשתה אני ומקני ונתתי מכרם רק אין דבר ברגלי אעברה
20 Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
ויאמר לא תעבר ויצא אדום לקראתו בעם כבד וביד חזקה
21 Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
וימאן אדום נתן את ישראל עבר בגבלו ויט ישראל מעליו
22 Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
ויסעו מקדש ויבאו בני ישראל כל העדה הר ההר
23 Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
ויאמר יהוה אל משה ואל אהרן בהר ההר על גבול ארץ אדום לאמר
24 “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
יאסף אהרן אל עמיו כי לא יבא אל הארץ אשר נתתי לבני ישראל--על אשר מריתם את פי למי מריבה
25 Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
קח את אהרן ואת אלעזר בנו והעל אתם הר ההר
26 Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
והפשט את אהרן את בגדיו והלבשתם את אלעזר בנו ואהרן יאסף ומת שם
27 Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.
ויעש משה כאשר צוה יהוה ויעלו אל הר ההר לעיני כל העדה
28 Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
ויפשט משה את אהרן את בגדיו וילבש אתם את אלעזר בנו וימת אהרן שם בראש ההר וירד משה ואלעזר מן ההר
29 Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.
ויראו כל העדה כי גוע אהרן ויבכו את אהרן שלשים יום כל בית ישראל

< Ọnụọgụgụ 20 >