< Ọnụọgụgụ 2 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
Olúwa sọ fún Mose àti Aaroni pé,
2 “Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
“Kí àwọn ọmọ Israẹli pa àgọ́ wọn yí àgọ́ ìpàdé ká, kí wọ́n jẹ́ kí àgọ́ wọn jìnnà sí i díẹ̀, oníkálùkù lábẹ́ ọ̀págun pẹ̀lú àsíá ìdílé wọn.”
3 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
Ní ìlà-oòrùn, ní ìdojúkọ àtiyọ oòrùn: ni kí ìpín ti Juda pa ibùdó wọn sí lábẹ́ ọ̀págun wọn. Olórí Juda ni Nahiṣoni ọmọ Amminadabu.
4 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mẹ́tàdínlógójì ó lé ẹgbẹ̀ta.
5 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
Ẹ̀yà Isakari ni yóò pa ibùdó tẹ̀lé wọn. Olórí Isakari ni Netaneli ọmọ Suari.
6 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mẹ́tàdínlọ́gbọ̀n ó lé irinwó.
7 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
Ẹ̀yà Sebuluni ni yóò tẹ̀lé e. Olórí Sebuluni ni Eliabu ọmọ Heloni.
8 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá méjìdínlọ́gbọ̀n ó lé egbèje.
9 Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ. Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
Gbogbo àwọn tí a yàn sí ibùdó Juda, gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn àpapọ̀ iye wọn jẹ́ ẹgbàá mẹ́tàléláàdọ́rùn-ún ó lé irinwó. Àwọn ni yóò kọ́kọ́ ṣáájú.
10 Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
Ní ìhà gúúsù: ni ìpín ti Reubeni pa ibùdó sí lábẹ́ ọ̀págun wọn. Olórí Reubeni ni Elisuri ọmọ Ṣedeuri.
11 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mẹ́tàlélógún ó lé ẹ̀ẹ́dẹ́gbẹ̀ta.
12 Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
Ẹ̀yà Simeoni ni yóò pa ibùdó tẹ̀lé wọn. Olórí Simoni ni Ṣelumieli ọmọ Suriṣaddai.
13 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mọ́kàndínlọ́gbọ̀n ó lé ẹ̀ẹ́dẹ́gbéje.
14 Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
Ẹ̀yà Gadi ló tẹ̀lé wọn. Olórí Gadi ni Eliasafu ọmọ Deueli.
15 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá méjìlélógún ó lé àádọ́talélẹ́gbẹ̀jọ.
16 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
Gbogbo ènìyàn tí a yàn sí ibùdó Reubeni, gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn àpapọ̀ iye wọn jẹ́ ẹgbàá márùndínlọ́gọ́rin ó lé àádọ́talélégbèje. Àwọn ni yóò jáde sìkéjì.
17 Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
Nígbà náà ni àwọn ọmọ Lefi àti àgọ́ ìpàdé yóò tẹ̀síwájú láàrín ibùdó àwọn ènìyàn, wọn yóò tẹ̀síwájú ní ṣísẹ̀-n-tẹ̀lé gẹ́gẹ́ bí wọn ṣe pa ibùdó, olúkúlùkù láààyè rẹ̀, àti lábẹ́ ọ̀págun rẹ̀.
18 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
Ní ìhà ìlà-oòrùn: ni ìpín Efraimu yóò pa ibùdó rẹ̀ sí lábẹ́ ọ̀págun rẹ̀. Olórí Efraimu ni Eliṣama ọmọ Ammihudu.
19 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ọ̀kẹ́ méjì lé ó lẹ̀ẹ́dẹ́gbẹ̀ta.
20 Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
Ẹ̀yà Manase ni yóò tẹ̀lé wọn. Olórí Manase ni Gamalieli ọmọ Pedasuri.
21 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ.
Iye ìpín rẹ̀ ni ẹgbàá mẹ́rìndínlógún ó lé igba.
22 Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
Ẹ̀yà Benjamini ni yóò tẹ̀lé e. Olórí Benjamini ni Abidani ọmọ Gideoni.
23 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ.
Iye ìpín rẹ̀ ni ẹgbàá mẹ́tàdínlógún ó lé egbèje.
24 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ. Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
Gbogbo ènìyàn tí a yàn sí ibùdó Efraimu, gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn, àpapọ̀ iye wọn jẹ́ ẹgbàá mẹ́rìnléláàádọ́ta ó lé ọgọ́rùn-ún. Àwọn ni yóò jáde sìkẹ́ta.
25 Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
Ní ìhà àríwá: ni ìpín Dani yóò pa ibùdó sí lábẹ́ ọ̀págun wọn. Olórí Dani ni Ahieseri ọmọ Ammiṣaddai.
26 Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mọ́kànlélọ́gbọ̀n ó lé ẹ̀ẹ́dẹ́gbẹ̀rin.
27 Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
Ẹ̀yà Aṣeri ni yóò pa ibùdó tẹ̀lé wọn. Olórí Aṣeri ni Pagieli ọmọ Okanri.
28 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ọ̀kẹ́ méjì ó lé ẹ̀ẹ́dẹ́gbẹ̀jọ.
29 Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
Ẹ̀yà Naftali ni yóò kàn lẹ́yìn wọn. Olórí Naftali ni Ahira ọmọ Enani.
30 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
Iye ìpín rẹ̀ jẹ́ ẹgbàá mẹ́rìndínlógún ó lé egbèje.
31 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii. Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
Gbogbo ènìyàn tí a yàn sí ibùdó Dani jẹ́ ẹgbàá méjìdínlọ́gọ̀rin ó lé ẹgbẹ̀jọ. Àwọn ni yóò jáde kẹ́yìn lábẹ́ ọ̀págun wọn.
32 Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise nʼọnụọgụgụ.
Wọ̀nyí ni àwọn ọmọ Israẹli tí wọ́n kà nípa ìdílé wọn. Gbogbo àwọn tó wà ní ibùdó, gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn, wọ́n jẹ́ ọgbọ̀n ọ̀kẹ́ ó lé egbèjìdínlógún dín làádọ́ta.
33 Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Ṣùgbọ́n a kò ka àwọn ọmọ Lefi papọ̀ mọ́ àwọn Israẹli gẹ́gẹ́ bí Olúwa ti pa á láṣẹ fún Mose.
34 Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.
Àwọn ọmọ Israẹli ṣe gbogbo ohun tí Olúwa pàṣẹ fún Mose, báyìí ni wọ́n ṣe pa ibùdó lábẹ́ ọ̀págun wọn, bẹ́ẹ̀ náà sì ni wọ́n ṣe jáde, oníkálùkù pẹ̀lú ẹbí àti ìdílé rẹ̀.

< Ọnụọgụgụ 2 >