< Ọnụọgụgụ 19 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
Yahweh falou com Moisés e com Arão, dizendo:
2 “Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya.
“Este é o estatuto da lei que Yahweh ordenou. Diga aos filhos de Israel que lhe tragam uma novilha vermelha sem mancha, na qual não há defeito, e que nunca foi jungida.
3 Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya.
Você a entregará a Eleazar, o sacerdote, e ele a trará para fora do acampamento, e alguém a matará diante de sua face.
4 Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.
Eleazar, o sacerdote, tomará um pouco do sangue dela com o dedo, e aspergirá o sangue dela em direção à frente da Tenda da Reunião sete vezes.
5 Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ.
A novilha será queimada à sua vista; sua pele, e sua carne, e seu sangue, com seu esterco, será queimado.
6 Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.
O padre pegará madeira de cedro, hissopo e escarlate e atirá-la-á no meio da queima da novilha.
7 Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
Então o sacerdote lavará suas vestes, e banhará sua carne em água, e depois entrará no acampamento, e o sacerdote ficará imundo até a noite.
8 Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
Aquele que a queimar lavará suas vestes em água, e banhará sua carne em água, e será imundo até a noite.
9 “Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie.
“Um homem limpo recolherá as cinzas da novilha e as depositará fora do acampamento em um lugar limpo; e será guardado para a congregação das crianças de Israel para uso na água para limpeza de impurezas. É uma oferta pelo pecado.
10 Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Aquele que recolher as cinzas da novilha lavará suas roupas, e ficará imundo até a noite. Será para os filhos de Israel, e para o estrangeiro que vive como um estrangeiro entre eles, por um estatuto para sempre.
11 “Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
“Aquele que tocar o cadáver de qualquer homem será imundo por sete dias.
12 Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.
Ele se purificará com água no terceiro dia, e no sétimo dia estará limpo; mas se não se purificar no terceiro dia, então no sétimo dia não estará limpo.
13 Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.
Quem tocar um morto, o corpo de um homem que morreu, e não se purificar, profanará o tabernáculo de Javé; e essa alma será cortada de Israel; porque a água para a impureza não foi aspergida sobre ele, ele será imundo. Sua impureza ainda está sobre ele.
14 “Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
“Esta é a lei quando um homem morre em uma tenda: todos que entram na tenda, e todos que estão na tenda, devem estar imundos sete dias.
15 Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
Todo recipiente aberto, que não tem cobertura presa, é imundo.
16 “Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
“Quem no campo aberto tocar alguém que for morto com uma espada, ou um cadáver, ou um osso de um homem, ou uma sepultura, será imundo sete dias.
17 “Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute.
“Para os impuros, eles devem tomar das cinzas da queima da oferta pelo pecado; e água corrente deve ser derramada sobre eles em um recipiente.
18 Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
Uma pessoa limpa pegará o hissopo, mergulhá-lo-á na água e aspergi-lo-á sobre a tenda, sobre todos os vasos, sobre as pessoas que lá estavam e sobre aquele que tocou o osso, ou o morto, ou o morto, ou a sepultura.
19 Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha.
A pessoa limpa deve aspergir sobre o impuro no terceiro dia, e no sétimo dia. No sétimo dia, ele o purificará. Ele lavará suas roupas e se banhará em água, e será limpo à noite.
20 Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
Mas o homem que for imundo, e não se purificar, essa alma será extirpada do meio da assembléia, porque contaminou o santuário de Iavé. A água para a impureza não foi aspergida sobre ele. Ele é impuro.
21 Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
Será um estatuto perpétuo para eles. Aquele que asperge a água para a impureza lavará suas roupas, e aquele que toca a água para a impureza será imundo até a noite.
22 Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”
“O que a pessoa imunda tocar será imundo; e a alma que tocar será imunda até a noite”.

< Ọnụọgụgụ 19 >