< Ọnụọgụgụ 15 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
וידבר יהוה אל משה לאמר׃
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu,
דבר אל בני ישראל ואמרת אלהם כי תבאו אל ארץ מושבתיכם אשר אני נתן לכם׃
3 ọ bụrụ na unu echee nʼihu Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme.
ועשיתם אשה ליהוה עלה או זבח לפלא נדר או בנדבה או במעדיכם לעשות ריח ניחח ליהוה מן הבקר או מן הצאן׃
4 Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu Onyenwe anyị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa.
והקריב המקריב קרבנו ליהוה מנחה סלת עשרון בלול ברבעית ההין שמן׃
5 Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
ויין לנסך רביעית ההין תעשה על העלה או לזבח לכבש האחד׃
6 “‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita,
או לאיל תעשה מנחה סלת שני עשרנים בלולה בשמן שלשית ההין׃
7 tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
ויין לנסך שלשית ההין תקריב ריח ניחח ליהוה׃
8 “‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị,
וכי תעשה בן בקר עלה או זבח לפלא נדר או שלמים ליהוה׃
9 tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.
והקריב על בן הבקר מנחה סלת שלשה עשרנים בלול בשמן חצי ההין׃
10 Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
ויין תקריב לנסך חצי ההין אשה ריח ניחח ליהוה׃
11 Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.
ככה יעשה לשור האחד או לאיל האחד או לשה בכבשים או בעזים׃
12 Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
כמספר אשר תעשו ככה תעשו לאחד כמספרם׃
13 “‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
כל האזרח יעשה ככה את אלה להקריב אשה ריח ניחח ליהוה׃
14 Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya.
וכי יגור אתכם גר או אשר בתוככם לדרתיכם ועשה אשה ריח ניחח ליהוה כאשר תעשו כן יעשה׃
15 Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
הקהל חקה אחת לכם ולגר הגר חקת עולם לדרתיכם ככם כגר יהיה לפני יהוה׃
16 Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’”
תורה אחת ומשפט אחד יהיה לכם ולגר הגר אתכם׃
17 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
וידבר יהוה אל משה לאמר׃
18 “Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,
דבר אל בני ישראל ואמרת אלהם בבאכם אל הארץ אשר אני מביא אתכם שמה׃
19 ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
והיה באכלכם מלחם הארץ תרימו תרומה ליהוה׃
20 Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.
ראשית ערסתכם חלה תרימו תרומה כתרומת גרן כן תרימו אתה׃
21 Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
מראשית ערסתיכם תתנו ליהוה תרומה לדרתיכם׃
22 “‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
וכי תשגו ולא תעשו את כל המצות האלה אשר דבר יהוה אל משה׃
23 bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
את כל אשר צוה יהוה אליכם ביד משה מן היום אשר צוה יהוה והלאה לדרתיכם׃
24 Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
והיה אם מעיני העדה נעשתה לשגגה ועשו כל העדה פר בן בקר אחד לעלה לריח ניחח ליהוה ומנחתו ונסכו כמשפט ושעיר עזים אחד לחטת׃
25 Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
וכפר הכהן על כל עדת בני ישראל ונסלח להם כי שגגה הוא והם הביאו את קרבנם אשה ליהוה וחטאתם לפני יהוה על שגגתם׃
26 A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.
ונסלח לכל עדת בני ישראל ולגר הגר בתוכם כי לכל העם בשגגה׃
27 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie.
ואם נפש אחת תחטא בשגגה והקריבה עז בת שנתה לחטאת׃
28 Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.
וכפר הכהן על הנפש השגגת בחטאה בשגגה לפני יהוה לכפר עליו ונסלח לו׃
29 Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.
האזרח בבני ישראל ולגר הגר בתוכם תורה אחת יהיה לכם לעשה בשגגה׃
30 “‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
והנפש אשר תעשה ביד רמה מן האזרח ומן הגר את יהוה הוא מגדף ונכרתה הנפש ההוא מקרב עמה׃
31 Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’”
כי דבר יהוה בזה ואת מצותו הפר הכרת תכרת הנפש ההוא עונה בה׃
32 Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
ויהיו בני ישראל במדבר וימצאו איש מקשש עצים ביום השבת׃
33 Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
ויקריבו אתו המצאים אתו מקשש עצים אל משה ואל אהרן ואל כל העדה׃
34 Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.
ויניחו אתו במשמר כי לא פרש מה יעשה לו׃
35 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”
ויאמר יהוה אל משה מות יומת האיש רגום אתו באבנים כל העדה מחוץ למחנה׃
36 Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
ויציאו אתו כל העדה אל מחוץ למחנה וירגמו אתו באבנים וימת כאשר צוה יהוה את משה׃
37 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
ויאמר יהוה אל משה לאמר׃
38 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya.
דבר אל בני ישראל ואמרת אלהם ועשו להם ציצת על כנפי בגדיהם לדרתם ונתנו על ציצת הכנף פתיל תכלת׃
39 Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile Onyenwe anyị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu.
והיה לכם לציצת וראיתם אתו וזכרתם את כל מצות יהוה ועשיתם אתם ולא תתרו אחרי לבבכם ואחרי עיניכם אשר אתם זנים אחריהם׃
40 Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu.
למען תזכרו ועשיתם את כל מצותי והייתם קדשים לאלהיכם׃
41 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
אני יהוה אלהיכם אשר הוצאתי אתכם מארץ מצרים להיות לכם לאלהים אני יהוה אלהיכם׃

< Ọnụọgụgụ 15 >