< Ọnụọgụgụ 14 >

1 Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile.
Then everybody there cried out loud all night.
2 Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a.
All the Israelites went and complained to Moses and Aaron, telling them, “If only we'd died in Egypt, or here in this desert!
3 Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”
Why is the Lord taking us to this country only to get us killed? Our wives and children will be captured and taken away as slaves! Wouldn't we be better off going back to Egypt?”
4 Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”
They said to one another, “Let's choose a new leader us and go back to Egypt.”
5 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
Moses and Aaron fellfacedown on the ground in front of all the assembled Israelites.
6 Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.
Joshua, son of Nun, and Caleb, son of Jephunneh, were there. They had been part of the group who had gone to spy out the land. They ripped their clothes,
7 Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma.
and told the Israelites, “The country we traveled through and explored has very good land.
8 Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
If the Lord is happy with us, he will take us there and give it to us, a land that's so productive it's like flowing with milk and honey.
9 Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”
Don't rebel and fight against the Lord. You don't need to be afraid of the people living there in the country—we can take them easily! They're defenseless and the Lord is with us. Don't be frightened of them!”
10 Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile.
In reply all the people shouted out, “Stone them!” But the glory of the Lord suddenly appeared in the Tent of Meeting, right in the middle of the Israelites.
11 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.
The Lord told Moses, “How long are these people going to reject me? How long are these people going to refuse to trust in me despite all the miracles I have done right in front of them?
12 Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”
I'm going to make them sick with a disease and kill them. Then I will make you into a nation that's greater and strong than them.”
13 Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.
But Moses told the Lord, “The Egyptians will find out about it! It was by your power that you led the Israelites out from among them.
14 Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị.
They will tell the people living in this country all about it. They've already heard that you, Lord, are with us Israelites, that you, Lord, are seen face to face, that your cloud stands guard over them, and that you lead them by a pillar of cloud during day and a pillar of fire at night.
15 Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,
If you kill all these people in one go, the nations who have heard about you will say,
16 ‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’
‘The Lord killed these people in the desert because he wasn't able to take them to the country he promised to give them. He's killed them all in desert!’
17 “Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.
Now, Lord, please demonstrate the extent of your power just as you have said:
18 Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.
The Lord is slow to become angry and is full of trustworthy love, forgiving sin and rebellion. However, he will not allow the guilty to go unpunished, bringing the consequences of the parents' sin on their children, grandchildren, and great-grandchildren.
19 Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”
Please forgive the sin of these people since your trustworthy love is so great, in the same way that you have forgiven them from the time they left Egypt until now.”
20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.
“I have forgiven them as you asked,” the Lord replied.
21 Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.
“But even so, as I live and as the whole earth is filled with the Lord's glory,
22 Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,
not a single one of the those who saw my glory and the miracles I did in Egypt and in the desert—but provoked me and refused to obey me time and time again—
23 o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.
not a single one of them is ever going to see the country I promised to give their forefathers. None of those who rejected me will see it.
24 Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.
But because my servant Caleb has a totally different spirit and is fully committed to me, I will lead him to the country he visited, and his descendants will own it.
25 Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”
Since the Amalekites and Canaanites are living in the valleys, tomorrow you are to turn around and head back into the desert, taking the route towards the Red Sea.”
26 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
The Lord told Moses and Aaron,
27 “Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a.
“How much longer are these wicked people going to criticize me? I've heard what they're saying, making complaints against me.
28 Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m.
Go and tell them, ‘As I live, declares the Lord, I'll do just what I heard you say you wanted, believe me!
29 Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m.
All of you will die in this desert, everyone who was registered in the census that counted those aged twenty or over, because you made complaints against me.
30 O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.
Absolutely none of you will enter the country I promised to give you to live in, except for Caleb, son of Jephunneh, and Joshua, son of Nun.
31 Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya.
However, I will take your children—those you said would be taken away as plunder—into the country you rejected, and they will appreciate it.
32 Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a.
But you—you are all going to die in this desert.
33 Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara.
Your children will wander in the desert for forty years, suffering because of your lack of trust until all your bodies lie buried in the desert.
34 Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
Just as you explored the country for forty days, so shall your punishment for your sins be forty years, a year for every day, and you will see what happens when I oppose you.
35 Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’”
I, the Lord, have spoken! Just see if I won't do this to all these wicked Israelites who have got together to oppose me! They will end their lives in the desert—they will die there.’”
36 Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara.
The men that Moses had sent to explore the country—those who came back and because they gave a bad report they made all the Israelites complain against the Lord—
37 Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.
those men who gave the bad report died before the Lord from plague.
38 Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.
The only ones who lived were Joshua son of Nun and Caleb son of Jephunneh of those who went to explore the country.
39 Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.
When Moses told the Israelites what the Lord had said they were very, very sad.
40 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”
They got up early the next morning planning to go into the hill country. “Yes we really did sin,” they said, “but now we're here and we'll go where the Lord told us.”
41 Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.
But Moses objected. “Why are you disobeying the Lord's command? You won't succeed in your plan!
42 Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.
Don't try and go, otherwise you will be killed by your enemies, because the Lord isn't with you.
43 Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”
The Amalekites and Canaanites living there will attack you, and you will die by the sword. Because you rejected the Lord, he won't help you.”
44 Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ.
But they were arrogant and went up into the hill country, even though Moses and the Ark of the Lord's Agreement didn't move from the camp.
45 Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.
The Amalekites and Canaanites who lived there in the hill country came down and attacked the Israelites and defeated them, and chased them all the way to Hormah.

< Ọnụọgụgụ 14 >