< Ọnụọgụgụ 13 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
וידבר יהוה אל משה לאמר
2 “Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”
שלח לך אנשים ויתרו את ארץ כנען אשר אני נתן לבני ישראל איש אחד איש אחד למטה אבתיו תשלחו--כל נשיא בהם
3 Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.
וישלח אתם משה ממדבר פארן על פי יהוה כלם אנשים ראשי בני ישראל המה
4 Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,
ואלה שמותם למטה ראובן שמוע בן זכור
5 Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.
למטה שמעון שפט בן חורי
6 Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.
למטה יהודה כלב בן יפנה
7 Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.
למטה יששכר יגאל בן יוסף
8 Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem
למטה אפרים הושע בן נון
9 Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.
למטה בנימן פלטי בן רפוא
10 Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.
למטה זבולן גדיאל בן סודי
11 Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).
למטה יוסף למטה מנשה--גדי בן סוסי
12 Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.
למטה דן עמיאל בן גמלי
13 Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.
למטה אשר סתור בן מיכאל
14 Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.
למטה נפתלי נחבי בן ופסי
15 Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.
למטה גד גאואל בן מכי
16 Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
אלה שמות האנשים אשר שלח משה לתור את הארץ ויקרא משה להושע בן נון יהושע
17 Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.
וישלח אתם משה לתור את ארץ כנען ויאמר אלהם עלו זה בנגב ועליתם את ההר
18 Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.
וראיתם את הארץ מה הוא ואת העם הישב עליה--החזק הוא הרפה המעט הוא אם רב
19 Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.
ומה הארץ אשר הוא ישב בה--הטובה הוא אם רעה ומה הערים אשר הוא יושב בהנה--הבמחנים אם במבצרים
20 Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)
ומה הארץ השמנה הוא אם רזה היש בה עץ אם אין והתחזקתם ולקחתם מפרי הארץ והימים--ימי בכורי ענבים
21 Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.
ויעלו ויתרו את הארץ ממדבר צן עד רחב לבא חמת
22 Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)
ויעלו בנגב ויבא עד חברון ושם אחימן ששי ותלמי ילידי הענק וחברון שבע שנים נבנתה לפני צען מצרים
23 Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
ויבאו עד נחל אשכל ויכרתו משם זמורה ואשכול ענבים אחד וישאהו במוט בשנים ומן הרמנים ומן התאנים
24 A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.
למקום ההוא קרא נחל אשכול על אדות האשכול אשר כרתו משם בני ישראל
25 Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
וישבו מתור הארץ מקץ ארבעים יום
26 Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
וילכו ויבאו אל משה ואל אהרן ואל כל עדת בני ישראל אל מדבר פארן--קדשה וישיבו אתם דבר ואת כל העדה ויראום את פרי הארץ
27 Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
ויספרו לו ויאמרו באנו אל הארץ אשר שלחתנו וגם זבת חלב ודבש הוא--וזה פריה
28 Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
אפס כי עז העם הישב בארץ והערים בצרות גדלת מאד וגם ילדי הענק ראינו שם
29 Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”
עמלק יושב בארץ הנגב והחתי והיבוסי והאמרי יושב בהר והכנעני יושב על הים ועל יד הירדן
30 Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
ויהס כלב את העם אל משה ויאמר עלה נעלה וירשנו אתה--כי יכול נוכל לה
31 Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.”
והאנשים אשר עלו עמו אמרו לא נוכל לעלות אל העם כי חזק הוא ממנו
32 Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa
ויציאו דבת הארץ אשר תרו אתה אל בני ישראל לאמר הארץ אשר עברנו בה לתור אתה ארץ אכלת יושביה הוא וכל העם אשר ראינו בתוכה אנשי מדות
33 Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”
ושם ראינו את הנפילים בני ענק--מן הנפלים ונהי בעינינו כחגבים וכן היינו בעיניהם

< Ọnụọgụgụ 13 >