< Nehemaya 1 >
1 Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya: Nʼọnwa Kislev, nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,
Awa ndi mawu a Nehemiya mwana wa Hakaliya: Pa mwezi wa Kisilevi, chaka cha makumi awiri, pamene ndinali mu mzinda wa Susa,
2 otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani, na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.
Hanani mmodzi mwa abale anga, anabwera ndi anthu ena kuchokera ku Yuda, ndipo ine ndinawafunsa za Ayuda otsala amene sanatengedwe ukapolo, ndiponso za mzinda wa Yerusalemu.
3 Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
Anandiyankha kuti, “Amene sanatengedwe ukapolo aja ali pa mavuto aakulu ndipo ali ndi manyazi. Khoma la Yerusalemu ndilogamukagamuka ndipo zipata zake zinatenthedwa ndi moto.”
4 Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ,
Nditamva zimenezi, ndinakhala pansi ndi kuyamba kulira. Ndinalira kwa masiku angapo. Ndinkasala zakudya ndi kumapemphera pamaso pa Mulungu Wakumwamba.
5 si ya: “Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m.
Ndinkati: “Inu Yehova, Mulungu wakumwamba, Mulungu wamkulu ndi woopsa. Mumasunga pangano ndi kuonetsa chikondi chosasinthika kwa onse amene amakukondani ndi kumvera malamulo anu.
6 Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.
Tcherani khutu lanu ndi kutsekula maso anu kuti mumve pemphero la mtumiki wanune limene ndikupemphera usana ndi usiku pamaso panu kupempherera Aisraeli, atumiki anu. Ndikuvomereza machimo a Aisraeli amene tinakuchimwirani. Ndithu, ine ndi banja la makolo anga tinakuchimwirani.
7 Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.
Ife tinakuchitirani zoyipa zambiri. Sitinamvere mawu anu, malamulo ndi malangizo anu amene munapereka kwa mtumiki wanu Mose.
8 “Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.
“Kumbukirani mawu amene munawuza mtumiki wanu Mose akuti, ‘Ngati mukhala osakhulupirika, ndidzakubalalitsani pakati pa mitundu ina.
9 Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’
Koma mukabwerera kwa Ine, mukamvera malamulo anga ndi kuwatsatadi, ndiye kuti ngakhale anthu anu atabalalika kutali chotani, Ine ndidzawasonkhanitsa kuchokera kumeneko ndi kubwera nawo ku malo amene ndinasankha kuti azidzayitanira dzina langa.’
10 “Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.
“Iwo ndi atumiki anu ndi anthu anu, amene munawawombola ndi mphamvu yanu yayikulu ndi dzanja lanu lamphamvu.
11 Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.
Inu Ambuye tcherani khutu lanu kuti mumve pemphero la mtumiki wanune ndiponso pemphero la atumiki anu amene amakondwera kuchitira ulemu dzina lanu. Lolani kuti mtumiki wanune zinthu zindiyendere bwino lero ndi kuti mfumu indichitire chifundo.” Nthawi imeneyi nʼkuti ndili woperekera zakumwa kwa mfumu.