< Nehemaya 9 >

1 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi.
Ní ọjọ́ kẹrìnlélógún oṣù kan náà, àwọn ọmọ Israẹli péjọpọ̀, wọ́n gbààwẹ̀, wọ́n wọ aṣọ ọ̀fọ̀, wọ́n sì da eruku sórí ara wọn.
2 Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha.
Àwọn ọkùnrin Israẹli sì ya ara wọn sọ́tọ̀ kúrò nínú gbogbo àwọn àjèjì. Wọ́n dúró ní ààyè e wọn, wọ́n sì ń jẹ́wọ́ àwọn ẹ̀ṣẹ̀ ẹ wọn àti iṣẹ́ búburú àwọn baba wọn.
3 Ha guzokwara nʼebe ahụ ha nọ gụọ site nʼakwụkwọ iwu nke Onyenwe anyị, bụ Chineke ha ruo awa atọ. Ha jikwa awa atọ nke ọzọ kwupụta mmehie ha, na ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe.
Wọ́n dúró sí ibi tí wọ́n wà, wọ́n sì fi ìdámẹ́rin ọjọ́ kà nínú ìwé òfin Olúwa Ọlọ́run wọn, wọ́n sì tún fi ìdámẹ́rin mìíràn ní ìjẹ́wọ́ ẹ̀ṣẹ̀ àti ní sí sin Olúwa Ọlọ́run wọn.
4 Mgbe ahụ Jeshua, Bani, Kadmiel, Shebanaya, Buni, Sherebaya, Bani na Kenani rigoro guzo nʼelu ihe nguzo ndị Livayị. Ha jiri oke olu kpọkuo Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
Nígbà náà ni Jeṣua, àti Bani, Kadmieli, Ṣebaniah, Bunni, Ṣerebiah, Bani àti Kenaani gòkè dúró lórí àwọn àtẹ̀gùn àwọn ọmọ Lefi, wọ́n sì fi ohùn rara kígbe sí Olúwa Ọlọ́run wọn.
5 Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.
Nígbà náà ni àwọn ọmọ Lefi: Jeṣua, Kadmieli, Bani, Haṣbneiah, Ṣerebiah, Hodiah, Ṣebaniah àti Petahiah—wí pé, “Ẹ dìde ẹ fi ìyìn fún Olúwa Ọlọ́run yín, tí ó wà láé àti láéláé.” “Ìbùkún ni fún orúkọ rẹ tí ó ní ògo, kí ó sì di gbígbéga ju gbogbo ìbùkún àti ìyìn lọ.
6 Gị onwe gị, naanị gị bụ Onyenwe anyị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.
Ìwọ nìkan ni Olúwa. Ìwọ ni ó dá ọ̀run, àní àwọn ọ̀run tí ó ga jù pẹ̀lú gbogbo ogun wọn, ayé àti ohun gbogbo tí ń bẹ nínú rẹ̀, òkun, àti ohun gbogbo tí ń bẹ nínú rẹ̀. Ìwọ sì pa gbogbo wọn mọ́ láàyè, ogun ọ̀run sì ń sìn ọ́.
7 “Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.
“Ìwọ ni Olúwa Ọlọ́run, tí ó yan Abramu tí ó sì mú u jáde láti Uri ti Kaldea, tí ó sì sọ orúkọ rẹ̀ ní Abrahamu.
8 Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume.
Ìwọ sì rí í pé ọkàn rẹ̀ jẹ́ olóòtítọ́ sí ọ, ìwọ sì dá májẹ̀mú pẹ̀lú u rẹ̀ láti fi ilẹ̀ àwọn ará a Kenaani, Hiti, Amori, Peresi, Jebusi àti Girgaṣi fún irú àwọn ọmọ rẹ̀. Ìwọ ti pa ìpinnu rẹ̀ mọ́ nítorí tí ìwọ jẹ́ olódodo.
9 “Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
“Ìwọ rí ìpọ́njú àwọn baba ńlá wa ní Ejibiti; ìwọ gbọ́ igbe ẹkún wọn ní Òkun Pupa.
10 I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ.
Ìwọ rán iṣẹ́ àmì àti iṣẹ́ ìyanu sí Farao, sí gbogbo àwọn ìjòyè rẹ̀ àti sí gbogbo ènìyàn ilẹ̀ ẹ rẹ̀, nítorí ìwọ mọ ìwà ìgbéraga tí àwọn ará Ejibiti hù sí wọn. Ìwọ ra orúkọ fún ara à rẹ, èyí tí ó sì wà títí di òní yìí.
11 I kewara Osimiri Uhie abụọ mee ka ndị gị site nʼala akọrọ gafee. Ma i mere ka ndị iro ha na-achụ ha ọsọ nwụọ nʼime oke osimiri ahụ. Ha mikpuru dịka nkume danyere nʼime mmiri, nke oke osimiri.
Ìwọ pín òkun níwájú wọn, nítorí kí wọn lè kọjá ní ìyàngbẹ ilẹ̀, ṣùgbọ́n ìwọ sọ àwọn tí ń lépa wọn sínú ibú, bí òkúta sínú omi ńlá.
12 I ji ogidi igwe ojii duo nna nna anyị ha nʼehihie, ma were ogidi ọkụ duo ha nʼabalị, inye ha ìhè ka ha ghara ijehie ụzọ.
Ní ọ̀sán ìwọ darí i wọn pẹ̀lú ọ̀wọn àwọsánmọ̀ àti ní òru ni ìwọ darí i wọn pẹ̀lú ọ̀wọn iná láti fún wọn ní ìmọ́lẹ̀ ní ọ̀nà tí wọn yóò gbà.
13 “I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.
“Ìwọ sọ̀kalẹ̀ wá sí orí òkè Sinai; ìwọ bá wọn sọ̀rọ̀ láti ọ̀run. Ìwọ fún wọn ní ìlànà àti àwọn òfin tí ó jẹ́ òdodo tí ó sì tọ́ àti ìlànà tí ó dára.
14 I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile.
Ìwọ mú ọjọ́ ìsinmi rẹ mímọ́ di mí mọ̀ fún wọn, o sì fún wọn ní àwọn ìlànà, àwọn àṣẹ àti àwọn òfin láti ọwọ́ Mose ìránṣẹ́ rẹ.
15 I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha.
Ìwọ fún wọn ní oúnjẹ láti ọ̀run wá nígbà tí ebi ń pa wọ́n àti nígbà òǹgbẹ, o fún wọn ní omi láti inú àpáta; o sì sọ fún wọn pé, kí wọ́n lọ láti lọ gba ilẹ̀ náà tí ìwọ ti jẹ́ ẹ̀jẹ́ láti fi fún wọn nípa ìgbọ́wọ́sókè.
16 “Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha.
“Ṣùgbọ́n àwọn, baba ńlá wa, wọ́n ṣe ìgbéraga, wọ́n sì ṣe agídí, wọn kò sì tẹríba fún àwọn ìlànà rẹ.
17 Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ,
Wọ́n kọ̀ láti fetísílẹ̀, wọ́n sì kùnà láti rántí iṣẹ́ ìyanu tí ìwọ ṣe ní àárín wọn. Wọ́n ṣe agídí, nínú ìṣọ̀tẹ̀ wọn, wọ́n yan olórí láti padà sí oko ẹrú wọn. Ṣùgbọ́n ìwọ Ọlọ́run tí ó ń dáríjì, olóore-ọ̀fẹ́ àti aláàánú, ó lọ́ra láti bínú, ó sì pọ̀ ní ìfẹ́. Nítorí náà ìwọ kò sì kọ̀ wọ́n sílẹ̀,
18 ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile.
nítòótọ́ nígbà tí wọ́n ṣe ẹgbọrọ màlúù dídá, tí wọ́n sì wí pé, ‘Èyí ni Ọlọ́run rẹ tí ó mú ọ gòkè láti Ejibiti wá; tàbí nígbà tí wọ́n sọ ọ̀rọ̀-òdì tí ó burú jàì’.
19 “Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
“Nítorí àánú ńlá rẹ, ìwọ kò kọ̀ wọ́n sílẹ̀ ní aginjù. Ní ọ̀sán ọ̀wọn ìkùùkuu kò kúrò ní ọ̀dọ̀ wọn láti ṣe amọ̀nà an wọn, tàbí ọ̀wọ́n iná láti tàn sí wọn ní òru ní ọ̀nà tí wọn yóò rìn.
20 I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha.
Ìwọ fi ẹ̀mí rere rẹ fún wọn láti kọ́ wọn. Ìwọ kò dá manna rẹ dúró ní ẹnu wọn, ó sì fún wọn ní omi fún òǹgbẹ.
21 Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.
Fún ogójì ọdún ni ìwọ fi bọ́ wọn ní aginjù; wọn kò ṣe aláìní ohunkóhun, aṣọ wọn kò gbó bẹ́ẹ̀ ni ẹsẹ̀ wọn kò wú.
22 “I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.
“Ìwọ fi àwọn ìjọba àti àwọn orílẹ̀-èdè fún wọn, ó sì fi gbogbo ilẹ̀ náà fún wọ́n. Wọ́n sì gba ilẹ̀ ọba Sihoni ará a Heṣboni àti ilẹ̀ Ogu ọba Baṣani.
23 I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta.
Ìwọ ti mú àwọn ọmọ wọn pọ̀ bí ìràwọ̀ ojú ọ̀run, ó sì mú wọn wá sí ilẹ̀ tí o ti sọ fún àwọn baba wọn pé kí wọn wọ̀, kí wọn sì jogún un rẹ̀.
24 Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha.
Àwọn ọkùnrin wọn wọ inú rẹ̀, wọ́n sì gbà ilẹ̀ náà. Ìwọ sì tẹ orí àwọn ará a Kenaani, tí ń gbé inú ilẹ̀ náà ba níwájú wọn; ó fi àwọn ará a Kenaani lé wọn lọ́wọ́ pẹ̀lú àwọn ọba wọn àti àwọn ènìyàn ilẹ̀ náà kí wọn ṣe wọn bí ó ti wù wọ́n.
25 Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha.
Wọ́n gba àwọn ìlú olódi àti ilẹ̀ ọlọ́ràá; wọ́n gba àwọn ilé tí ó kún fún onírúurú gbogbo nǹkan rere, àwọn kànga tí a ti gbẹ́, àwọn ọgbà àjàrà, àwọn ọgbà olifi àti àwọn igi eléso ní ọ̀pọ̀lọpọ̀. Wọ́n jẹ, wọ́n yó, wọ́n sì sanra dáradára; wọ́n sì yọ̀ nínú oore ńlá rẹ.
26 “Ma ha nupuru isi nʼokwu gị, jụ iwu gị, gbuo ndị amụma tụrụ ha mmehie ha nʼihu, meekwa ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.
“Ṣùgbọ́n wọ́n ṣe àìgbọ́ràn, wọ́n sì ṣọ̀tẹ̀ sí ọ; wọ́n gbàgbé òfin rẹ. Wọ́n pa àwọn wòlíì rẹ, tí o fi gbà wọn ni ìyànjú pé kí wọn yí padà sí ọ; wọ́n sì se ọ̀rọ̀-òdì tí ó burú jàì.
27 Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha.
Nítorí náà, ìwọ fi wọ́n lé àwọn ọ̀tá wọn lọ́wọ́, àwọn tí ó ni wọ́n lára. Ṣùgbọ́n nígbà tí a ni wọ́n lára wọ́n kígbe sí ọ. Ìwọ gbọ́ wọn láti ọ̀run wá àti nínú ọ̀pọ̀lọpọ̀ àánú rẹ, ìwọ fún wọn ní olùgbàlà, tí ó gbà wọ́n lọ́wọ́ àwọn ọ̀tá wọn.
28 “Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha.
“Ṣùgbọ́n bí wọ́n bá ti wà nínú ìsinmi, wọn a sì túnṣe búburú lójú rẹ. Nígbà náà ni ìwọ kọ̀ wọ́n sílẹ̀ ṣọ́wọ́ àwọn ọ̀tá kí wọ́n lè jẹ ọba lórí wọn. Nígbà tí wọ́n bá sì tún kígbe sí ọ, ìwọ a gbọ́ láti ọ̀run wá, àti nínú àánú rẹ ni ìwọ gbà láti ìgbà dé ìgbà.
29 “Ị dọrọ ha aka na ntị sị ha lọghachi debe ihe i nyere nʼiwu. Ma ha sitere na nganga juru ha obi jụ idebe iwu gị. Ha mehiere megide ihe niile i nyere nʼiwu, ọ bụ ezie na ha maara na idebe ya ga-ewetara ha ndụ. Ma site nʼisiike ha, ha gbakụtara gị azụ, bụrụ ndị isiike na ndị jụrụ ige ntị.
“Ìwọ kìlọ̀ fún wọn láti padà sínú òfin rẹ, ṣùgbọ́n wọ́n hu ìwà ìgbéraga, wọ́n sì ṣe àìgbọ́ràn si àṣẹ rẹ. Wọ́n ṣẹ̀ sí ìlànà rẹ, nípa èyí tí ènìyàn yóò yè tí wọ́n bá pa wọ́n mọ́. Nínú agídí ọkàn wọ́n kọ ẹ̀yìn sí ọ, wọ́n jẹ́ olórí kunkun wọn kò sì fẹ́ gbọ́.
30 Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ.
Fún ọ̀pọ̀lọpọ̀ ọdún ni ìwọ fi ní sùúrù pẹ̀lú wọn. Nípa ẹ̀mí rẹ ni ìwọ kìlọ̀ fún wọn nípasẹ̀ àwọn wòlíì. Síbẹ̀ wọn kò fi etí sílẹ̀, nítorí náà ni ìwọ ṣe fi wọ́n lé àwọn aládùúgbò wọn lọ́wọ́.
31 Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.
Ṣùgbọ́n nínú ọ̀pọ̀ àánú rẹ, ìwọ kò mú òpin bá wọn tàbí kọ̀ wọ́n sílẹ̀, nítorí ìwọ ni Ọlọ́run olóore-ọ̀fẹ́ àti aláàánú.
32 “Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa.
“Ǹjẹ́ nítorí náà, Ọlọ́run wa, Ọlọ́run tí ó tóbi, tí ó lágbára, tí ó sì ní ẹ̀rù, ẹni tí ó pa májẹ̀mú ìfẹ́ mọ́, má ṣe jẹ́ gbogbo ìnira yìí dàbí ohun kékeré ní ojú rẹ—ìnira tí ó ti wá sórí wa, sórí àwọn ọba wa àti àwọn olórí wa, sórí àwọn àlùfáà wa àti àwọn wòlíì, sórí àwọn baba wa àti sórí gbogbo ènìyàn rẹ̀, láti àwọn ọjọ́ àwọn ọba Asiria wá títí di òní.
33 Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
Ìwọ jẹ́ olódodo nínú ohun gbogbo tí ó ti ṣẹlẹ̀ sí wa; ìwọ sì ti ṣe òtítọ́, nígbà tí a bá ṣe búburú.
34 Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.
Àwọn ọba wa, àwọn olórí wa, àwọn àlùfáà wa, àti àwọn baba wa kò tẹ̀lé òfin rẹ; wọn kò fetísílẹ̀ sí àṣẹ rẹ tàbí àwọn ìkìlọ̀ tí ìwọ fún wọn.
35 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
Àní nígbà tí wọ́n wà nínú ìjọba wọn, tí wọ́n ń gbádùn oore ńlá tí ìwọ fi fún wọn, ní ilẹ̀ tí ó tóbi tí ó sì lọ́ràá, wọn kò sìn ọ́ tàbí padà kúrò nínú àwọn ọ̀nà búburú wọn.
36 “Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta.
“Ṣùgbọ́n wò ó, àwa jẹ́ ẹrú lónìí, àwa jẹ́ ẹrú ní ilẹ̀ tí ìwọ fún àwọn baba ńlá wa, nítorí kí wọn bá máa jẹ èso rẹ̀ àti ìre mìíràn tí ó mú jáde.
37 Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya.
Nítorí àwọn ẹ̀ṣẹ̀ wa, ọ̀pọ̀lọpọ̀ ìkórè rẹ lọ sí ọ̀dọ̀ àwọn ọba tí ó fi ṣe olórí wa. Wọ́n ń ṣe àkóso lórí wa àti lórí ẹran wa bí ó ti wù wọ́n, àwa sì wà nínú ìpọ́njú ńlá.
38 “Nʼihi ihe ndị a niile, anyị na-ekwe gị nkwa ugbu a na anyị ga-efe gị. Anyị, ndịisi anyị, ndị Livayị na ndị nchụaja, na-etinye aha anyị nʼọgbụgba ndụ a.”
“Nítorí gbogbo èyí, a ń ṣe àdéhùn tí ó fẹsẹ̀múlẹ̀, a sì kọ ọ́ sínú ìwé, àwọn olórí ọmọ Lefi àwọn àlùfáà sì fi èdìdì dì í.”

< Nehemaya 9 >