< Nehemaya 9 >

1 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi.
And in the twenty-fourth day of this month the sons of Israel have been gathered with fasting, and with sackcloth, and earth on them;
2 Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha.
and the seed of Israel are separated from all sons of a stranger, and stand and confess concerning their sins, and the iniquities of their fathers,
3 Ha guzokwara nʼebe ahụ ha nọ gụọ site nʼakwụkwọ iwu nke Onyenwe anyị, bụ Chineke ha ruo awa atọ. Ha jikwa awa atọ nke ọzọ kwupụta mmehie ha, na ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe.
and rise up on their station, and read in the Scroll of the Law of their God YHWH a fourth of the day, and a fourth they are confessing and bowing themselves to their God YHWH.
4 Mgbe ahụ Jeshua, Bani, Kadmiel, Shebanaya, Buni, Sherebaya, Bani na Kenani rigoro guzo nʼelu ihe nguzo ndị Livayị. Ha jiri oke olu kpọkuo Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
And there stand up on the ascent, of the Levites, Jeshua, and Bani, Kadmiel, Shebaniah, Bunni, Sherebiah, Bani, Chenani, and they cry with a loud voice to their God YHWH.
5 Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.
And the Levites say, [even] Jeshua, and Kadmiel, Bani, Hashabniah, Sherebiah, Hodijah, Shebaniah, Pethahiah, “Rise, bless your God YHWH, From age to age, And they bless the Name of Your glory That [is] exalted above all blessing and praise.
6 Gị onwe gị, naanị gị bụ Onyenwe anyị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.
You [are] He, O YHWH, Yourself—You have made the heavens, The heavens of the heavens, and all their host, The earth and all that [are] on it, The seas and all that [are] in them, And You are keeping all of them alive, And the host of the heavens are bowing themselves to You.
7 “Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.
You [are] He, O YHWH God, Who fixed on Abraham, And brought him out from Ur of the Chaldeans, And made his name Abraham,
8 Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume.
And found his heart steadfast before You, So as to make with him the covenant, To give the land of the Canaanite, The Hittite, the Amorite, and the Perizzite, and the Jebusite, and the Girgashite, To give [it] to his seed. And You establish Your words, For You [are] righteous,
9 “Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
And see the affliction of our fathers in Egypt, And their cry have heard by the Sea of Suph,
10 I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ.
And give signs and wonders on Pharaoh, And on all his servants, And on all the people of his land, For You have known that they have acted proudly against them, And You make to Yourself a name as [at] this day.
11 I kewara Osimiri Uhie abụọ mee ka ndị gị site nʼala akọrọ gafee. Ma i mere ka ndị iro ha na-achụ ha ọsọ nwụọ nʼime oke osimiri ahụ. Ha mikpuru dịka nkume danyere nʼime mmiri, nke oke osimiri.
And You have cleaved the sea before them, And they pass over into the midst of the sea on the dry land, And their pursuers You have cast into the depths, As a stone, into the strong waters.
12 I ji ogidi igwe ojii duo nna nna anyị ha nʼehihie, ma were ogidi ọkụ duo ha nʼabalị, inye ha ìhè ka ha ghara ijehie ụzọ.
And by a pillar of cloud You have led them by day, And by a pillar of fire by night, To lighten to them the way in which they go.
13 “I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.
And on Mount Sinai You have come down, Even to speak with them from the heavens, And You give to them right judgments, And true laws, good statutes and commands.
14 I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile.
And Your holy Sabbath You have made known to them, And commands, and statutes, and law, You have commanded for them, By the hand of Your servant Moses;
15 I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha.
And bread from the heavens You have given to them for their hunger, And water from a rock have brought out to them for their thirst, And say to them to go in to possess the land That You have lifted up Your hand to give to them.
16 “Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha.
And they and our fathers have acted proudly, And harden their neck, And have not listened to Your commands,
17 Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ,
Indeed, they refuse to listen, And have not remembered Your wonders that You have done with them, And harden their neck and appoint a head, To turn back to their service, in their rebellion; And You [are] a God of pardons, Gracious, and merciful, long-suffering, and abundant in kindness, And have not forsaken them.
18 ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile.
Also, when they have made to themselves a molten calf, And say, This [is] your god That brought you up out of Egypt, And do great despisings,
19 “Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
and You, in Your abundant mercies, Have not forsaken them in the wilderness—The pillar of the cloud has not turned aside from off them by day, To lead them in the way, And the pillar of the fire by night, To give light to them and the way in which they go.
20 I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha.
And Your good Spirit You have given, To cause them to act wisely; And Your manna You have not withheld from their mouth, And water You have given to them for their thirst,
21 Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.
And forty years You have nourished them in a wilderness; They have not lacked; Their garments have not worn out, And their feet have not swelled.
22 “I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.
And You give to them kingdoms, and peoples, And apportion them to the corner, And they possess the land of Sihon, And the land of the king of Heshbon, And the land of Og king of Bashan.
23 I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta.
And You have multiplied their sons as the stars of the heavens, And bring them into the land That You have said to their fathers to go in to possess.
24 Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha.
And the sons come in, and possess the land, And You humble the inhabitants of the land—the Canaanites—before them, And give them into their hand, and their kings, And the peoples of the land, To do with them according to their pleasure.
25 Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha.
And they capture fortified cities, and fat ground, And possess houses full of all good, Dug-wells, vineyards, and olive-yards, And fruit-trees in abundance, And they eat, and are satisfied, And become fat, And delight themselves in Your great goodness.
26 “Ma ha nupuru isi nʼokwu gị, jụ iwu gị, gbuo ndị amụma tụrụ ha mmehie ha nʼihu, meekwa ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.
And they are disobedient, And rebel against You, And cast Your law behind their back, And Your prophets they have slain, Who testified against them, To bring them back to You, And they do great despisings,
27 Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha.
And You give them into the hand of their adversaries, And they distress them, And in the time of their distress they cry to You, And You, from the heavens, hear, And according to Your abundant mercies, Give saviors to them, And they save them out of the hand of their adversaries.
28 “Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha.
And when they have rest, They turn back to do evil before You, And You leave them in the hand of their enemies, And they rule over them; And they return, and call You, And You hear from the heavens, And deliver them many times, According to Your mercies,
29 “Ị dọrọ ha aka na ntị sị ha lọghachi debe ihe i nyere nʼiwu. Ma ha sitere na nganga juru ha obi jụ idebe iwu gị. Ha mehiere megide ihe niile i nyere nʼiwu, ọ bụ ezie na ha maara na idebe ya ga-ewetara ha ndụ. Ma site nʼisiike ha, ha gbakụtara gị azụ, bụrụ ndị isiike na ndị jụrụ ige ntị.
And testify against them, To bring them back to Your law; And they have acted proudly, And have not listened to Your commands, And against Your judgments have sinned—Which man does and has lived in them—And they give a stubborn shoulder, And have hardened their neck, And have not listened.
30 Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ.
And You draw over them many years, And testify against them by Your Spirit, By the hand of Your prophets, And they have not given ear, And You give them into the hand of peoples of the lands,
31 Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.
and in Your abundant mercies You have not made them a consumption, Nor have forsaken them; For a God, gracious and merciful, [are] You.
32 “Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa.
And now, O our God—God, the great, the mighty, And the fearful, Keeping the covenant and the kindness—Do not let all the travail that has found us be little before You, For our kings, for our heads, and for our priests, And for our prophets, and for our fathers, And for all Your people, From the days of the kings of Asshur to this day;
33 Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
And You [are] righteous concerning all that has come on us, For You have done truth, And we have done wickedly;
34 Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.
And our kings, our heads, Our priests, and our fathers, Have not done Your law, Nor attended to Your commands, And to Your testimonies, That You have testified against them;
35 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
And they, in their kingdom, And in Your abundant goodness, That You have given to them, And in the land, the large and the fat, That You have set before them, Have not served You, Nor turned back from their evil doings.
36 “Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta.
Behold, we—today—[are] servants, And the land that You have given to our fathers, To eat its fruit and its good, Behold, we [are] servants on it,
37 Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya.
And its increase it is multiplying to the kings Whom You have set over us In our sins; And over our bodies they are ruling, And over our livestock, According to their pleasure, And we [are] in great distress.
38 “Nʼihi ihe ndị a niile, anyị na-ekwe gị nkwa ugbu a na anyị ga-efe gị. Anyị, ndịisi anyị, ndị Livayị na ndị nchụaja, na-etinye aha anyị nʼọgbụgba ndụ a.”
And for all this we are making a steadfast covenant, And are writing, And over him who is sealed [Are] our heads, our Levites, [and] our priests.”

< Nehemaya 9 >